Nyere Ụmụ Gị Aka Inwe Ọganihu n’Ozi Ọma
1 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ibu ọrụ siri ike nke ime ka ụmụ ha na-ekere òkè n’ozi site n’oge ha ka dị obere. A pụrụ isi ọtụtụ ụzọ mee nke a. Ụfọdụ ụmụaka na-agụli amaokwu Bible ụfọdụ n’isi ọbụna tupu ha amalite ịgụ ihe. Nke a pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ebe ndị na-ege ntị nọ. Ka ụmụaka na-etolite, ha pụrụ ọbụna imekwu ihe n’ozi ọma. Olee otú unu bụ́ ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ unu aka iso na-agba àmà? Ikekwe, aro ndị na-esonụ ga-enyekwu aka.
2 Mgbe i kelesịrị onye nwe ụlọ, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Nwa m, bụ́ [aha ya], nwere ọmarịcha akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ ga-enwe mmasị ị gụrụ gị.” Nwa gị ahụ pụrụ ikwu, sị: “Esi m n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a dị n’Abụ Ọma mụta aha Chineke. [Nwa ahụ agụọ Abụ Ọma 83:18 n’isi ma ọ bụ site n’Akwụkwọ Nsọ.] Magazin ndị a na-ekwu banyere ihe Jehova Chineke ga-emere anyị. Ọ̀ bụ m hapụrụ gị ha?” Ị pụrụ imechi mkparịta ụka ahụ site n’ịkọwa otú e si akwado ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ gburugburu ụwa.
3 Ma ọ bụ ị pụrụ ịnwale nke a:
◼ “Ndeewo. Ana m akụziri nwa m nwanyị, bụ́ [aha ya], inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ bi n’ógbè anyị a nọ. Ọ ga-amasị ya izi gị otu ozi dị nkenke nke dị na Bible.” Nwa ahụ pụrụ ikwu, sị: “Otu ụzọ m na-enwe mmasị isi enyere ndị mmadụ aka bụ site n’ịkọrọ ha ihe Bible kwuru ka a tụwa anya ha n’ọdịnihu. [Nwa ahụ agụọ Mkpughe 21:4 n’isi ma ọ bụ site n’Akwụkwọ Nsọ.] Magazin ndị a na-akọwa ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị. Echere m na ọ ga-atọ gị ụtọ ma ị gụọ ha.”
4 Ịnọgide na-eji ụzọ ndị dị mfe ezi ozi ọma na-eme ka obi sie ụmụaka ike na ha nwere ike izi ndị ọzọ ozi Alaeze ahụ. Ịmụgharị ụzọ e si ezi ozi ọma bụ́ nke ga-elekwasị anya n’ikwu okwu n’olu dara ụda nakwa n’ụzọ doro anya, ga-akwadebe ha ikwu okwu n’ọnọdụ dị iche iche. Ịkwadebe ụmụaka nke ọma tupu ha ejee ozi na ịja ha mma site n’obi ga-enyere ha aka ikwupụta ihe ndị ha kweere.
5 N’ihi agbamume dị otú ahụ a na-enye ụmụaka, ọtụtụ n’ime ha aghọwo ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ụmụ anyị ka ha na-enwe ọganihu n’ozi Ndị Kraịst!—Ọma 148:12, 13.