Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/04 p. 4
  • Na-eṅomi Ụzọ Iche Echiche Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eṅomi Ụzọ Iche Echiche Jizọs
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-egosipụta Ụzọ Iche Echiche Nke Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ihe Mgbaru Ọsọ Magburu Onwe Ya Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ịhụnanya Kraịst Na-akpali Anyị Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 4/04 p. 4

Na-eṅomi Ụzọ Iche Echiche Jizọs

1. Olee ụzọ iche echiche Jizọs gosipụtara?

1 Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị hụworo Ọkpara Chineke, ma site n’ihe ndekọ ndị e dere ede banyere ndụ na ije ozi Jizọs, anyị abịawo hụ ya n’anya n’ezie. (1 Pita 1:8) N’irube isi n’uche Nna ya, ọ hapụrụ ọnọdụ dị elu ọ nọ na ya n’eluigwe ma bịa n’elu ụwa. Dị ka mmadụ, o jeere ndị ọzọ ozi n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị ma n’ikpeazụ, nye ndụ ya n’ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ. (Mat. 20:28) Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “Meenụ ka ụzọ iche echiche a dịrị n’ime unu bụ́ nke dịkwa n’ime Kraịst Jizọs.” Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ya?—Fil. 2:5-8.

2. Olee ihe ịma aka nke ọtụtụ Ndị Kraịst na-eche ihu, oleekwa ihe pụrụ inyere ha aka imeri ya?

2 Mgbe Ike Gwụrụ Gị: Ọ bụ ezie na Jizọs zuru okè, ike gwụkwara ya. N’otu oge, mgbe “ike gwụrụ [Jizọs] na njem o mere,” ọ gbaara otu nwanyị Sameria àmà. (Jọn 4:6) Ọtụtụ Ndị Kraịst taa na-eche ihe ịma aka dị otú ahụ ihu. Mgbe a rụsịrị ọrụ na-agwụ ike n’izu, ọ pụrụ isi ike inwekwa ume iji kere òkè n’ọrụ nkwusa. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị ekere òkè n’ọrụ nkwusa mgbe nile, anyị ga-achọpụta na ozi Ndị Kraịst na-enye anyị ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.—Jọn 4:32-34.

3. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’ịdị njikere izi ihe?

3 N’oge ọzọ, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gawara n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị iji zurutụ ike. Otú ọ dị, ìgwè mmadụ matara banyere ya ma buru ha ụzọ ruo n’ebe ahụ. Kama ile ya anya na a na-enye ya nsogbu, Jizọs “nwere ọmịiko n’ahụ́ ha” o wee malite “izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:30-34) Ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible na-achọ àgwà yiri nke ahụ. Ọ na-achọ mgbalị a nọgidesiri ike na-eme na inwe ezigbo ịhụnanya maka ndị mmadụ. Ọ bụrụ na ọ dịghị ọmụmụ Bible ị na-eduzi ka ọ dị ugbu a, adala mbà ná mgbalị ị na-eme inweta otu.

4. Olee otú ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka pụrụ isi nyere anyị aka iṅomi ụzọ iche echiche nke Kraịst?

4 Bute Ọdịmma Ime Mmụọ Ụzọ: Ozi ọsụ ụzọ inyeaka pụrụ inyere anyị aka ilekwasịkwu anya n’ọrụ ime mmụọ dị iche iche. Otu nwanna nwanyị na-eto eto dere, sị: “Nne nke otu n’ime ndị enyi m gbara anyị abụọ ume iso ya rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa. Obi dị m nnọọ ụtọ na anyị sonyeere ya. Ọ tọrọ m ụtọ ịmatakwu ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị nke ọma, n’oge na-adịghịkwa anya, ha bịara dị m ka ndị ezinụlọ m. Ọ tọkwara m ụtọ inwekwu ohere iji kọọrọ ndị ọzọ banyere Jehova na ịkụziri ha eziokwu ndị dị ebube nke Alaeze. Ihe a nile mere ka m bịakwuo Jehova na ọgbakọ ya nso.”—Ọma 34:8.

5. Gịnị mere na anyị aghaghị ịnọgide na-etinyesi mgbalị ike n’iṅomi ụzọ iche echiche Jizọs?

5 Anyị nile na-eche ọgụ dị n’etiti anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè na ọchịchọ anyị ime ihe na-atọ Jehova ụtọ ihu. (Rom 7:21-23) Anyị aghaghị izere mmụọ nke ụwa nke mmadụ achọghị ịdọgbu onwe ya n’ọrụ. (Mat. 16:22, 23) Jehova pụrụ inyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma na nke a site na mmụọ nsọ ya. (Gal. 5:16, 17) Ka anyị nọ na-echere nnapụta anyị baa n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke, ka anyị na-eṅomi ụzọ iche echiche Jizọs site n’ibute ihe ndị metụtara Alaeze na ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke anyị.—Mat. 6:33; Rom 15:1-3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya