Igbe Ajụjụ
◼ Ụkpụrụ dị aṅaa banyere uwe na ejiji ka anyị kwesịrị ịgbaso mgbe anyị na-eleta ebe obibi Betel na ihe owuwu alaka?
Mgbe anyị gara Betel, ma ọ bụ iji gagharịa ma ọ bụ ịga leta ndị òtù ezinụlọ Betel, “uwe, na ejiji na omume anyị kwesịrị ịdị ka ihe a tụrụ anya ya n’aka anyị mgbe anyị na-eje nzukọ maka ofufe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” (om-IB 131) Otú ọ dị, a chọpụtawo na mgbe ha na-eleta ihe owuwu alaka dị iche iche, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ụfọdụ yiri ka ha adịghị elezi anya ma ọlị banyere ejiji ha. Nke ahụ ekwesịghị ekwesị mgbe anyị na-eleta ihe owuwu ndị a. Ọdịdị anyị kwesịrị isetịpụ ezi ihe nlereanya, bụrụ nke a haziri nke ọma ma kwesị ekwesị, na-egosipụta ikwesị ekwesị na ùgwù nke kwesịrị ndị ohu Jehova Chineke.—1 Tim. 2:9, 10.
Nke a dị mkpa karịsịa mgbe a na-eleta ebe obibi Betel na ihe owuwu alaka ndị ọzọ n’ihi na ha na-adọta mmasị nke ndị na-abụghị Ndịàmà bụ́ ndị na-ahụ ihe na-emenụ. Ndị dị otú ahụ na-ekiri ihe na-emenụ pụrụ ime mkpebi ha banyere ndị Chineke na nzukọ ya dabere n’ihe ndị ha na-ahụ. Ọ ga-adị mma isoro ndị a na-amụrụ Bible na ndị ọzọ, bụ́ ndị pụrụ ime nleta kwurịta okwu iji chetara ha mkpa ọ dị ichebara uwe na ejiji kwesịrị ekwesị echiche. Ndị ezinụlọ Betel ga-enwe obi ekele ma ọ bụrụ na i mee otú a.
Dị ka ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst, anyị aghaghị ịkpachara anya ka ọdịdị anyị ghara ịbụ ihe ga-eme ka a sụọ ngọngọ. (2 Kọr. 6:3, 4) Kama nke ahụ, site n’ejiji anyị kwesịrị ekwesị, ka anyị ‘na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile,’ mgbe nile.— Taị. 2:10.