Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” nke Ndịàmà Jehova nke 2006
1. Olee otú ndị Chineke si gosipụta ekele ha nwere maka ezi ofufe n’oge ochie, ohere dị aṅaa yiri nke ahụ ka anyị nwere taa?
1 Eze Hezekaịa nke Juda oge ochie si n’aka ndị ọgba ọsọ zigara ndị mmadụ n’otu n’otu akwụkwọ ozi ndị o ji kpọọ ha òkù ịgbakọta na Jeruselem. (2 Ihe 30:6, 13) Otú ndị a ọ kpọrọ òkù si meghachi omume mere ka a ghọta otú ha si ele ezi ofufe anya. (2 Ihe 30:10-12) N’ọnwa ndị na-abịanụ, ndị ohu Jehova taa ga-enwe ohere yiri nke ahụ iji gosipụta ekele sitere n’ala ala obi ha nwere maka ihe ùgwù nke ịgbakọta ọnụ iji fee Jehova ofufe. E ziterela unu akwụkwọ ozi e ji na-akpọ unu òkù ịga Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” Olee otú ị ga-esi emeghachi omume banyere akwụkwọ ozi a?
2. Gịnị ka anyị pụrụ ime ugbu a iji rite uru nke ọma ná mgbakọ distrikti a?
2 Malite Ugbu A Kwadowe: Ka anyị wee rite uru nke ọma n’ihe ime mmụọ ndị e ji ịhụnanya na-akwadebere anyị, ọ dị mkpa na anyị ga-anọ ya n’usoro ihe omume ahụ dum. Jiri amamihe malite ugbu a mewe ndokwa ọ bụla dị mkpa iji hụ na gị na ezinụlọ gị gazuru ụbọchị atọ ahụ. (Ilu 21:5) Ndokwa dị otú a pụrụ ịgụnye ịnata onye were gị n’ọrụ ikike iji hapụ ọrụ, iso di gị ma ọ bụ nwunye gị na-abụghị Onyeàmà kwurịta banyere atụmatụ a ị na-eme, ime ndokwa maka ụlọ obibi, na inyere ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible aka ịgazu ụbọchị atọ ahụ. Ahapụla ihe ndị a dị mkpa ruo mgbe oge mgbakọ ruru. Kama nke ahụ, tinye ha n’ekpere mgbe ị na-ekpeku Jehova ekpere, ma tụkwasị Ya obi na ‘ọ ga-eme ya.’—Ọma 37:5.
3. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịkwado ndokwa nile e merela maka inwetara anyị ụlọ obibi?
3 Nzukọ Jehova emeela mgbalị dị ukwuu iji hụ na e nwere ụlọ obibi ga-ezunụ n’obodo ọ bụla a ga-enwe mgbakọ. Ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka mgbalị ụmụnna ndị a dị ike ọrụ ji obi ha nile mee iji nyere anyị aka inweta ụlọ obibi, ọ bụrụkwa na anyị na-echebara ndị ọzọ bịara mgbakọ ahụ echiche ma na-akwanyere ndokwa Chineke ùgwù, nke a ga-akpali anyị ịgbaso ntụziaka ndị e nyere n’isiokwu a.—1 Kọr. 13:5; 1 Tesa. 5:12, 13; Hib. 13:17.
4. Olee ihe ndị dị mkpa anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-arịọ maka ụlọ obibi, ọ bụkwa n’ihi gịnị? (Gụnye ihe e dere n’igbe dị na peeji nke 4.)
