Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/05 p. 3
  • A Ga-azọpụta Ụdị Mmadụ Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Ga-azọpụta Ụdị Mmadụ Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-ahụ Nanị Ọdịdị Elu Ahụ?
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Ejila Otú Mmadụ Dị Ekpebi Otú Ị Ga-esi Ewere Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ị̀ Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ọdịdị Onwe Onye Dị Mma
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 9/05 p. 3

A Ga-azọpụta Ụdị Mmadụ Nile

1. Na gịnị ka Chineke na-adabere na ya ele anyị anya?

1 Obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke emeghewo ụzọ nzọpụta. Ọ bụ uche Jehova ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Chineke adịghị adabere n’agbụrụ anyị, ọkwá anyị, ikike anyị nwere, ma ọ bụ ọdịdị ahụ́ anyị wee na-ele anyị anya, kama ọ na-adabere n’okwukwe anyị gosiri n’àjà mgbapụta Jizọs. (Jọn 3:16, 36) Dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ, anyị aghaghị isere aka n’ụdị ọ bụla nke ile mmadụ anya n’ihu, n’ihi na ọ pụrụ ime ka anyị jụ ndị Jehova dị njikere ịnabata.

2, 3. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịghara ikpe ndị mmadụ ikpe n’ihi ọdịdị ahụ́ ha?

2 Zere Ikpe Ikpe: Jehova na-ele anya n’àgwà mmadụ, ọ naghịkwa ebu ihe ọjọọ n’obi eme ya ma ọ bụ na-ele anya n’ihu mgbe ọ na-eme ya. (1 Sam. 16:7) Ọ na-ahụkwa ihe mmadụ pụrụ ịghọ. N’ihi ya, ọ na-ele ndị na-achọ ime ihe na-atọ ya ụtọ anya dị ka ndị a na-achọsi ike. (Hag. 2:7) Ànyị na-ele ndị ọzọ anya otú Chineke si ele ha?

3 Ọdịdị nke ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma pụrụ ịwụ anyị akpata oyi n’ahụ́. Ha pụrụ iyi nkịkara uwe ma ọ bụ jie ejiji na-adịghị mma, ntutu ha na afụ ọnụ ha abụrụ nke ha na-adịghị elebara anya. Ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị na-enweghị ebe obibi. Ndị ọzọ pụrụ imeso anyị ihe n’iwe. Kama ikpe ndị dị otú ahụ ikpe dị ka ndị na-eyitụghị ndị ga-efe Jehova, anyị kwesịrị inwe echiche ziri ezi banyere ha, “n’ihi na ọ dị mgbe ọbụna anyị na-amaghị ihe, na-enupụ isi, bụrụ[kwa] ndị a na-eduhie eduhie.” (Taị. 3:3) Ọ bụrụ na anyị aghọta ya otú ahụ, anyị ga-adị na-enwe ọchịchọ izi onye ọ bụla ozi ọma, ọbụna ndị pụrụ iyi ndị na-ekwesịghị ka e zie ha ozi ọma ma e lewe ọdịdị ahụ́ ha.

4, 5. Olee ihe anyị na-amụta site n’ihe nlereanya Jizọs na Pọl?

4 Ihe Atụ nke Narị Afọ Mbụ: Jizọs Kraịst wepụtara oge iji nyere ndị ndị ọzọ pụrụ iwere dị ka ndị na-enweghịzi mmekwata, aka. (Luk 8:26-39) Ọ bụ ezie na ọ dịtụghị mgbe ọ kwadoro omume ọjọọ, ọ maara na mmadụ pụrụ ime ihe ọjọọ. (Luk 7:37, 38, 44-48) N’ihi ya, o gosiri na ya ghọtara ọnọdụ ha nke ọma, ebe ọ bụ na o “nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mak 6:34) Ànyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya ya n’ụzọ ka zuo ezu?

5 A tụrụ Pọl onyeozi nkume, tie ya ihe, ma tụọ ya mkpọrọ. (Ọrụ 14:19; 16:22, 23) Ahụmahụ ọjọọ ndị dị otú ahụ ò mere ka o wewa iwe ma were ya na ya na-egbu oge ya n’izi mba ụfọdụ ma ọ bụ agbụrụ ụfọdụ ozi ọma? Mbanụ. Ọ maara na a pụrụ ịchọta ndị nwere obi eziokwu n’agbụrụ nile, o kpebisikwara ike ịchọta ha. Ọ̀ bu otú ahụ ka anyị si ele ndị nọ n’ókèala anyị, bụ́ ndị ọdịbendị ha na ụzọ e si zụlite ha dị iche na nke anyị, anya?

6. Olee mmetụta àgwà anyị pụrụ inwe n’ahụ́ ndị ọhụrụ bịara nzukọ ọgbakọ?

6 Ịnabata Ndị Ọzọ Taa: Obi dị ọtụtụ n’ime ndị Chineke ụtọ na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, bụ́ ndị leghaara ọdịdị ahụ́ ha anya, nabatara ha n’ọgbakọ. Na Germany, otu nwoke yi nkịkara uwe, nke afụ ọnụ ya jọrọ njọ n’anya, ntụtụ isi ya ana-erukwa ya n’ubu, batara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A ma ya ama dị ka onye ọjọọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, a nabatara ya nke ọma ná nzukọ ọgbakọ. O nwere nnọọ obi ụtọ nke na ọ bịaghachiri otu izu mgbe nke a gasịrị. N’oge na-adịghị anya, ọ kpụrụ isi na afụ ọnụ ya nke ọma, kwụsị ise siga, ma lụọ enyi ya nwanyị n’ụzọ iwu kwadoro. O teghị aka, ha na ụmụ ha amalitela ijere Jehova ozi dị ka ezinụlọ dị n’otu.

7. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Chineke anyị nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu?

7 N’iṅomi Chineke anyị nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ka anyị na-akpọ mmadụ nile òkù ịbịa rite uru n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke na-egosi.

Igbe dị na peeji nke 3]

“Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya