Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/01 p. 8
  • Ị̀ Chọrọ Imekwu Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Chọrọ Imekwu Ihe?
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Isi Mụbaa Ozi Gị
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ihe Mgbaru Ọsọ Magburu Onwe Ya Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 8/01 p. 8

Ị̀ Chọrọ Imekwu Ihe?

1 Jisọs ji Alaeze ahụ tụnyere akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. (Mat. 13:44-46) Ọrụ izisa ozi Alaeze ahụ bụkwa akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ozi a kwesịrị iwere ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị, ọ bụrụgodị na ikere òkè zuru ezu na ya agụnye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịnapụ onwe onye ihe. (Mat. 6:19-21) Ị̀ chọrọ imekwu ihe n’ozi Alaeze?

2 Tụlee Ihe Ndị A Dị Oké Mkpa: Ihe ụfọdụ dị mkpa iji mụbaa òkè anyị na-ekere n’ozi ahụ: (1) ikpebisi ike itinye ihe ndị metụtara Alaeze n’ọnọdụ mbụ ná ndụ (Mat. 6:33); (2) inwe okwukwe na ịdabere n’ebe Jehova nọ (2 Kọr. 4:1, 7); (3) ịchọ enyemaka Chineke site n’ekpere e ji ezi obi na nnọgidesi ike na-ekpe (Luk 11:8-10); (4) ịnọgidesi ike ma na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere anyị.—Jes. 2:14, 17.

3 Ụzọ Dị Iche Iche Isi Mụbaa Ozi Anyị: Anyị nile pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi nke ịdị na-etinyechi oge anya n’ozi kwa ọnwa. Ma ị̀ tụlewokwa iji ohere ọ bụla dapụtaranụ gbaa àmà mberede, na-agbalị ime ka ụzọ i si eche ihe n’ihu mmadụ ka mma, na-amụba ịdị irè nke nletaghachi gị, na-agbalịkwa iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi ndị na-aga n’ihu? Ì nwere ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile ma ọ bụ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke e mere baptism, ị̀ pụrụ ime mgbalị iji ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye? (1 Tim. 3:1, 10) Ị̀ pụrụ ịmụba ozi gị site n’itinye akwụkwọ maka ije ozi Betel ma ọ bụ Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi?—Luk 10:2.

4 A gbara otu nwanna nwoke na-arụ ọrụ oge nile ma na-etinyekwa oge dị ukwuu n’egwuregwu ume ka ọ bụrụ ọsụ ụzọ oge nile. Ọ malitere ịsụ ụzọ inyeaka ma hazigharịa ọnọdụ ya iji banye n’ozi oge nile. O mesịrị jee Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, bụ́ nke nyere aka kwadebe ya maka ọrụ ya ugbu a dị ka onye nlekọta sekit. O nwere nnọọ obi ụtọ na ọ nakweere agbamume ahụ e nyere ya, o jikwa n’aka na o nwere obi ụtọ ka ukwuu n’ihi mkpebi o mere imekwu ihe n’ozi Alaeze ahụ.

5 Jehova na-agọzi ndị na-ewepụta onwe ha. (Aịsa. 6:8) Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịmụba ozi gị na inweta ọbụna afọ ojuju na ume ọhụrụ ka ukwuu n’ihi ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya