Kụziere Ndị Ọzọ Asụsụ ahụ Dị Ọcha
1 N’agbanyeghị na ha si n’ọtụtụ ‘mba, ebo, na asụsụ,’ Ndịàmà Jehova bụ ndị dị n’otu, òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ n’ezie. (Mkpu. 7:9) N’ime ụwa nke taa kewasịrị ekewasị, nke ahụ bụ ihe dị ịrịba ama. Olee otú nke ahụ si kwe mee? N’ihi na e nyewo anyị “egbugbere ọnụ [“asụsụ,” NW] dị ọcha.”—Zef. 3:9.
2 Mmetụta Magburu Onwe Ya: Gịnị bụ asụsụ a dị ọcha? Ọ bụ nghọta kwesịrị ekwesi nke eziokwu dị n’ime Okwu Chineke banyere Jehova na nzube ya, karịsịa eziokwu banyere Alaeze Chineke. Dị ka Jizọs buru n’amụma, e si n’aka otu ụzọ a na-ahụ anya n’ụwa, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi,” na-ekesa ya, ihe ọ na-arụpụta bụ na ụmụ mmadụ ndị “si n’asụsụ nile nke mba nile,” na-anakwere ezi ofufe.—Mat. 24:45; Zek. 8:23.
3 Ka ndị mmadụ na-amụta asụsụ ahụ dị ọcha, a na-akpali ha ime ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ Jehova. Ha na-amụta ịbụ ndị e mere ka ha “dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu uche na n’otu ụzọ iche echiche.” (1 Kọr. 1:10) Izi ihe Chineke na-emekwa ka ha na-akpa àgwà ziri ezi, ka ha na-ekwu okwu dị ọcha nke bụ́ eziokwu, karịsịa n’ihe banyere izi ndị ọzọ ozi ọma ahụ. (Taị. 2:7, 8; Hib. 13:15) Mgbanwe ndị a magburu onwe ha na-ewetara Jehova nsọpụrụ.
4 Dị ka ihe atụ, otu nwoke e ziri ozi ọma nwere ọtụtụ ajụjụ, ndị e jikwa Bible zachaa. N’ịbụ onye ihe ọ nụrụ kpaliri, ọ malitere ịmụ ihe ugboro abụọ n’izu na ịga nzukọ. Nnabata na-ekpo ọkụ a nabatara ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze tụrụ ya n’anya, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ si n’agbụrụ dị iche. N’oge na-adịghị anya, ya na nwunye ya mere mgbanwe ná ndụ ha, e meekwa ha baptizim. Kemgbe ahụ, o nyeworo ihe dị ka mmadụ 40 ndị ọzọ aka ife Jehova, nke gụnyere ọtụtụ ndị ezinụlọ ya. N’agbanyeghị na o nwere nkwarụ, ọ malitere ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ n’oge na-adịbeghị anya.
5 Izi Ndị Ọzọ Ihe: Ihe ndị na-eme n’ụwa na-eme ka ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu nyochagharịa ndụ ha nakwa ihe ha na-eche n’echiche. Dị ka Jizọs, anyị kwesiri inwe ọchịchọ inyere ha aka. Nletaghachi na ọmụmụ Bible dị irè bụ isi ihe ndị dị mkpa iji nyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha.
6 Ụzọ ime ihe nke dịworo irè n’ebe ndị ji ọrụ n’aka nọ bụ iduziri ha ọmụmụ Bible dị nkenke n’ọnụ ụzọ ha. (Km-IB 5/02 p. 1) Ị̀ nwalewo ya? Mgbe ị na-akwadebe ịga nletaghachi, họrọ otu ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke ga-ekwesị onye nwe ụlọ site n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002. A haziri ọtụtụ n’ime ụzọ iche n’ihu mmadụ ndị dị n’ime ihe ntinye a iji duga kpọmkwem n’inwe nkwurịta okwu na broshuọ Na-achọ ma ọ bụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mụgharịa ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ahụ ka i wee nwee ike isi n’okwu mmalite gafee n’ịtụle otu n’ime paragraf ndị ahụ n’ụzọ gara were were. Họrọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ ị ga-agụ ma tụlee site na paragraf ahụ, chepụtakwa ajụjụ ị ga-eji mechie. Nke ahụ ga-enye aka iduga na paragraf ị na-eme atụmatụ ịtụle ná nleta gị ọzọ.
7 Ndị Jehova na-enweta ọtụtụ ngọzi n’ihi ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha. Ka anyị jiri ịdị uchu na-enyere ndị ọzọ aka isonyere anyị ‘n’ịkpọku aha Jehova’ na ‘ife Ya n’otu ubu.’—Zef. 3:9.