Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/01 p. 3-4
  • Zụlite Ikike Nghọta Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Zụlite Ikike Nghọta Gị
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Ndị Ntorobịa—Zụọnụ Ike Nghọta Unu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ị̀ Pụrụ “Ịmata Ọdịiche Dị N’ihe Ziri Ezi Na Ihe Ọjọọ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Na-azụ Ikike Nghọta Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 12/01 p. 3-4

Zụlite Ikike Nghọta Gị

1 Mgbe ikpeazụ a dị egwu, nke anyị chọtara onwe anyị na ya ugbu a, ewetaworo ndị Chineke n’ebe nile nrụgide ka ukwuu na ọnwụnwa dịgasị iche iche siri ike. (2 Tim. 3:1-5) Anyị nile chọrọ agbamume iji kwụsie ike n’okwukwe. (1 Kọr. 16:13) Anyị pụrụ ime otú ahụ site n’enyemaka Jehova ka anyị na-anọgide na-eji Okwu ya enyeju onwe anyị afọ mgbe nile, na-adabere ná mmụọ ya, ma na-anọgidesi ike ná nzukọ ya.—Ọma 37:28; Rom 8:38, 39; Mkpu. 2:10.

2 E nwere ezi ihe mere e ji kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Bụrụnụ Ndị Tozuru Etozu n’Ikike Ịghọta Ihe” n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche gara aga. Ọ dabeere ná 1 Ndị Kọrint 14:20 (NW), bụ́ ebe anyị na-agụ okwu Pọl onyeozi bụ́: “Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị n’ikike ịghọta ihe, kama bụrụnụ ụmụ ọhụrụ n’ebe ihe ọjọọ dị; ma bụrụnụ ndị tojuru etoju n’ikike ịghọta ihe.” Gịnị ka i chere banyere usoro ihe omume ahụ?

3 “Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume!” “Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe dị anyị mkpa!” Nzaghachi ndị ahụ bụ nanị abụọ n’ime ndị e nwetara. Ọbụna otu onye na-abụghị Onyeàmà nke bịara ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ịhụ mgbe a ga-eme nwa ya nwanyị dị afọ 12 baptism kwuru na usoro ihe omume ahụ kpaliri mmasị ya nakwa na ya ahụwo otú ọ ga-esi baara ezinụlọ ya uru. Ì nwere mmetụta dị otú ahụ? Ka anyị chetaghachi ụfọdụ n’ime ihe ndị pụtara ìhè n’usoro ihe omume ahụ.

4 Ezi Ihe Ọmụma Dị Mkpa Iji Zụlite Ikike Nghọta: N’okwu mmeghe, bụ́ “Zụlite Ikike Nghọta Gị Ugbu A,” gịnị ka ọkà okwu mere ka ọ pụta ìhè na ọ dị mkpa iji chee ihe ịma aka ndị a na-enwe taa ihu? Ọ dị anyị mkpa inwe ihe karịrị ọgụgụ isi. Anyị aghaghị ịzụlite na ime ka ikike anyị nwere ịghọta Bible bukwuo ibu, ka anyị wee ghara ịdaba n’ihe ọjọọ nile anyị na-ahụ. Nghọta a chọrọ inwe nduzi Chineke. Dị ka ọbụ abụ ahụ, anyị aghaghị iji ekpere gwa Jehova ka o mee ka anyị ghọta iwu na ihe ncheta ya ka anyị wee nwee ike iji obi anyị dum na-ejere ya ozi.—Ọma 119:1, 2, 34.

5 N’ihe omume na-esochi, onye nlekọta sekit gosiri na Jehova, site n’Okwu na nzukọ ya, na-enye anyị “Ihe Ndị Na-enye Aka Eme Ka A Ghọọ Onye Tozuru Etozu ná Nghọta Bible.” A kọwara nghọta dị ka “ikike nke ileba anya n’okwu ma ghọta ihe ndị mejupụtara ya site n’ịghọta njikọ ndị e nwere n’akụkụ ya nile na okwu ahụ n’ozuzu ya, si otú a na-aghọta ya nke ọma.” Ònye pụrụ inyere anyị aka ịzụlite ikike a? Jehova enyewo anyị onyinye n’ụdị mmadụ inyere anyị aka inwe ọganihu ime mmụọ. (Efe. 4:11, 12) Nzukọ elu ala ya na-agba anyị ume ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na ịgachi nzukọ nile nke ọgbakọ anya. (Ọma 1:2) A na-akụziri anyị otú e si eji Bible na mbipụta ndị Kraịst eme ihe n’ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ, nakwa n’ịkwadebe maka nzukọ na ozi ubi. Ị̀ nọwo na-eji ndokwa nile a eme ihe n’ụzọ bara uru? Ị̀ na-anọgide na-enwe usoro ọgụgụ Bible onwe onye mgbe nile? Nke a dị oké mkpa ma ọ bụrụ na a ga-echebe anyị pụọ n’ịdaba n’ọnyà nke omume, ihe ndị na-ewu ewu, nkà ihe ọmụma, na mmetụta ndị na-eduhie eduhie nke ụwa.—Kọl. 2:6-8.

