Akụkụ nke 12: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Inyere Ndị Ị Na-eduziri Ọmụmụ Bible Aka Ịmalite na Iduzi Ọmụmụ Bible
1 Mgbe ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible malitere ije ozi ọma, ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible nke ha pụrụ ịdị na-atụ ha ụjọ. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka ile akụkụ a dị mkpa nke ozi anyị anya dị ka ihe ha ga-emeli?—Mat. 24:14; 28:19, 20.
2 Ozugbo onye a na-eduziri ọmụmụ Bible ruru ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ikekwe ọ malitelarị ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọzụzụ ọ na-anata site n’ịkwadebe na n’ime ihe omume ya ga-enyere ya aka ịzụlite nkà nke izi ihe bụ́ nke a chọrọ n’aka “onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Tim. 2:15.
3 Na-ezi Ihe Site n’Ihe Nlereanya Gị: Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ site n’inye ha ntụziaka doro anya nakwa site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla a kụziiri ihe n’ụzọ zuru okè ga-adị ka onye nkụzi ya.” (Luk 6:40) Ọ dị oké mkpa ka i ṅomie Jizọs site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ozi gị. Ka onye ị na-amụrụ ihe na-ahụ ihe nlereanya ị na-esetịpụ n’ozi ahụ, ọ ga-aghọta na nzube e ji eme nletaghachi bụ iji malite ọmụmụ Bible.
4 Kọwaara ya na mgbe anyị na-agwa onye nwe ụlọ ka anyị duziwere ya ọmụmụ Bible, ọ dịchaghị mkpa ịkọwara ya ihe nile banyere ụzọ a ga-esi amụ ihe ahụ. Ọtụtụ mgbe, ọ na-akasị mma nanị igosi ya otú a ga-esi na-amụ ihe ahụ site n’ịmụrụ ya otu ma ọ bụkwanụ paragraf abụọ n’akwụkwọ a chọrọ iji eduziri ya ọmụmụ ihe ahụ. A pụrụ ịhụ aro ndị ga-enye aka ime nke a na peeji nke 4 nke Ozi Alaeze Anyị a ma ọ bụ na peeji nke 6 n’Ozi Alaeze Anyị nke January 2002.
5 Mgbe ọ bụla o kwesịrị ekwesị, gwa onye ahụ ị na-amụrụ ihe ka o soro gị ma ọ bụ onye nkwusa ọzọ nwere ahụmahụ gaa duziere ndị ọzọ ọmụmụ Bible. Ọ pụrụ itinye ọnụ n’ọmụmụ ihe ahụ site n’ịkọwa otu paragraf ma ọ bụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ isi. Ya mere, site n’ịdị na-ele gị anya, onye ahụ ị na-amụrụ ihe ga-amụta ọtụtụ ihe banyere ụzọ e si eduzi ọmụmụ Bible na-aga n’ihu. (Ilu 27:17; 2 Tim. 2:2) Jaa ya mma ma gwa ya ebe ndị ọ pụrụ imeziwanye ihe.
6 Inye ndị nkwusa ọhụrụ ọzụzụ ịghọ ndị na-akụzi Okwu Chineke ga-akwadebe ha maka “ezi ọrụ” nke ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible nke ha. (2 Tim. 3:17) Lee ihe na-enye afọ ojuju ọ bụ iso ha na-arụkọ ọrụ n’iji ịhụnanya akpọ ndị ọzọ òkù, sị: “Ka onye ọ bụla nke chọrọnụ nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu”!—Mkpu. 22:17.