Na-akọsa Ebube Jehova
1 Ọbụ abụ ahụ kpọsara, sị: “Bụkuonụ Jehova abụ, unu ụwa nile. Kọsaanụ akụkọ ebube Ya n’etiti mba nile, akụkọ oké ọrụ Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche.” Ka anyị na-atụle ihe ndị Jehova mewooro anyị, ihe ndị ọ na-emere anyị, na ihe ndị ọ ka ga-emere anyị, obi anyị na-akpali anyị ịkọsa ebube ya!—Ọma 96:1, 3.
2 N’ozi Anyị: Ndịàmà Jehova nwere ihe ùgwù nke ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha Chineke na nke ito ya n’ihu ọha n’ụwa nile. (Mal. 1:11) Lee nnọọ otú ha si dị iche ná ndị ụkọchukwu nke Krisendọm, bụ́ ndị ji mpako wepụ aha Chineke ná nsụgharị Bible ha! Ebe ọ bụ na ndị mmadụ aghaghị iji okwukwe kpọkuo aha Chineke ka e wee zọpụta ha n’oké mkpagbu na-abịanu, ọ dị oké mkpa ime ka ha mara aha ahụ ugbu a. (Rom 10:13-15) Ọzọkwa, ka udo wee dị n’eluigwe na ala, gụnyere n’etiti ndị bi n’ụwa, aha Chineke aghaghị ịbụ nke e doro nsọ. N’ezie, ọrụ nile nke Chineke nwere ihe jikọrọ ha na aha Chineke.
3 “Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-eto nke ukwuu.” Ma, ka ndị mmadụ wee nwee ike ‘inye Jehova nsọpụrụ aha Ya,’ ha aghaghị ịma ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ya. (Ọma 96:4, 8) Otú ọ dị, ụfọdụ na-ekwu na Chineke adịghị. (Ọma 14:1) Ndị ọzọ na-ekwutọ ya site n’ịsị na ọ dịghị ike, ma ọ bụkwanụ na-ekwu na o nweghị mmasị n’ihe ụmụ mmadụ na-eme. Ka anyị na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka inweta ezi ihe ọmụma banyere Onye Okike anyị, nzube ya, na àgwà ọma ya, anyị na-enye Jehova otuto.
4 Site n’Àgwà Anyị: Ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova na-ewetara ya nsọpụrụ. Ndị mmadụ na-ahụ àgwà ọma anyị. (1 Pita 2:12) Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ịja anyị mma mgbe anyị jiri ejiji dị ọcha ma dị mma n’anya. Nke a na-enye anyị ohere ikwu okwu banyere uru ndị dị n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke. (1 Tim. 2:9, 10) Lee nnọọ obi ụtọ anyị na-enwe mgbe ndị ọzọ ‘na-ahụ ọrụ ọma anyị wee nye Nna anyị nọ n’eluigwe otuto’!—Mat. 5:16.
5 Ka anyị jiri ma okwu ọnụ ma omume anyị na-eto Chineke anyị dị ebube kwa ụbọchị, si otú ahụ na-eme ihe ahụ e ji ọṅụ na-agba anyị ume ime, nke bụ́: “Bụkuonụ Jehova abụ, gọzienụ aha Ya; na-ezisanụ ozi nzọpụta Ya site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ.”—Ọma 96:2.