Akụkụ nke 9: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Ịkwadebe Ndị A Na-amụrụ Ihe Ịgba Àmà Mgbe Ha Na-erubeghị Iso Ọgbakọ Na-eje Ozi
1 Mgbe Andru na Filip matara na Jizọs bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa, ha alaghị azụ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ọma ahụ ha matara. (Jọn 1:40-45) N’otu aka ahụ taa, ka ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible malitere igosipụta okwukwe n’ihe ha na-amụta, ha na-abụ ndị a kpaliri ịkọrọ ya ndị ọzọ. (2 Kọr. 4:13) Olee otú anyị pụrụ isi gbaa ha ume ịdị na-agba àmà mgbe ha na-erubeghị iso ọgbakọ na-eje ozi ma kwadebe ha ime ya nke ọma?
2 Ị pụrụ nnọọ ịjụ onye ị na-amụrụ ihe ma ọ̀ kọọrọla ndị ọzọ ihe ọ mụtaworo na Bible. Ikekwe, o nwere ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ bụ́ ndị ọ pụrụ ịkpọ ka ha nọrọ ya mgbe ị na-amụrụ ya ihe. Jụọ ya ma ọ̀ dị onye ọrụ ibe ya, nwa akwụkwọ ibe ya, ma ọ bụ ndị ọzọ ọ maara, bụ́ ndị gosiworo mmasị. N’ụzọ dị otú a, ọ pụrụ ịmalite ịgba àmà. Nyere ya aka ịghọta mkpa ọ dị iji nghọta, nkwanye ùgwù, na obiọma na-eme ihe mgbe ọ na-agwa ndị ọzọ banyere Jehova Chineke na nzube ya.—Kọl. 4:6; 2 Tim. 2:24, 25.
3 Ịkọrọ Ndị Ọzọ Ihe Ndị Ha Kweere: Ọ dị oké mkpa ịzụ ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible iji Okwu Chineke na-eme ihe mgbe ha na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha kweere. N’oge ụfọdụ mgbe unu na-amụ ihe, jụọ ya, sị: “Olee otú ị ga-esi jiri Bible kọwaara ndị ezinụlọ gị eziokwu a?” ma ọ bụ “Olee amaokwu Bible ị ga-eji akọwara enyi gị ihe a?” Gee ntị nke ọma otú ọ ga-esi zaa ya, ma gosi ya otú ọ ga-esi mee ka ozizi ya na-adabere n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Tim. 2:15) N’ụzọ dị otú a, ọ ga-abụ onye ị kwadebere ịgba àmà mgbe ọ na-erubeghị iso ọgbakọ na-eje ozi, nakwa mgbe ọ ga-eru iso ọgbakọ na-eje ozi.
4 Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịkwadebe ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible iche mmegide ihu. (Mat. 10:36; Luk 8:13; 2 Tim. 3:12) Mgbe ndị ọzọ jụrụ ajụjụ banyere Ndịàmà Jehova ma ọ bụ kwuo ihe ụfọdụ banyere ha, nke a pụrụ ime ka ndị anyị na-amụrụ ihe nwee ohere ịgba àmà. Broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? pụrụ ịkwadebe ha ‘ịdị njikere ime ngọpụ.’ (1 Pita 3:15) N’ime ya, e nwere ihe ọmụma ziri ezi ndị ọhụrụ pụrụ iji nyere ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha, bụ́ ndị na-echere ha echiche ọma, aka ịghọta nkwenkwe anyị na ihe omume anyị ndị dabeere na Bible.