Okwu Chineke Bụ Eziokwu
1. Olee ihe ọmụma dị mkpa nke dị n’ime Bible?
1 “Isi ihe nke okwu gị bụ eziokwu,” ka ọbụ abụ ahụ dere. (Ọma 119:160) Site n’Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee, Jehova na-enye azịza ndị na-eju afọ n’ajụjụ ndị kasị mkpa ná ndụ. Ọ na-enye ndị na-enwe nchegbu nkasi obi na olileanya. Ọ na-agwakwa anyị ụzọ anyị pụrụ isi bịaruo ya nso. “Ịmụ eziokwu sitere na Bible dị ka isi n’ebe gbara oké ọchịchịrị pụọ ma banye n’ọnụ ụlọ gbachapụrụ agbachapụ, na-enwu zaa, ma maa mma,” ka otu nwanyị nwere ekele kwuru. Ị̀ na-agbalịsi ike iji ohere ọ bụla dapụtaranụ soro ndị ọzọ kerịta eziokwu sitere n’Okwu Chineke?
2. Olee otú Bible si eme ka ndụ ndị mmadụ ka mma?
2 O Nwere Ikike Ịgbanwe Mmadụ Ma Na-adọrọ Mmasị Mmadụ Nile: Eziokwu Bible nwere ike nke imetụ ndị mmadụ n’obi na ịgbanwe ndụ ha. (Hib. 4:12) Otu nwanyị na-akatabeghị ahụ́ aha ya bụ Rosa etinyewo aka n’ịgba akwụna nakwa n’ịṅụ mmanya na-aba n’anya na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. “Otu ụbọchị, mgbe m nọ n’oké ịda mbà,” ka o kwuru, “otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà gwara m okwu banyere otú Bible pụrụ isi nyere anyị aka ịgwọta nsogbu anyị. M malitere ịmụ Okwu Chineke, bụ́ nke m hụtara dị ka ihe na-adọrọ mmasị. N’ime otu ọnwa enwere m ume nke ịmaliteghachi ndụ n’isi n’ụzọ dị ọcha. Ugbu a m nwere nzube ná ndụ, enwekwaghị m mkpa nke njikpọ nke ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ. Ebe m chọsikwara ike ịbụ enyi Jehova, ekpebisiri m ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. A sị na ọ bụghị ìzùzù nke Okwu Chineke, eji m n’aka na tupu ugbu a m gaara egbuworị onwe m.”—Ọma 119:92.
3. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji laa azụ n’isoro ndị ọzọ kerịta ozi Bible?
3 N’adịghị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’akwụkwọ ndị e nwere taa, Bible na-adọrọ mmasị nke ‘ndị si ná mba, ebo, ndị, na asụsụ nile pụta.’ (Mkpu. 7:9) Uche Chineke bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwubi na mmadụ agaghị anabata ozi ọma ahụ nanị n’ihi ebe o si. Kama nke ahụ, soro mmadụ nile na-ekerịta ozi Alaeze ahụ, na-eji Bible eme ihe kpọmkwem mgbe ọ bụla o kwere omume.
4. Olee otú anyị pụrụ isi jiri Bible mee ihe mgbe anyị na-agba àmà?
4 Mee Ka Akwụkwọ Nsọ Pụta Ìhè: E nwere ọtụtụ ohere iji jiri Bible mee ihe n’ozi. Mgbe ị na-enyefe magazin, gbalịa iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị n’ụzọ iche ihe n’ihu a tụrụ aro ya mee ihe. Mgbe ha ji akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa eje ozi, ụfọdụ achọpụtawo na ọ na-adị irè ịgụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ e ji nlezianya họrọ mgbe ha na-ekwu okwu mmeghe ha. Mgbe ị na-aga nletaghachi, soro onye nwe ụlọ tụlee otu akụkụ Bible ma ọ bụ karị n’oge nke ọ bụla i jere iji nyere ya aka iji nke nta nke nta na-enwetakwu ezi ihe ọmụma. Mgbe ị na-eduzi ọmụmụ Bible, mee ka nkwurịta okwu ahụ dabere n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi. Mgbe ị na-anọghị n’ozi a haziri ahazi, debe Bible gị n’ebe aka gị ga-eru ya ngwa ngwa ka i wee nwee ike iji ya mee ihe mgbe ọ bụla ohere dapụtara ịgba àmà mberede.—2 Tim. 2:15.
5. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gbalịsie ike ịdị na-eji Bible eme ihe n’ozi anyị?
5 Ka anyị nyere ndị ọzọ aka irite uru n’ike na-akpali akpali nke Okwu Chineke nke bụ́ eziokwu nwere site n’iji Bible na-eme ihe n’ohere ọ bụla kwesịrị ekwesị n’ozi anyị.—1 Tesa. 2:13.