Gịnị Bụ Ebumnobi E Ji Na-eme Ya?
1 Gịnị mere anyị na-eji eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi? Ọ̀ bụ nanị iji nye ihe ọmụma, ime ka ndụ ndị mmadụ ka mma, ma ọ̀ bụ iji mee ka ha nwee olileanya maka ọdịnihu? Ee e. Ebumnobi anyị bụ́ isi bụ ime ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst! (Mat. 28:19; Ọrụ 14:21) Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ndị anyị na-amụrụ ihe soro ọgbakọ na-akpakọrịta. E jikọtara kpọmkwem ọganihu ime mmụọ ha na nghọta ha nwere banyere nzukọ ndị Kraịst.
2 Ụzọ Isi Mezuo Ya: Site ná mmalite, nọgide na-agba onye ị na-amụrụ ihe ume ịbịa nzukọ ọgbakọ dị iche iche. (Hib. 10:24, 25) Kọwaara ya otú ha ga-esi wusie okwukwe ya ike, nyere ya aka n’ime uche Chineke, ma mee ka ya na ndị ọzọ bụ́ ndị chọkwara inye Jehova otuto na-enwe ezi mkpakọrịta. (Ọma 27:13; 32:8; 35:18) Okwu ịhụnanya na ekele ndị gị onwe gị na-ekwu maka ọgbakọ na nzukọ dị iche iche ga-akpali ya ịchọ ịbịa.
3 Ọ dị ndị ọhụrụ mkpa ịghọta na nzukọ Jehova bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Gosi ha vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind The Name na Our Whole Association of Brothers. Nyere ha aka ịghọta na Jehova ji ọtụtụ nde ndị mmadụ raara onwe ha nye gbaa ụwa gburugburu na-emezu nzube ya. Mee ka ndị ọhụrụ ndị a mara na a na-akpọ ha òkù ịbịakwa jeere Chineke ozi.—Aịsa. 2:2, 3.
4 Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ dị ukwuu ịhụ ka onye a na-amụrụ Bible ghọrọ ezi onye na-eso ụzọ Jisọs. Nke ahụ bụ ebumnobi anyị!—3 Jọn 4.