4 Ụlọ Obibi: Iji mee ka ị tụsara ahụ́, a ga-eme ndokwa maka ụlọ obibi n’obodo nke ọ bụla a ga-enwe mgbakọ na ya. N’ọtụtụ ala mgbakọ, a na-enye ndị mmadụ ụlọ n’ala mgbakọ, ma ọ́ bụghị ụlọ a rụrụ iji mee ihe ruo nwa oge, ya abụrụ ezigbo ụlọ a rụrụ maka obibi. Biko burunụ n’uche na nzukọ a agaghị enwe ike ịrụ ụlọ obibi ga-ezuru ndị nile bịara mgbakọ. Ọ bụ nanị ndị Ngalaba Ụlọ Obibi nyere ụlọ n’ala mgbakọ kwesịrị ibi na ya. Ma, n’ihi nnukwu ego ọ na-efu iji lekọta ụlọ ndị a, a na-agba ndị e nyere ụlọ n’ala mgbakọ ume iji mmesapụ aka nye onyinye ego maka ụlọ ahụ e nyere ha. Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ebe ọzọ, i kwesịrị ikwenyere Ngalaba Ụlọ Obibi ma biri n’ụlọ e nyere gị. Chetakwa na ọ pụrụ ifutụ gị ego iji na-abịa n’ala mgbakọ ma na-ala kwa ụbọchị. Ọ dịkwa mkpa na ị ga-enye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. N’ihi ya, ọ dị mkpa iburu ihe ndị a n’uche mgbe ị na-akpakọ ego ị ga-eji aga mgbakọ distrikti a. (1 Kọr. 16:1-4; 2 Kọr. 9:7) Tupu i dejupụta fọm Room Request, tụleghachi isi ihe ndị dị n’igbe bụ́ “Otú E Si Enweta Ụlọ Obibi.”
5, 6. Olee otú a pụrụ isi lebara ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche anya?
5 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ilu 3:27 na-ekwu, sị: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.” Olee otú ị pụrụ isi meere ndị ọzọ ihe ọma n’ihe banyere mgbakọ distrikti a? Enyemaka pụrụ ịdị ndị nkwusa merela agadi, ndị nke na-adịkwaghị ike, ndị nọ n’ozi oge nile, na ndị ọzọ mkpa n’ihe banyere ụgbọ njem ma ọ bụ ụlọ obibi. Ọ bụ ndị ikwu ha ka ọ kasị dịrị n’aka igbo mkpa ha. (1 Tim. 5:4) Ọ bụrụ na ndị ikwu ha apụghị igbo mkpa ha, ndị kwere ekwe ibe ha nwere ike inyere ha aka. (Gal. 6:10) Ndị nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ịchọpụta ma ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche nọ n’ìgwè ọmụmụ ihe ha hà emeekwala ndokwa nile dị mkpa n’ezi oge tupu mgbakọ ahụ eruo.
6 Ndị ga-edejupụta akụkụ e mere maka ndị nwere mkpa pụrụ iche na fọm Room Request bụ nanị ndị nkwusa ndị òtù ezinụlọ ha ma ọ bụ ọgbakọ ha na-apụghị igboro mkpa ụlọ obibi. Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị iji ntụziaka e depụtara na fọm ahụ tụlee ma onye nkwusa ahụ ò ruru eru inweta ụdị enyemaka a. Ndokwa a bụ nanị maka ndị nkwusa na-esetịpụ ezi ihe nlereanya, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà.
7. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịga mgbakọ e kenyere ọgbakọ anyị ịga? (b) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọnọdụ anyị emee ka ọ dị mkpa na anyị ga-aga mgbakọ ọzọ?
7 Ije Mgbakọ Ọzọ: Iji hụ na e nwere oche, akwụkwọ, ụlọ obibi, na ihe ndị ọzọ otú ọ ga-ezuru ndị bịara mgbakọ, a na-agba ndị nkwusa ume ịga mgbakọ e kenyere ọgbakọ ha. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị emee ka ọ dị mkpa na ị ga-aga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ gị ịga, biko gakwuru odeakwụkwọ ọgbakọ unu ka o nye gị adres ị ga-eji ezigara mgbakọ ahụ ị chọrọ ịga akwụkwọ. E depụtara adres ndị ahụ n’azụ fọm Room Request. Ọ bụrụ na a ga-enwe mgbakọ abụọ ma ọ bụ karịa n’obodo ahụ, jide n’aka na i dere akara ụbọchị a ga-enwe mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
8. Olee otu ụzọ anyị pụrụ isi soro mee ka e nwetakwuo ọṅụ ná mgbakọ distrikti a na-abịanụ?
8 Ndị Ọrụ Afọ Ofufo: Obi abụọ adịghị ya na ndị nile ga-aga mgbakọ a ma rite uru ná nri ime mmụọ nakwa ná mkpakọrịta na-ewuli elu a ga-enwe na ya, ga-enweta ọṅụ dị ukwuu. Obi ụtọ anyị ga-akadị ehi nne ma ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị n’afọ ofufo iji nye aka n’ọrụ ndị a ga-arụrịrị iji mee ka mgbakọ a gaa nke ọma. (Ọrụ 20:35) Kọmitii Mgbakọ dị n’obodo unu ga-amalite n’oge na-adịghị anya ịkpọ ndị ọzọ iso ha rụọ ọrụ a. Ị̀ ga-ewepụtali onwe gị iso rụọ ya?—Ọma 110:3.
