Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/03 p. 1
  • Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-eji Obi Na-eguzosi Ike Na-ejere Jehova ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ị̀ Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị “Kwa Ụbọchị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Mere i ji Kwesị Ịrara Onwe Gị Nye Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 1/03 p. 1

Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị

1 Ma è mere gị baptizim na nso nso a ma ọ bụ ọtụtụ afọ gara aga, o yiri ka ị na-echeta ihe omume ahụ dị mkpa ná ndụ gị. Baptizim anyị abụghị njedebe, kama, mmalite nke ndụ nke ije ozi a raara nye bụ́ nke pụrụ ịdịgide ruo mgbe ebighị ebi. (1 Jọn 2:17) Gịnị ka ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị gụnyere?

2 Gbasoo Ihe Nlereanya Kraịst: Mgbe e mere ya baptizim, Jizọs “bidoro ọrụ ya,” na-akpọsa “ozi ọma banyere alaeze Chineke.” (Luk 3:23; 4:43) N’otu aka ahụ, mgbe anyị gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova site na baptizim, anyị na-aghọ ndị ozi a họpụtara ahọpụta nke ozi ọma ahụ. Ọ bụ ezie na inweta ihe onwunwe ndị dị mkpa ná ndụ pụrụ ịchọ oge na mgbalị dị ukwuu, ọrụ anyị bụ́ isi, bụ ozi Ndị Kraịst. (Mat. 6:33) Kama ịdị na-agbalịsi ike inweta akụ̀ na ụba ma ọ bụ ùgwù, ndị nile raara onwe ha nye Chineke na-achọ ‘ime ka ije ozi ha nwee ùgwù,’ dị ka Pọl onyeozi mere. (Rom 11:13) Ì ji ihe ùgwù gị nke ijere Jehova ozi kpọrọ ihe ma na-eme ike gị nile na ya?

3 Dị ka ọ dị n’ihe banyere Jizọs, anyị aghaghị “iguzogide Ekwensu.” (Jems 4:7) Setan nwara Jizọs ọnwụnwa mgbe e mesiri Ya baptizim, n’otu aka ahụ, ọ na-elekwasị anya n’ebe ndị ohu Jehova raara onwe ha nye n’oge a nọ. (Luk 4:1-13) Ebe ụwa Setan gbara anyị gburugburu, anyị aghaghị inwe ọzụzụ onwe onye, na-ajụ ihe ọ bụla nke pụrụ imerụ uche anyị ma ọ bụ metọọ obi anyị. (Ilu 4:23; Mat. 5:29, 30) A dụrụ Ndị Kraịst ọdụ na ha “apụghị ịdị na-eri na ‘tebụl Jehova’ nakwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Kọr. 10:21) Nke a chọrọ ka anyị nọrọ na nche megide ntụrụndụ na-adịghị mma, mkpakọrịta ọjọọ, na ihe ize ndụ ndị dị n’Intanet. Ọ na-achọkwa n’aka anyị ịjụ akwụkwọ ndị si n’ezi ofufe dapụ dere. Ịnọ na nche maka ụzọ ndị a nakwa ụzọ ndị ọzọ Setan ji eme ihe ga-enyere anyị aka ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị.

4 Jiri Ndokwa Dị Iche Iche nke Chineke Na-eme Ihe: Iji nyere anyị aka ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị, Jehova enyeworo anyị aka site n’Okwu ya nakwa site n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Mee ka ịgụ Bible na ikpegara Jehova ekpere bụrụ ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị. (Josh. 1:8; 1 Tesa. 5:17) Na-enweta ọṅụ ná nzukọ ọgbakọ. (Ọma 122:1) Gị na ndị na-atụ egwu Jehova ma na-edebe iwu ya na-akpakọrịta.—Ọma 119:63.

5 Site n’enyemaka Chineke, ị pụrụ ibi ndụ kwekọrọ ná nrara ị raara onwe gị nye Jehova ma nwee ọṅụ nke ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 22:26, 27; Fil. 4:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya