Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/01 p. 1
  • Alala Azụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alala Azụ!
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Imeri Ihe Isi Ike Ndị A Na-enweta n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jehova Ọ̀ Hụrụ Gị n’Anya n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • “Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ”
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 7/01 p. 1

Alala Azụ!

1 Mgbe anyị jikeere ịga mee nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, ọnụ ụzọ nke pụrụ isikarịsịrị anyị ike pụrụ ịbụ ọnụ ụzọ nke anyị. Mmetụta nke erughị eru pụrụ ịdọla anyị azụ ịpụ gaa gwa “mmadụ nile” eziokwu ahụ. (1 Tim. 2:4) Ma anyị ekwesịghị ịla azụ n’ikwusa ozi ọma ahụ. N’ihi gịnị?

2 Ọ Bụ Ozi Jehova: Jehova emewo ka a mara okwu ya site na Bible. Mgbe anyị wegaara ndị ọzọ ozi a, anyị na-ekwu ihe dị ya n’obi, ọ bụghị ihe dị anyị n’obi. (Rom 10:13-15) Mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi Alaeze ahụ, ọ bụ Jehova ka ha na-ajụ n’ezie. Ma, anyị adịghị enwe nkụda mmụọ. Anyị nwere obi ike na ozi a ga-akpali mmasị n’obi nke ndị ọ na-agụ agụụ ka e nwee mgbanwe n’ọnọdụ ndị dị n’ụwa nakwa ndị maara mkpa ime mmụọ ha.—Ezik. 9:4; Mat. 5:3, 6.

3 Jehova Na-adọta Ndị Mmadụ: Onye jụrụ ige anyị ntị n’oge gara aga pụrụ ige anyị ntị ugbu a n’ihi na ọnọdụ ya agbanwewo, obi ya adajụwokwa. Jehova pụrụ igosi onye ahụ ihu ọma ugbu a ma ‘dọta ya.’ (Jọn 6:44, 65) Mgbe nke a mere, anyị kwesịrị ịdị njikere ịbụ ndị Jehova ga-eji mee ihe ma kwenyere nduzi nke ndị mmụọ ozi n’ịchọta ndị dị otú ahụ.—Mkpu. 14:6.

4 Chineke Na-enye Anyị Mmụọ Ya: Mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ‘ikwuwa okwu n’ime Onyenwe anyị.’ (Ọrụ 14:1-3) N’icheta na anyị nwere nkwado a dị ike n’ozi anyị, anyị agaghị na-ala azụ ịgwa ndị agbata obi anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ikwu anyị, ma ọ bụ ndị gụrụ ezigbo akwụkwọ ma ọ bụ ndị bara ọgaranya, eziokwu ahụ.

5 Jisọs Kụziiri Anyị Ụzọ Isi Mee Ya: Jisọs jiri ajụjụ ndị na-akpali iche echiche, ihe atụ ndị doro anya, na ntụgharị uche dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mee ihe. Ọ kọwara eziokwu ahụ n’ụzọ dị mfe ma na-adọrọ adọrọ site n’obi ya. Ndị a ka bụ ụzọ ndị kasị mma taa. (1 Kọr. 4:17) Ọnọdụ anyị nọ na ha na-eme nkwusa pụrụ ịdịgasị iche iche, ma ozi Alaeze ahụ na-akpali akpali ka bụ otu ihe ahụ.

6 Anyị nwere ihe ùgwù nke ịbụ ndị Jehova ji na-enyere ndị mmadụ aka n’ụzọ pụrụ iche nakwa n’ụzọ dị oké mkpa. Ka anyị ghara ịla azụ! Ka anyị nwee obi ike ma kwe ka Jehova “megheere anyị ọnụ ụzọ ikwusa” ozi ọma ahụ ka anyị wee nwee ike ịgwa ya ndị ọzọ.—Kọl. 4:2-4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya