Kụziere Ndị Dị Umeala n’Obi Ije Ije n’Ụzọ Chineke
1. Gịnị ka ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-agụnye?
1 E kwuru na ndị na-eso ụzọ Kraịst na narị afọ mbụ bụ ndị òtù nke “Ụzọ Ahụ.” (Ọrụ 9:2) Ezi Iso Ụzọ Kraịst na-emetụta ihe nile mmadụ na-eme ná ndụ. (Ilu 3:5, 6) N’ihi ya, mgbe anyị na-eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible, ọ dị anyị mkpa ime ihe karịrị nanị ime ka ha nweta ezi ihe ọmụma nke ozizi Bible. Anyị aghaghịkwa inyere ndị anyị na-amụrụ Bible aka ije ije n’ụzọ Jehova.—Ọma 25:8, 9.
2. Olee ihe pụrụ ịkpali onye a na-eduziri ọmụmụ Bible idebe iwu Chineke?
2 Inwe Ịhụnanya n’Ebe Jehova na Jizọs Nọ: Lee ka o si bụụrụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè nnukwu ihe ịma aka ime ka echiche ha, àgwà ha, okwu ọnụ ha, na omume ha kwekọọ n’uche Chineke! (Rom 7:21-23; Efe. 4:22-24) Otú ọ dị, ịhụnanya ndị dị umeala n’obi nwere n’ebe Chineke na Ọkpara ya nọ na-akpali ha imeri ihe ịma aka ndị a. (Jọn 14:15; 1 Jọn 5:3) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible aka inwe ịhụnanya a?
3. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-eduziri ọmụmụ ihe aka inwe ịhụnanya n’ebe Jehova na Jizọs nọ?
3 Nyere onye ị na-eduziri ọmụmụ ihe aka ịmata ụdị onye Jehova bụ. Otu nwanna nwoke kọwara, sị, “Ndị mmadụ apụghị ịhụ onye ha na-amaghị n’anya, n’ihi ya, site n’oge mbụ m malitere ịmụrụ ha ihe, ana m eji Bible akụziri ha ihe bụ́ aha Chineke, ana m achọkwa ohere iji mee ka ha ghọta àgwà Jehova.” Ịkọwara ha ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ bụ ụzọ magburu onwe ya isi mee nke a. (Jọn 1:14; 14:9) Tụkwasị na nke ahụ, jiri igbe ntụleghachi dị ná ngwụsị nke isiakwụkwọ ọ bụla n’akwụkwọ Bible na-akụzi nyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka ịtụgharị uche n’àgwà ndị magburu onwe ha Chineke na Ọkpara ya nwere.
4. (a) N’ihi gịnị ka ikwusa ozi ọma ji esiri ọtụtụ ndị anyị na-eduziri ọmụmụ ihe ike? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-eduziri ọmụmụ ihe aka ịmalite ịga ozi ọma?
4 Na-ezi Ihe Site n’Isetịpụ Ihe Nlereanya: Ebe anyị bụ ndị nkụzi na ndị nduzi, anyị na-eji omume anyị egosi ndị ọzọ ihe ije ije n’ụzọ Chineke pụtara. (1 Kọr. 11:1) Dị ka ihe atụ, ọ maghị ihe ka ọtụtụ ná ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible ahụ́ ịgakwuru ndị ha na-amaghị iji kọọrọ ha ihe ndị ha kweere. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị mkpa na anyị ga-eji ndidi na nkà nyere ha aka ịzụlite ịhụnanya, okwukwe, na obi ike a chọrọ iji kere òkè n’ọrụ ikwusa ozi ọma na nke ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (2 Kọr. 4:13; 1 Tesa. 2:2) Ọchịchọ anyị nwere iduzi ndị anyị na-amụrụ ihe ga-akpali anyị isoro ha rụkọọ ọrụ n’oge mbụ ha malitere ịga ozi ọma.
5. Olee otú ezi ihe nlereanya si enyere ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible aka ịhụ ihe idebe iwu Chineke gụnyere?
5 Ihe nlereanya gị pụrụ ịkụziri ndị ị na-eduziri ọmụmụ ihe ihe n’akụkụ ndị ọzọ dị mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Mgbe ị na-eleta ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe i ji obi gị nile na-ekele ndị ọzọ ná nzukọ ọgbakọ, ha na-ahụ ka ị na-egosipụta ịhụnanya. (Jọn 15:12) Mgbe i so debe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma ọ bụ nyere ndị ọzọ aka, ị na-akụziri ha otú e si ejere ndị ọzọ ozi. (Jọn 13:12-15) Mgbe ha hụrụ na ị na-ebi ndụ dị mfe, ha na-aghọta ihe ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ’ pụtara.—Mat. 6:33.
6. Gịnị ka inyere ndị ọzọ aka ijere Jehova ozi na-arụpụta?
6 Ọrụ ịkụziri ndị ọzọ Okwu Chineke na ime ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-achọ mgbalị dị ukwuu. Ma, lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ka ndị dị umeala n’obi ‘na-anọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ’!—3 Jọn 4.