Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
1 Ọ bụ ezie na usoro mgbasa ozi na ndị nkụzi ụwa na-ebuli akụ̀ na ụba elu, Okwu Chineke na-agba ume ka anyị “Baa Ọgaranya n’Ezi Ọrụ.” (1 Tim. 6:18) Nke ahụ bụ isiokwu nke usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke ga-amalite na March 2003. Olee agbamume anyị ga-enweta ná mgbakọ a?
2 Onye nlekọta sekit ga-atụle ihe ọ pụtara bụ́ “Baa Ọgaranya n’Ụzọ Chineke Si Ele Ihe Anya,” ọ ga-agbakwa ụfọdụ ndị ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị na-agbalịsi ike inweta akụ̀ ime mmụọ. N’okwu mbụ ọ ga-ekwu n’ụbọchị ahụ, ọkà okwu si esi bịa ga-egosi otú ndị Chineke si na-arụ “Ezi Ọrụ n’Oge Owuwe Ihe Ubi A.” A ga-agba onye ọ bụla n’ime anyị ume iche echiche otú anyị pụrụ isi kere òkè ọbụna n’ụzọ zuru ezu karị n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ nke Chineke nyere iwu ka a rụọ, bụ́ nke a na-arụzu taa.
3 Lee obi ụtọ anyị na-enwe mgbe anyị na-ahụ ka ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-achụso akụ̀ ime mmụọ! Nke a na-ewetara Jehova otuto ma na-enyere ndị ntorobịa aka ịtọ ezi ntọala maka inweta ihe ùgwù ije ozi n’ọdịnihu. Okwu bụ́ “Ịja Ndị Ntorobịa Mma Maka Ezi Ọrụ Ha Na-arụ n’Inye Jehova Otuto” ga-eme ka ezi ọrụ Ndị Kraịst na-eto eto na-arụ n’ógbè ha pụta ìhè.
4 Gịnị bụ ihe ndị na-esi n’ịrụ ezi ọrụ apụta? Ọkà okwu si esi bịa ga-atụle nke a n’okwu ikpeazụ ya, “Nọgide Na-arụ Ezi Ọrụ Ma Nweta Ngọzi Jehova.” Ọ ga-atụle akụkụ anọ ebe anyị na-enweta ngọzi bara ụba: (1) n’otu n’otu, (2) dị ka ezinụlọ, (3) dị ka ọgbakọ, na (4) dị ka nzukọ zuru ụwa ọnụ.
5 Ndị rarawooro onwe ha nye Jehova ga-enwe ohere nke ịbụ ndị e mere baptizim. Ọ bụrụ na ị dị njikere ime nke ahụ, mee ka onyeisi oche ndị nlekọta mara ozugbo.
6 Mgbe a mara ọkwa ụbọchị unu ga-enwe mgbakọ nke unu, mee ngwa n’ime atụmatụ doro anya iji gaa. Gbalịa irute n’oge iji kere òkè n’abụ na ekpere mmeghe. Ịnọ ya na ige ntị nke ọma n’usoro ihe omume dum nke ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ahụ ga-ewusi anyị ike ịnọgide na-agbaso ụzọ nke ga-eme ka anyị bụrụ ọgaranya n’ezie n’ụzọ Chineke anyị, bụ́ Jehova si ele ihe anya.