Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/01 p. 1
  • “Olee Ebe M Pụrụ Isi Nweta Oge?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Olee Ebe M Pụrụ Isi Nweta Oge?”
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịzụchapụta Oge Maka Ọgụgụ Ihe na Ọmụmụ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ị̀ Na-erizi Ihe n’Ụzọ Ime Mmụọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ụzọ E Si Azụchapụta Oge
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Mee Ka Ndụ Gị Hiwe Isi n’Ozi Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 11/01 p. 1

“Olee Ebe M Pụrụ Isi Nweta Oge?”

1 Nke ahụ bụ mkpesa ọtụtụ n’ime anyị na-eme, n’ihi na ndụ anyị jupụtara n’ihe omume. E kwuwo na oge bụ ihe kasị mkpa nakwa nke kasị agabiga agabiga n’ime ihe ndị anyị nwere. Ya mere, olee ebe anyị pụrụ isi nweta oge maka ihe ndị dị mkpa n’ezie, dị ka ịgụ na ịmụ Okwu Chineke?—Fil. 1:10.

2 Ihe bụ́ isi abụghị inwetakwu oge, kama ọ bụ ikpebi ihe ndị anyị chọrọ iji oge anyị nwere mee. Anyị nile nwere awa 168 n’izu, ndị a pụrụ iji ihe dị ka 100 n’ime ha hie ụra ma rụọ ọrụ. Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi jiri awa ndị fọrọ afọ mee ihe n’ụzọ ga-akasị baa uru? Ndị Efesọs 5:15-17 na-atụ aro ka anyị na-ejegharị ‘ọ bụghị dị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe anyị oge a nile, na-aghọta ihe bụ́ ihe Onyenwe anyị na-achọ.’ Nke a na-egosi mkpa ọ dị iji ohere nile mee ihe ndị Jehova sịrị dị oké mkpa.

3 Jisọs ji oge anyị tụnyere nke Noa. (Luk 17:26, 27) Ndị mmadụ n’oge ahụ mikpuru onwe ha n’ihe omume ndị a na-eme kwa ụbọchị. Otú ọ dị, Noa nwetara oge iwu akatamkpo ụgbọ nakwa ikwusa ozi ọma. (Hib. 11:7; 2 Pita 2:5) N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ibute uche Chineke ụzọ na irubere ya isi site n’ime “otú a.”—Jen. 6:22.

4 Olee Ihe Ndị Kwesịrị Ibute Ụzọ? Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) Kwa izu, anyị na-enweta “òkè nri [ime mmụọ] n’oge ya.” (Luk 12:42) Nke a chọrọ usoro ọgụgụ ihe na ọmụmụ ihe onwe onye chiri anya iji mee ka anyị ghọtazuo ya ma ọ bụrụ na anyị ga-erite uru n’ezie. N’ihi ekele anyị nwere maka nri ime mmụọ, anyị adịghị ele ya anya dị ka nri ome ngwa ngwa, bụ́ nke a ga-eji ọkụ ọkụ gụọ dị ka mmadụ pụrụ isi rie nri nkịtị ngwa ngwa. Kama nke ahụ, ekele kwesịrị ekwesị na-akpali anyị iwepụta oge iji mụọ ma nụ ụtọ ihe ime mmụọ.

5 Iri nri ime mmụọ pụrụ iduga ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) O kwesịrị ibute ụzọ n’usoro ihe omume anyị kwa ụbọchị. Ànyị pụrụ inweta oge maka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị nakwa ịkwadebe maka nzukọ ndị Kraịst? Ee, anyị pụrụ. Mgbe ahụ, anyị ga-enweta “ụgwọ ọrụ hiri nne” nke na-esite n’ịmara na ime uche Chineke.—Ọma 19:7-11, NW.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya