Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
1, 2. Ngọzi ndị dị aṅaa ka ya na ozi ọsụ ụzọ na-agakọ, n’ihi gịnịkwa?
1 “Amaara m na o nweghị ọrụ ọzọ nke pụrụ iwetaworo m afọ ojuju nke bịaworo site n’ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ,” ka otu onye ọsụ ụzọ kwuru. Onye ọzọ kwuru, sị: “Ná ngwụsị ụbọchị nke ọ bụla, ụra m na-atọ ụtọ, obi m na-ejupụtakwa n’ọṅụ.” Ndị ọsụ ụzọ a na-ekwuchitere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nọ n’ebe nile bụ́ ndị nwetaworo ngọzi nke ozi ọsụ ụzọ.—Ilu 10:22.
2 Inyere ndị ọzọ aka inweta ihe ọmụma nke Okwu Chineke nke na-azọpụta ndụ na-eweta ezi afọ ojuju. (Ọrụ 20:35; 1 Tesa. 2:19, 20) “Ọ na-akpali akpali ma na-ewusi okwukwe ike ịhụ otú Okwu Chineke si dị ike n’ịkwali ndị mmadụ ime mgbanwe ná ndụ ha,” ka otu onye bụworo ọsụ ụzọ ruo ogologo oge dere. Ee, site n’iwepụta onwe ha iji nyere ndị mmadụ aka ma na-eduzi ọmụmụ Bible dị iche iche, ndị ọsụ ụzọ ga-enweta ngọzi ndị dị ka ndị a.
3, 4. Olee otú ọrụ ọsụ ụzọ si akụziri mmadụ ịdabere n’ebe Jehova nọ, oleekwa ụzọ nke a si enyere mmadụ aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ?
3 Ịdabere n’Ebe Jehova Nọ: Ịdabere na mmụọ Chineke kwa ụbọchị ka ha na-eje ozi ha na-enyere ndị ọsụ ụzọ aka ịmị “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” ọ na-abụkwara ha ihe nchebe. (Gal. 5:16, 22, 23) Tụkwasị na nke a, ebe ọ bụ na ha na-eji Okwu Chineke eme ihe mgbe nile, ndị ọsụ ụzọ na-enwekarị nkà n’iji Akwụkwọ Nsọ agbachitere eziokwu ahụ nakwa n’iwusikwu ndị ọzọ ike. (2 Tim. 2:15) Otu nwanna nwoke nke sụworo ụzọ ruo ọtụtụ iri afọ kwuru, sị: “Ịsụ ụzọ enyeworo m aka inweta ihe ọmụma dị omimi nke Bible, ihe ọmụma m jiworo nyere ọtụtụ ndị aka ịbịa mara Jehova na nzube ya.” Lee ihe na-enye afọ ojuju nke ahụ bụ!
4 Ndị ọsụ ụzọ oge nile aghaghịkwa ịdabere n’ebe Jehova nọ n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. Okwukwe ha na-esikwu ike ka ha na-ahụ otú o si agọzi mgbalị ndị ha na-eme igbo mkpa anụ ahụ́ ha. Otu onye dị afọ 72 nke rụworo ọrụ ọsụ ụzọ oge nile ruo afọ 55 kwuru, sị: “Ọ dịbeghị mgbe Jehova mechuru m ihu.” Ọzọkwa, site n’ime ka ndụ ha dị mfe, ndị ọsụ ụzọ na-echebe onwe ha pụọ n’ọtụtụ nchegbu a na-enwe ná ndụ. Nke ahụ ọ́ dịghị amasị gị?—Mat. 6:22; Hib. 13:5, 6.
5. Olee otú ọrụ ọsụ ụzọ si enyere mmadụ aka ịbịaru Jehova nso?
5 Ịbịaru Chineke Nso: Mmekọrịta anyị na Jehova bụ ihe kasị ọnụ ahịa anyị nwere. (Ọma 63:3) Mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi ahụ n’ụzọ zuru ezu n’ihi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ, mmekọrịta ahụ na-echikwu anya. (Jes. 4:8) Otu onye sụworo ụzọ ruo ihe karịrị afọ 18 kwuru, sị: “Ozi ọsụ ụzọ na-enye anyị ohere ‘idetụ Jehova ire wee hụ na ọ dị mma,’ na-eme ka mmekọrịta anyị na Onye Okike anyị na-esiwanye ike kwa ụbọchị.”—Ọma 34:8.
6. Gịnị ka ndị ọsụ ụzọ na-aghaghị inwe, e wezụga ndị ọsụ ụzọ, olee ndị ọzọ na-eritekwa uru?
6 Tụkwasị n’inwe ọnọdụ ndị ga-enyere ha aka ịsụ ụzọ, ndị ọsụ ụzọ aghaghị inwe okwukwe siri ike, ezi ịhụnanya n’ebe Chineke na ndị agbata obi nọ, ma na-adị njikere ịchụ ihe dị iche iche n’àjà. (Mat. 16:24; 17:20; 22:37-39) Otú ọ dị, dị ka ihu ọchị nke ndị ọsụ ụzọ nọ n’ebe nile na-agba akaebe ya, ngọzi ndị a na-enweta n’ozi ọsụ ụzọ bara ụba. (Mal. 3:10) Ọ bụghị nanị ndị ọsụ ụzọ na-enweta ngọzi ndị a, kamakwa, ndị òtù ezinụlọ ha na ọgbakọ ha na-erite uru dị ukwuu site ná mmụọ dị mma ndị ọsụ ụzọ na-egosipụta.—Fil. 4:23.