6 A Ghaghị Ịzụ Ikike Nghọta Anyị: N’okwu mbụ ya, nke isiokwu ya bụ “Chebe Ọnọdụ Ime Mmụọ Site n’Ịzụ Ikike Nghọta Gị,” ọkà okwu si esi bịa kọwara na ụwa apụghị ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. (Aịsa. 5:20, 21) Nke ahụ bụ n’ihi ọjụjụ ha jụrụ ịghọta na ịgbaso ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. N’ụzọ megidere nke ahụ, anyị, bụ́ ndị nwetaworo ọzụzụ ime mmụọ ná nzukọ Jehova na-aghọta ụkpụrụ Chineke, bụ́ nke na-eduzi ihe omume na akparamàgwà anyị. N’ihi ya, anyị nọ n’ọnọdụ nke ịnwapụtara onwe anyị ihe bụ́ ezi ihe na ihe a na-anakwere n’anya Jehova, nke kwekọkwara n’uche ya zuru okè.—Rom 12:2.

7 Iji zere echiche dị mgbagwoju anya nke ụwa na ajọ mkpụrụ ọ na-amịpụta, anyị aghaghị ịnọgide na-azụ ikike nghọta anyị. Olee otú e si emezu nke a? Dị ka e dekọrọ ná Ndị Hibru 5:12-14, Pọl onyeozi mesiri ike mkpa ọ dị iji ihe karịrị nanị ‘mmiri ara’ nke okwu ahụ na-azụ onwe anyị. Nri ime mmụọ siri ike dị anyị mkpa, dị ka nke anyị na-enweta n’ọmụmụ nke amụma Aịsaịa n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Mgbe ahụ, anyị aghaghị ịdị njikere itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ ná ndụ anyị. Mgbe anyị mere nke a, anyị na-ekwenye na ụkpụrụ Jehova ziri ezi. Nke ahụ na-azụ ikike nghọta anyị iji mata n’ụzọ doro anya ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.

8 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ asụwo ngọngọ n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi gịnị? Ha etinyeghị uche ha n’ihe dị mma ma zie ezie n’anya Jehova. N’ihi ya, ha abụwo ndị nnọkọ nkwurịta okwu redio na telivishọn, bụ́ ndị ihe ndị a na-ekwu na ha bụ ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru na ha dị njọ, ndị egwú na-emerụ emerụ, ma ọ bụ mmetụta ọjọọ ndị dị n’ebe mkparịta ụka na kọmputa, nwetaworo. Site n’ime ihe n’ụzọ amamihe, anyị ga-ezere ịbụ ndị ndị ọjọọ rụrụ arụ ma dị nzuzu, duhiere.—Ilu 13:20; Gal. 5:7; 1 Tim. 6:20, 21.

9 Ndị Ntorobịa Aghaghị Ịbụ “Ụmụ Ọhụrụ n’Ebe Ihe Ọjọọ Dị”: Usoro ihe omume ahụ nwere akụkụ abụọ gbara ndị na-eto eto ume kpọmkwem ịzụlite ikike nghọta ha. Ndị ọkà okwu ahụ gosiri na ịbụ “ụmụ ọhụrụ n’ebe ihe ọjọọ dị” pụtara ịnọgide n’enweghị ahụmahụ, ya bụ, ịbụ ndị aka ha dị ọcha dị ka ụmụ ọhụrụ n’ihe banyere ihe ndị na-adịghị ọcha n’anya Jehova. (1 Kọr. 14:20) A gbara anyị nile ume ilezi anya nke ọma otú anyị si eji oge anyị eme ihe, ka anyị wee nwee ike iguzogide ịbụ ndị e kpughepụrụ nye ụdị nile nke ihe ọjọọ ma zere ịbụ ndị o metụtara. (Efe. 5:15-17) A gbara anyị ume ịgụkọ oge anyị na-etinye n’ịgụ akwụkwọ na-adịghị atụnye ụtụ kpọmkwem n’uto anyị n’ịghọta ihe ime mmụọ. Ì mere nke ahụ? Gịnị ka ị chọpụtara? Tinyere ịgụ Bible kwa ụbọchị, kpebisie ike ịgụzu akwụkwọ ndị nzukọ a na-ewepụta. Ime nke a ga-enyere anyị nile aka, gụnyere ndị na-eto eto, ‘inweta nghọta.’—Ilu 4:7-9.

