Nyere Ndị Ọzọ Aka ‘Isi n’Obi Ha Na-erube Isi’
1. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka ndị na-efe ya ofufe?
1 Nrubeisi dị mkpa iji na-efe Jehova n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. (Deut. 12:28; 1 Pita 1:14-16) N’oge na-adịghị anya, ikpe ọmụma Chineke ga-abịakwasị “ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma.” (2 Tesa. 1:8) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka ‘isi n’obi ha na-erube isi’ n’ozizi nke Okwu Chineke?—Rom 6:17.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inyere ndị ọzọ aka ịzụlite okwukwe siri ike?
2 Site n’Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịzụlite Okwukwe na Ịhụnanya: N’Akwụkwọ Nsọ, nrubeisi na okwukwe nwere njikọ chiri anya. Pọl onyeozi kwuru banyere ‘ihe Chineke nke mgbe ebighị ebi nyere n’iwu iji kwalite nrubeisi site n’okwukwe.’ (Rom 16:26) Ná Ndị Hibru isi 11, a kpọtụrụ ọtụtụ ndị gosipụtara okwukwe aha, ọtụtụ n’ime ha gosipụtara okwukwe ha site n’ime ihe ndị kwekọrọ n’uche Jehova. (Hib. 11:7, 8, 17) N’aka nke ọzọ, nnupụisi na enweghị okwukwe nwere njikọ. (Jọn 3:36; Hib. 3:18, 19) Ọ dị anyị mkpa ịzụlite nkà n’ụzọ anyị si eji Okwu Chineke eme ihe iji nyere ndị ọzọ aka ịzụlite ụdị okwukwe nke na-eme ka mmadụ na-erube isi.—2 Tim. 2:15; Jems 2:14, 17.
3. (a) Olee otú nrubeisi na ịhụnanya si nwee njikọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible aka ịmalite ịhụ Jehova n’anya?
3 Nrubeisi na ịhụ Chineke n’anya nwekwara njikọ. (Deut. 5:10; 11:1, 22; 30:16) “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara,” ka 1 Jọn 5:3 na-ekwu, “ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible aka ịmalite ịhụ Jehova n’anya? N’oge unu na-amụ ihe, na-achọ ohere ndị ị ga-eji mee ka ọ na-enwekwu mmasị n’àgwà Jehova. Na-ekwupụta mmetụta dị ukwuu gị onwe gị na-enwe n’ebe Chineke nọ. Nyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka iche echiche otú ya onwe ya ga-esi soro Jehova dị ná mma. Ọ bụ ịhụnanya e nwere n’ebe Jehova nọ ga-akasị akpali ndị ọzọ—nakwa anyị onwe anyị—isi n’obi na-erubere ya isi.—Mat. 22:37.
4. (a) N’ihi gịnị ka ihe nlereanya anyị ji dị mkpa? (b) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji zụlite “obi na-anụ ihe”?
4 Site n’Ihe Nlereanya Anyị: Otu ụzọ katara ahụ́ anyị pụrụ isi gbaa ndị ọzọ ume irube isi n’ozi ọma ahụ bụ site n’ihe nlereanya anyị. Ma, ka anyị wee zụlite “obi na-anụ ihe,” anyị aghaghị ịnọgide na-eme mgbalị. (1 Eze 3:9; Ilu 4:23) Gịnị ka nke a na-agụnye? Na-eme ka ihe ndị dị mma na-abanye n’obi gị site n’ịdị na-amụchi Bible anya ma na-agachi nzukọ anya. (Ọma 1:1, 2; Hib. 10:24, 25) Gbalịa iso ndị obi ha bụ otu n’ezi ofufe na-akpakọrịta. (Ilu 13:20) Na-agachi ozi ubi anya, na-enwe ọchịchọ sitere n’obi inyere ndị nọ n’ókèala unu aka. Na-ekpeku Jehova ekpere ka o nyere anyị aka ịzụlite obi dị mma. (Ọma 86:11) Zere ihe ndị pụrụ imerụ obi gị, dị ka ihe ntụrụndụ ndị a na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ ihe ike na ha. Na-achụso ihe ndị na-eme ka ị na-abịarukwu Chineke nso nakwa ndị na-eme ka mmekọrịta gị na ya na-echikwu anya.—Jems 4:7, 8.
5. Olee otú e si na-agọzi ndị na-erube isi?
5 Jehova mesiri ndị ya nke oge ochie obi ike na ngọzi ga-eru ha ahụ́ ma ha gee ntị n’olu ya. (Deut. 28:1, 2) N’otu aka ahụ taa, Jehova na-agọzi “ndị na-erubere ya isi dị ka onye na-achị achị” n’ụba. (Ọrụ 5:32) Ya mere, ka anyị jiri ozizi anyị na ihe nlereanya anyị nyere ndị ọzọ aka isi n’obi ha na-erube isi.