Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Apr. 15
“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile kweere na otu n’ime isi ihe ndị na-eme ka e nwee obi ụtọ n’ime ezinụlọ bụ inwe ezi nkwurịta okwu. N’agbanyeghịkwa nke ahụ, ọ na-esiri ọtụtụ mmadụ ike iso ndị ọzọ na-ekwurịta okwu nke ọma. Olee ihe i chere kpatara ya? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụ aro banyere otú a pụrụ isi malite iso ndị ọzọ na-enwe ezi nkwurịta okwu.” Gụọ Jems 1:19.
Ụlọ Nche May 1
“Ịda ogbenye na-echi ọtụtụ nde mmadụ ọnụ n’ala n’ụwa nile. Olee ihe i chere e nwere ike ime iji nyere ha aka? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ 1 Pita 2:21.] Magazin a na-akọwa otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs n’ichebara ndị ogbenye echiche.”
Teta! Apr.–June
“Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na obe na-enyere ha aka ịbịarukwu Chineke nso. Ma, ụfọdụ na-eche, sị: Ò kwesịrị ekwesị ka a na-efe ihe e ji kpọgbuo Jizọs ofufe? Jizọs ọ̀ nwụrụ n’elu obe n’eziokwu? Isiokwu nke malitere na peeji nke 30 tụlere ihe bụ́ echiche Bible banyere ajụjụ ndị a.” Gụọ Ọrụ 5:30.
“Ọtụtụ n’ime anyị, bụ́ ndị nwere ndị ikwu na ibe merela agadi, na-adị eche otú anyị pụrụ isi nyere ha aka imeri ihe ịma aka nke ime agadi? Ọ́ bụghị eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a tụrụ aro ihe ndị anyị pụrụ ime iji hụ na oge agadi abụchaghịrị anyị nsogbu. Ọ kọwakwara otú a ga-esi emezu amụma a.” Gụọ Job 33:25.