Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ
1 Onyinye kasị ukwuu Onye Kraịst bụ́ nne ma ọ bụ nna pụrụ inye ụmụ ya bụ ime ka ha hụ Jehova n’anya otú o si hụ Ya. Oge magburu onwe ya ị pụrụ iji mee nke a bụ “mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị” maka ọmụmụ Bible ezinụlọ kwa izu. (Deut. 6:5-7) Ma ì nwere di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe, nọrọ n’ezinụlọ ndị nọ na ya na-adịghị ekpe otu okpukpe, ma ọ bụ bụrụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ, ị pụrụ inyere ụmụ gị aka ịbịaru gị onwe gị na Jehova nso site n’ịdị na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya.
2 Ịmalite Ya: Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịhụ na unu na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya. Ọ bụrụ na ị maghị oge unu ga na-enwe ọmụmụ ihe ahụ, gịnị ma unu kwurịta ya dị ka ezinụlọ? (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na i nwere obere ụmụaka, ị pụrụ ime ka ọmụmụ ihe unu na-adị mkpirikpi ma bụrụ nke a na-amụ ugboro ugboro n’izu. Chọpụta oge ga-adabara onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu. Nweenụ oge a kapịrị ọnụ unu ga na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, kpebisiekwanụ ike ịdị na-enwe ya n’oge ahụ.
3 Gịnị ka unu pụrụ ịmụ? Ụfọdụ na-akwadebe ihe ọmụmụ a ga-amụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ma ọ bụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke izu ahụ. Ndị ọzọ na-amụ akwụkwọ e dere maka ndị na-eto eto. Nna nke otu nwatakịrị nwoke na nwatakịrị nwanyị kwuru, sị: “Otu ihe mere ka ọmụmụ ihe anyị bụrụ otu n’ime ihe ndị kasị atọ ụmụ anyị ụtọ n’izu bụ na anyị na-eme ihe ngosi nke akụkọ ndị dị n’Akwukwọm nke Akukọ Bible. Otú o si emetụta anyị nakwa ókè anyị na-aghọtaru ya dị nnọọ mkpa karịa paragraf ole anyị mụrụ.”
4 Na-amụ Ya Kwa Izu: E kwesịrị ịdị na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya, ndị nile nọ n’ezinụlọ kwesịkwara iji ọṅụ na-atụ anya ya. N’ihi ihe ndị pụrụ ịdapụta na mberede, ọ pụrụ ịdị mkpa ịgbanwetụ oge na ụbọchị mgbe ụfọdụ. A pụkwara inwe oge ọ ga-adị mkpa ịgbanwe akwụkwọ a na-amụ. Ma mgbanwe ọ bụla ọ dị mkpa ka e mee ekwesịghị ịdịgide ruo ogologo oge ma mee ka unu kwụsị ịgbaso usoro unu guzoberela maka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu. N’otu ezinụlọ, nwa ha nwanyị kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na a ga-agbanwerịrị oge ọmụmụ ihe anyị, papa anyị na-ede oge ọhụrụ ahụ ede ma mapawa ya n’ebe onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị ga-ahụ ya.’ Lee nnọọ ka mgbalị dị otú ahụ a na-eme iji hụ na a na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya si bụrụ ihe kwesịrị ịja mma! Ka ị na-anọgide na-azụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova,” ị na-egosipụta ịhụnanya i nwere n’ebe ha nọ nakwa n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ.