Ntụleghachi Nke Usoro Ihe Omume Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
A ga-eji ajụjụ ndị dị n’isiokwu a tụlee ihe ndị a ga-eme n’usoro ihe omume nke ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2005, jirikwa ha tụleghachi ya mgbe a lọtara. Isiokwu bụ́ “Ndokwa Ọhụrụ E Mere Maka Ịtụleghachi Usoro Ihe Omume Mgbakọ,” bụ́ nke dị na peeji nke 4 nke ihe ntinye a, na-akọwa otú a ga-esi eme nke a. Mgbe a na-eme ntụleghachi a, kegasịa oge n’ụzọ ga-eme ka ị jụọ ajụjụ nile. Ntụleghachi a kwesịrị ihiwe isi n’otú a pụrụ isi tinye ihe a mụtara ná mgbakọ ahụ n’ọrụ.
NNỌKỌ NKE ỤTỤTỤ
1. N’ihi gịnị ka o ji adịwanye mkpa ige Jehova ntị? Gịnị ka ige ntị pụtara? (“Ihe Mere A Ga-eji Na-aṅa Ntị n’Olu Jehova”)
2. Olee otú ezinụlọ pụrụ isi na-enwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma? (“Ezinụlọ Ndị Na-aṅa Ntị n’Okwu Chineke n’Enweghị Ihe Ndọpụ Uche”)
3. Olee otú ndị nọ na sekit anyị siworo jiri ohere ndị dapụtaranụ gbaa àmà mgbe ha na-anọghị n’ozi? (“Ime Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto”)
4. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke a na-achọta ná Ndị Hibru isi nke 3 na nke 4? Olee ụzọ Jehova si agwa anyị okwu taa? (“Ịṅa Ntị Mgbe Chineke Na-ekwu Okwu Na-echebe Anyị”)
5. Uru dị aṅaa ka i ritere site n’okwu baptizim? (“Nraranye na Baptizim”)
NNỌKỌ NKE EHIHIE
6. Gịnị ka anyị pụrụ ịghọta banyere Jizọs mgbe ọ bụ onye ntorobịa, oleekwa otú ndị ntorobịa nọ na sekit anyị si eṅomi ihe nlereanya ya? (“Otú Ịṅa Ntị nke Ọma n’Okwu Chineke Si Ewusi Ndị Ntorobịa Anyị Ike”)
7. Olee ụzọ ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ isi malite ịzụ ụmụ ọhụrụ na ụmụntakịrị ha n’ụzọ Jehova? (“Ụmụaka Ndị Na-aṅa Chineke Ntị Ma Na-amụta Ihe”)
8. N’ihe ndị dị aṅaa kpọmkwem ka ọ dị mkpa ka anyị na-ege Jehova, Ọkpara ya, na “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ntị? (Mat. 24:45) Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị na-eme otú ahụ? (“Na-aṅa Ntị ná Ntụziaka Chineke Mgbe Nile”)