Ịgba Àmà n’Ekwughị Okwu Ọ Bụla
1 N’ekwughị okwu ọ bụla, ihe ndị a na-ahụ anya Jehova kere na-akọ ihe dị ukwuu banyere àgwà Ya ndị a na-apụghị ịhụ anya. (Ọma 19:1-3; Rom 1:20) N’otu aka ahụ, omume ọma anyị, àgwà ndị e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst, na otú anyị si adị ùgwù n’anya, na-agba àmà n’ekwughị okwu ọ bụla. (1 Pita 2:12; 3:1-4) O kwesịrị ịbụ ọchịchọ onye ọ bụla n’ime anyị iji àgwà anyị “chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile.”—Taị. 2:10.
2 Olee otú ọ ga-esi kwe mmadụ na-ezughị okè omume ịchọ ozizi Bible mma? Ọ bụ nanị nduzi nke Okwu Chineke na ike nke mmụọ nsọ ya ga-eme ka o kwe omume. (Ọma 119:105; 143:10) Okwu Chineke “dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla.” (Hib. 4:12) Ọ na-abaru anyị n’ụmị, meekwa ka anyị yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ. (Kọl. 3:9, 10) Mmụọ nsọ na-eme ka anyị nwee àgwà ndị magburu onwe ha, dị ka obiọma, ịdị mma, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye. (Gal. 5:22, 23) Anyị nile n’otu n’otu, ànyị na-ekwe ka okwu Chineke na mmụọ ya na-arụ ọrụ ná ndụ anyị?—Efe. 4:30; 1 Tesa. 2:13.
3 Ndị Ọzọ Na-ahụ Anyị: Ndị ọzọ na-ahụ anyị mgbe anyị na-ebi ndụ otú Jehova kwuru, na-agbakwa mbọ igosipụta àgwà ya. Dị ka ihe atụ, ọ dị otu nwoke nke ndị ya na ha na-arụ ọrụ na-akwa emo maka na ọ dị mkpụmkpụ. Otu nwanna nwanyị nke na-arụ ọrụ n’ọfịs ahụ na-akwanyere ya ùgwù, na-asọpụkwara ya mgbe nile. Nke a mere ka nwoke ahụ jụọ ya ihe mere o ji dị nnọọ iche. Ọ kọwaara nwoke ahụ na ihe mere ya ji asọpụrụ ya bụ maka na ya na-agbaso ụkpụrụ Bible ná ndụ ya. Ọ kọkwaara ya banyere ihe magburu onwe ya anyị na-atụ anya ya, ya bụ, Alaeze Chineke. Nwoke ahụ malitere ịmụ Bible. E mesịa, o nwere ọganihu. E wee mee ya baptizim. Mgbe nwoke ahụ lara n’obodo ya, omume ọma ya masịrị ndị ikwu ya, ọtụtụ n’ime ha natakwara eziokwu.
4 N’ebe anyị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe anyị na ndị ikwu anyị na ndị agbata obi anyị na-emekọ ihe, anyị pụrụ ime ka ndị ọzọ nye Chineke otuto site n’omume ọma anyị na àmà anyị na-agbara ha.—Mat. 5:16.