Bụrụnụ Ndị E Jikọrọ Ọnụ n’Otu
1 Ugboro ole ka i nwetụworo ihe ijuanya banyere ụzọ magburu onwe ya e si mee ahụ́ mmadụ? (Ọma 139:14) Akụkụ ahụ́ nke ọ bụla na-eso ibe ya arụkọ ọrụ. Okwu Chineke ji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere ahụ́ nke na-arụkọ ọrụ nke ọma. N’okpuru Kraịst, bụ́ Isi ha, ndị nile nọ n’ọgbakọ bụ ndị ‘e jikọrọ ọnụ n’otu na ndị e mere ka ha kwenyekọọ site na nkwonkwo ọ bụla nke na-enye ihe dị mkpa.’ (Efe. 4:16a) N’ihi ya, Jehova pụrụ iji ndị ya dị n’otu rụzuo ihe ndị dị ebube.
2 Ndị òtù nke ọgbakọ nke narị afọ mbụ “ji otu obi” mee ihe n’igbo mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ́ nke ibe ha. (Ọrụ 2:44-47) Site n’enyemaka Jehova, ha ji ịdị n’otu chee mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ihu ma merie ya. (Ọrụ 4:24-31) Ha kwusara ozi Alaeze ahụ n’ebe ọ bụla ha jere, jiri ozi ọma ahụ gazuo ókèala ebe ndị a maara n’oge ahụ. (Kọl. 1:23) N’oge a, ọgbakọ Ndị Kraịst ejiriwo ịdị n’otu rụzuo otu ụdị ihe ndị ahụ ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu. Olee ihe ndị so tụnye ụtụ n’ịdị n’otu a?
3 Ndị Izi Ihe Chineke Dọtara: Gburugburu ụwa, anyị bụ ndị ofufe anyị mere ka ha dị n’otu. Olee otú nke a si kwe omume? Anyị maara ụzọ a na-ahụ anya Jehova si na-enye ‘nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Mat. 24:45) Anyị jikwa “onyinye n’ụdị mmadụ,” bụ́ ndị o nyere ịbụ ndị nkụzi n’ọgbakọ kpọrọ ihe. Ka anyị ji ịdị umeala n’obi na-anakwere ndokwa dị iche iche Jehova na-eme ịzụ anyị n’ụzọ ime mmụọ, nghọta anyị nwere banyere okwu Chineke na-ebuwanye ibu, ọ na-akpalikwa n’ime anyị ọchịchọ nke iṅomi Jizọs dị ka ndị na-eso ụzọ ya. Anyị aghaghị ịnọgide na-amụ Okwu Chineke, na-agbalịsi ike ‘inweta ịdị n’otu n’okwukwe ahụ.’ (Efe. 4:8, 11-13) Ị̀ na-atụnye ụtụ n’ịdị n’otu ime mmụọ anyị site n’ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị?
4 Ndị Mkpakọrịta Ndị Kraịst Mere Ka Ha Dị n’Otu: Ịhụnanya na-adọkọta anyị ọnụ inwe mkpakọrịta chiri anya ná nzukọ Ndị Kraịst. Ná nzukọ ndị a, anyị “na-echebakwara ibe anyị echiche.” (Hib. 10:24, 25) Nke a gụnyere ile anya gabiga ọdịdị elu ahụ́ ma mata ụmụnna anyị n’ezie, na-ele ha anya otú Jehova si ele ha anya, dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa. (Hag. 2:7, nkọwa ala ala peeji nke NW) Ka anyị na-ege ntị ná nkwupụta nke okwukwe ha, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ na-emikwu emi, a na-ewusikwa ịdị n’otu anyị ike. À maara gị dị ka onye na-agachi nzukọ ọgbakọ anya?
5 Ndị Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ n’Ozi Ubi: Iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ na-eme ka anyị dị n’otu n’ime uche Chineke. Pọl onyeozi ji ‘ndị ọrụ ibe ya maka alaeze Chineke’ kpọrọ ihe. (Kọl. 4:11) Ịkọrịta ahụmahụ na inyere ibe anyị aka mgbe anyị nọ n’ozi na-enyere anyị aka ịrụzu ọrụ Ndị Kraịst anyị na iwusi nkekọ nke ịdị n’otu anyị ike.—Kọl. 3:14.
6 Mmetụta nke Mmụọ Nsọ nke Na-eme Ka Anyị Dị n’Otu: Ka anyị ji ịdị uchu na-eme uche ya, Jehova na-enye anyị mmụọ ya. Nke a na-enyere anyị aka idozi nghọtahie dị iche iche nakwa ibikọ ọnụ n’ịdị n’otu. (Ọma 133:1) Ọ na-akwali anyị “idebe ịdị n’otu nke mmụọ nsọ n’ihe nkekọ ịdị n’otu nke udo.” (Efe. 4:3) Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịtụnye ụtụ ná nkwekọrịta nke dị n’etiti ndị Chineke site n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ n’otú anyị si emeso ibe anyị.—Gal. 5:22, 23.
7 Ijekọ ozi ọnụ n’ịdị n’otu n’okpuru ịbụisi Kraịst “na-eme ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.” (Efe. 4:16b) Ọzọkwa, ọ na-ewetara Jehova otuto, bụ́ “Chineke ahụ nke na-enye udo.”—Rom 16:20.