9. Olee ihe na-atọ gị ụtọ banyere mgbakọ distrikti a anyị na-enwe otu ugboro n’afọ, oleekwa ihe i kwesịrị ikpebisi ike ime?
9 Ka otu nwatakịrị nwoke dị afọ ise na-aga mgbakọ distrikti, o kwuru, sị: “Mgbakọ distrikti bụ ihe kasị atọ m ụtọ n’ofufe Jehova.” Okwu ahụ nwatakịrị a ji obi ya nile kwuo na-enyere anyị nile aka ịghọta ókè anyị na-enweru ọṅụ ma anyị gaa mgbakọ distrikti a anyị na-enwe otu ugboro n’afọ. Ọ na-adị nnọọ dị ka ọbụ abụ ahụ si bụọ ya. Ọ bụrụ, sị: “Otu ụbọchị n’ogige Gị nile dị mma karịa [otu puku ụbọchị] n’ebe ọzọ.” (Ọma 84:10) Devid ji abụ gosi ọchịchọ o nwere ‘ibi n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ ya iji nwee ike ịjụta ihe n’ụlọukwu ya.’ (Ọma 27:4) Ọ tọrọ Devid ụtọ nke ukwuu iso ná ndị na-efe Jehova ofufe. Ka anyị nwee ụdị ekele Devid nwere maka ezi ofufe site n’ịgazu ụbọchị atọ nke Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!”
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday 9:20 ụtụtụ - 4:55 uhuruchi
Saturday 9:00 ụtụtụ - 4:05 uhuruchi
Sunday 9:00 ụtụtụ - 3:40 uhuruchi
Igbe dị na peeji nke 4]
Otú E Si Enweta Ụlọ Obibi
1. Nata odeakwụkwọ ọgbakọ unu fọm Room Request.
2. Dejupụta fọm Room Request ahụ n’ezi oge. Biko hụ na i dere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, nakwa ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ụlọ obibi ọ̀ bụ ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ.
3. Odeakwụkwọ kwesịrị inyocha fọm Room Request ahụ iji mara ma ì dejupụtara ya nke ọma. Ọ bụrụ na i dejupụtara ya nke ọma, o kwesịrị ịbịanye aka na ya ma ziga ya n’obodo a ga-enwe mgbakọ ahụ, Ọ BỤGHỊ N’ALAKA ỤLỌ ỌRỤ. Nke a bụ n’ihi na e nwere ike fọm ahụ agaghị eru n’oge ma e si n’alaka ụlọ ọrụ ziga ya.
4. Agwala onye nwe ụlọ ka ị kwụọ ya ego karịrị nke ya na Ngalaba Ụlọ Obibi kwekọrịtara ka i wee nweta ụlọ ahụ.
5. Mgbe i ji aka gị na-achọ ụlọ obibi, biko chọpụta ma Ngalaba Ụlọ Obibi ò kwuola okwu ụlọ ahụ iji zere inweta ụlọ ha kwurula okwu ya.
Biko
◼ Were ụlọ Ngalaba Ụlọ Obibi nyere gị. Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ebe Ngalaba Ụlọ Obibi nyere gị. Ekwela ka ọnụ ọgụgụ ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru.
◼ Agala n’ebe ndị nwe ụlọ e nyere gị na-achọghị ka ndị mmadụ na-aga. Sie nri nanị ma ọ bụrụ na e nyere gị ikike ime otú ahụ, siekwa ya nanị n’ebe a kwadoro ka ị nọrọ sie ya.
◼ I kwesịrị izigara Ngalaba Ụlọ Obibi fọm Room Request n’ezi oge. Nke a ga-eme ka Ngalaba Ụlọ Obibi nwee nnọọ oge ha ga-eji chọtara gị ụlọ dị mma.
◼ I kwesịrị ide ihe nile ị ga-ede na fọm Room Request nke ọma otú a ga-agụta ihe i dere.