Nri Ime Mmụọ nke Bịara n’Oge Kwesịrị Ekwesị
1. Olee otú Ezikiel 36:29 si na-emezu taa?
1 “M ga-akpọkwa ọka, mee ka ọ baa ụba, M gaghị atụkwasị unu oké ụnwụ,” bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta. (Ezik. 36:29) Okwu amụma ndị ahụ metụtara ndị Chineke taa. N’ụzọ ihe atụ, Jehova emewo ka ọka nke na-akwagide ndụ pupụtara ndị ya n’ụba. Nri ime mmụọ nke na-abịa n’oge ya, bụ́ nke a na-enye ná mgbakọ distrikti anyị na-egosipụta nke a n’ụzọ doro anya.
2. Olee otú Jehova siworo jiri mgbakọ distrikti nye nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị?
2 Ná mgbakọ e nwere na Columbus, Ohio, na 1931, Jehova duziri ndị na-efe ya ofufe ka ha zawa aha ọhụrụ—Ndịàmà Jehova. (Aịsa. 43:10-12) Na 1935, e mere ka a mata ndị oké ìgwè mmadụ ahụ a kọwara ná Mkpughe 7:9-17 bụ n’ezie. Na 1942, Nwanna Knorr kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Udo—Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide?” Okwu ahụ kwalitere ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, meekwa ka a malite ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. Ọ bụ ezie na a na-aka echeta mgbakọ ụfọdụ, nke ọ bụla n’ime ha abụwo tebụl a kwajuru nri ime mmụọ ndị na-edozi ahụ́ n’oge kwesịrị ekwesị.—Ọma 23:5; Mat. 24:45.
3, 4. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji rite uru n’oriri ime mmụọ a ga-enwe ná mgbakọ distrikti anyị?
3 Ruo Ókè Há Aṅaa Ka Ị Na-eriju Nri Afọ? Anyị pụrụ ịbụ ndị nri gbara gburugburu ma ka nwee nsogbu sitere n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ ma ọ bụrụ na anyị adịghị etinye mgbalị n’iri nri. (Ilu 26:15) Otú ahụ ka ọ dị n’ụzọ ime mmụọ. N’ọtụtụ mgbakọ, a chọpụtawo na ụfọdụ na-ahapụ ụlọ mgbakọ ịga see foto mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ndị ọzọ eruwo ọbụna n’ókè nke ịkpọbata ndị na-ese foto n’ala mgbakọ. Nke a ekwesịghị ekwesị.—Jọn 2:16.
4 Ọzọkwa, a chọpụtawo na ọtụtụ ndị na-akpagharị nnọọ ma ọ bụ soro ndị ọzọ na-akọ akụkọ mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ọ bụ ezie na mkpakọrịta na-ewuli elu bụ akụkụ dị mkpa nke mgbakọ, e kwesịrị ime ya tupu ihe omume amalite nakwa mgbe e mechiri. (Ekli. 3:1, 7) Ọ bụrụ na anyị anọghị n’oche anyị na-aṅa ntị nke ọma, isi ihe dị mkpa pụrụ ifunahụ anyị. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị nlekọta ngalaba dị iche iche nke mgbakọ na ụmụnna ndị e kenyere ọrụ kwurịta ihe ndị metụtara mgbakọ mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ma ọ́ bụghị ya, ha kwesịrị isetịpụ ihe nlereanya site n’ịṅa ntị mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ọ dịghị onye n’ime anyị nri ime mmụọ ọ bụla e nyere kwesịrị ifunahụ.—1 Kọr. 10:12; Fil. 2:12.
5. Olee otú anyị pụrụ isi gosi onwe anyị ịbụ ndị nwere ekele maka ụbara nri ime mmụọ Jehova na-enye?
5 Lee ka anyị si aṅụrị ọṅụ maka ụbara eziokwu ime mmụọ Jehova na-enye, bụ́ nke dị iche n’ozizi ụgha na-enweghị isi nke Krisendọm! (Aịsa. 65:13, 14) Otu ụzọ anyị pụrụ isi ‘gosi onwe anyị ịbụ ndị nwere ekele’ bụ site n’ile mgbakọ anya dị ka ohere nke ịbụ ndị Jehova ziri ihe. (Kọl. 3:15) Tinye uche n’ihe nwanna na-ekwu okwu na-ekwu, na-elekwa ozi ahụ anya dị ka nke sitere n’aka “Onye Nkụzi Ukwu” anyị. (Aịsa. 30:20, 21, NW; Aịsa. 54:13) Ṅaa ntị nke ọma. Mgbe ị na-aga Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije,” buru n’uche ịdị mkpa nke idetu ihe, bụ́ nke ga-enyere gị aka ikere òkè ná ntụleghachi a ga-eji ọnụ mee bụ́ nke a ga-enwe ná Nzukọ Ije Ozi ná mmalite afọ ọzọ. N’uhuruchi ọ bụla, tụleghachi isi ihe ndị a mụrụ. Tinye ihe ị mụtara n’ọrụ.
6. Olee ihe mere anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ ná mgbakọ distrikti?
6 Mgbakọ ọ bụla e nwere tupu Amagedọn, ma è nwere ya n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, n’ala agha tisasịrị, ma ọ bụ n’ebe buru ibu nke e nwere udo karị, bụ mmeri megide Setan! Dị ka òtù ụmụnna dị n’otu, anyị agaghị eji ohere ndị anyị nwere ịgbakọta ná mgbakọ distrikti gwurie egwu. (Ezik. 36:38) Anyị nwere obi ike na, ọzọkwa, Jehova ga-eji ịhụnanya nye anyị ‘ihe oriri n’oge kwesịrị ekwesị.’—Luk 12:42.
Igbe dị na peeji nke 4]
Gosi Ekele Maka Tebụl Jehova
◼ Ṅaa ntị nke ọma
◼ Detuo isi ihe ụfọdụ
◼ N’uhuruchi ọ bụla, tụleghachi isi ihe ndị a mụrụ
◼ Tinye ihe ị mụtara n’ọrụ