10 “Rite Uru Site n’Iji Nghọta Na-etinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ”: Nke ahụ bụ isiokwu nke okwu mmechi nke usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ahụ. Ọkà okwu ahụ si esi bịa kọwara na Jehova bụ Isi Iyi nke nghọta na-enye ndụ, bụ́ nke karịrị nnọọ nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Chetụdị banyere inwe ohere nke isite ná nghọta Jehova nwetatụ nghọta! Ọ na-enye ya ndị ji obi eziokwu na-achọ ya ma jiri okwukwe na-arịọ maka ya. (Ilu 2:3-5, 9; 28:5) Ị̀ na-erite uru zuru ezu site ihe a o nyere?

11 A gbara anyị ume ịmụta otú e si amata ụkpụrụ dị iche iche ka anyị na-agụ Bible. (2 Tim. 3:16, 17) Jiri nlezianya nyochaa ha iji nweta ezi nghọta banyere ihe Jehova na-ekwu. Wepụta oge iji tụgharịa uche n’ụkpụrụ ndị a ma tinye ha n’uche na n’obi gị. Nke a ga-azụ ikike nghọta gị ka i wee nwee ike inwe ihe ịga nke ọma mgbe ị na-eme mkpebi ndị a na-eme ná ndụ. (Josh. 1:8) Ka anyị tụlee ọnọdụ ole na ole ọtụtụ ndị mmadụ na-eche ihu ma hụ otú itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụrụ isi nyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma.

12 ‘M̀ Kwesịrị Ịnakwere Ụdị Uwe na Ejiji Ụfọdụ?’ Otú uwe na ejiji si ewu ewu n’ụwa na-egosipụtakarị mmụọ nke nnupụisi. Mmụọ dị otú ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-eji ejiji n’ụzọ dị nkịrịka nakwa n’ụzọ na-adịghị mma n’anya ma ọ bụ iji kpalie agụụ mmekọahụ. Olee ụkpụrụ Bible ndị dị mkpa ga-enyere anyị aka iguzogide àgwà ndị dị otú ahụ? N’ịbụ ndị zụworo ikike nghọta anyị, anyị ga-echebara ụkpụrụ dị na 1 Timoti 2:9, 10, (NW) echiche, bụ́ nke na-ekwu ka a na-eji ejiji “n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè . . . , n’ụzọ kwesịrị . . . ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.” Ụkpụrụ ndị ọzọ a ga-agbaso gụnyere ndị ahụ e kwuru okwu banyere ha ná 2 Ndị Kọrint 6:3 nakwa ná Ndị Kọlọsi 3:18, 20.

13 ‘Gịnị Ka M Pụrụ Ime Iji Mee Ka Nkekọ Ezinụlọ M Nọgide Na-esi Ike?’ Ezi nkwurịta okwu n’etiti ndị òtù ezinụlọ dị oké mkpa. Jemes 1:19 na-agwa anyị, sị: “Ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” Ọ dị mkpa ka ndị òtù ezinụlọ na-ekwunyere ibe ha okwu ma na-ege ibe ha ntị n’ihi na nkwurịta okwu ezinụlọ bụ aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri. Ọbụna mgbe ihe anyị na-ekwu ziri ezi, ọ bụrụ na e kwuo ya n’ụzọ obi ọjọọ, n’ụzọ nganga, ma ọ bụ n’ụzọ echebaraghị ndị ọzọ echiche, o yikarịrị ka ọ̀ ga-emebikwu ihe kama imezi emezi. N’ihi ya ma ànyị bụ di ma ọ bụ nwunye, nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ nwa, okwu ọnụ anyị kwesịrị ‘ịdị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.’—Kọl. 4:6.

14 ‘Àmalitewala M Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya?’ Ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ nrụgide nke ụwa nke na-eme ka ndụ mmadụ dị mgbagwoju anya. Ọ dịghị enye aka n’ime ka e nweta obi ụtọ. (Ekli. 5:10; Luk 12:15; 1 Tim. 6:9, 10) Iji nyere anyị aka izere ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, Jisọs kụziiri anyị ụkpụrụ a dị mkpa: na-ele anya n’otu ebe. Ibi ndụ guzoziri eguzozi, nke na-adịchaghị mgbagwoju anya gụnyere ilekwasị anya n’ihe ndị metụtara Alaeze, na-edebe ihe ọ bụla ọzọ n’ọnọdụ nke abụọ.—Mat. 6:22, 23, 33.

15 Ihe Ebumnobi Anyị Kwesịrị Ịbụ: Okwu Chineke bụ ebe a pụrụ ịdabere na ya e si enweta ụkpụrụ ezi omume ga-eduzi anyị ime mkpebi. Ọ dị anyị mkpa ịmụta ụkpụrụ ndị a, ịtụgharị uche na ha, na ịghọta otú anyị ga-esi tinye ha n’ọrụ ná ndụ anyị. Site n’isi otú a ‘na-azụ ikike nghọta anyị iji mata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ,’ anyị ga-erite uru n’onwe anyị ma wetara Jehova nsọpụrụ.—Hib. 5:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya