Ịla Ezumike Nká—Ọ̀ Bụ Ọnụ Ụzọ Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ Ka Ukwuu?
1 Ọtụtụ ndị na-arụsi ọrụ ike na-atụsi anya ike maka oge mgbe ịla ezumike nká ga-eme ka ha nwere onwe ha pụọ ná ndọlị na nrụgide nile nke ọrụ ego. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ezumike nká na-eweta enweghị mmasị, ịtụ ọ̀bọ̀, na ịkachu nká. Arụghị ọrụ nwere nzube pụrụ ime ka mmadụ na-enwe nchegbu banyere onwe ya. Otu akwụkwọ akụkọ si Brazil na-akọ na ndị ọrụ gọọmenti lara ezumike nká mere mkpesa na ha na-enwe nsogbu dị iche iche malite ‘n’enweghị afọ ojuju, ahụ mgbakasị, mmetụta nke enweghị nchebe, na mmetụta nke abaghị n’ihe ruo n’ịda mbà n’obi na iche na ụwa ha agwụla.’
2 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ọtụtụ Ndị Kraịst na-ewere oge a dị ka ọnụ ụzọ na-eduga n’ịrụ ọrụ ime mmụọ ka ukwuu. Otu nwanna nwoke nke malitere ịsụ ụzọ izu abụọ ka ọ gbasịrị afọ 65 kwuru, sị: “Aghaghị m ikwu na enwetụbeghị m oge ọ bụla ná ndụ m nke jupụtara nnọọ ná ngọzi ka afọ iri gara aga nke ịsụ ụzọ.” Otu di na nwunye dere, sị: “Afọ anyị ndị kasị mma n’ezie bidoro mgbe anyị malitere ịsụ ụzọ.” Ee, nye ọtụtụ ndị, ịla ezumike nká na-enye ha ohere kasị mma iji mụbaa ozi ha na inweta ngọzi bara ụba site n’aka Jehova.
3 Iji Ọrụ n’Aka na Ịdị Na-arụpụta Ihe: Ọtụtụ ndị laworo ezumike nká ugbu a enweghị ihe ndị e ji enyere ndụ aka ndị juru ebe nile taa, mgbe ha na-etolite ha mụtakwara ịrụsi ọrụ ike malite n’oge ha dị obere. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ha enwekwaghị ume ka ndị ntorobịa, ha ka bụ ndị ọrụ na-arụpụta nnọọ ihe. N’ókèala nke otu alaka, pasent 22 nke ndị ọsụ ụzọ nile—ihe dị ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị dị 20,000—dị afọ 60 ma ọ dịkarịa ala. Ndị agadi a na-ekere òkè dị ukwuu n’ọrụ nkwusa. Ahụmahụ ha na àgwà nsọpụrụ Chineke ha na-ewuli ọgbakọ ndị ha na-eje ozi na ha elu.—Jems 3:17, 18.
4 Iji ọrụ n’aka n’ozi Ndị Kraịst na-eme ka e nwee ahụ́ ike ka mma na ibi ụdị ndụ ka mma. Otu nwanna nwanyị dị afọ 84, onye malitere ịsụ ụzọ mgbe ọ lara ezumike nká kwuru, sị: “Iduziri ọtụtụ ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible enyeworo m aka ịdị gara gara n’uche. Enweghị m ụgbọala, ya mere m na-aga ije nke ukwuu. Nke a na-eme ka m nwee ahụ ike.” Otu di na nwunye meworo agadi, ndị bụ́ ndị ọsụ ụzọ kwuru, sị: “Ije ozi na-eme ka anyị nwee ahụ ike n’uche na n’anụ ahụ. Anyị na-anọkọ ọnụ mgbe nile. Anyị na-achị ọchị nke ukwuu ma na-anụ ụtọ ndụ.”
5 Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa: Ụfọdụ Ndị Kraịst laworo ezumike nká, ndị nwere ego iji mee otú ahụ akwagawo n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze iji jee ozi n’ebe ahụ. Ndị ọzọ amụbawo ozi ha site n’ije ozi n’ebe e nwere ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ. Dị ka Pọl onyeozi, ndị nkwusa a na-anụ ọkụ n’obi “na-eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka [ha] wee bụrụ [ndị ha] na ndị ọzọ na-ekerịta ya.”—1 Kọr. 9:23.
6 Otu di na nwunye malitere ịsụ ụzọ mgbe ha zụchara ụmụ ha ndị nwoke abụọ. Ka ha sụworo ụzọ ruo ọtụtụ afọ, ha malitere ịmụ asụsụ Chinese. Ugbu a ọ fọrọ obere ka ha ruo afọ 80, ha nwere ọṅụ ịhụ na nso nso a ka ìgwè na-asụ asụsụ Chinese ha so na-eje ozi ghọrọ ọgbakọ. Lee ngọzi ndị di na nwunye ndị dị otú a bụ!
7 A Dịghị Ala Ezumike Nká n’Ozi: Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-emesịa laa ezumike nká n’ọrụ ego ha, Ndị Kraịst anaghị ala ezumike nká n’ozi Chineke. Ha nile aghaghị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi “ruo ọgwụgwụ.” (Mat. 24:13, 14) N’ezie, n’ihi ime agadi, ụfọdụ enwekwaghị ike imeru ihe otú ha na-emebu n’ozi Jehova. Ma lee ihe agbamume ọ bụ ịhụ ha ka ha ji obi ha dum na-eme ihe ha nwere ike ime! Okwu Chineke na-emesi ha obi ike na Jehova agaghị echefu ọrụ ha na ịhụnanya ha gosiri maka aha ya.—Luk 21:1-4; Hib. 6:10.
8 Ọ bụrụ na ị na-akpụdewe oge ịla ezumike nká, gịnị ma i jiri ekpere tụlee otú ị pụrụ isi jiri ọnọdụ gị na-agbanwe agbanwe mee ihe n’ụzọ zuru ezu? Site n’enyemaka Chineke, ị pụrụ ịhụ na ịla ezumike nká na-emeghere gị ọnụ ụzọ na-eduga n’ịrụ ọrụ ka ukwuu nke na-ewetara Jehova otuto na ọtụtụ ngọzi.—Ọma 148:12, 13.