Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze—Akụkụ Dị Mkpa nke Ozi Dị Nsọ
1. Ụlọ Nzukọ Alaeze ole ka a rụtarala, oleekwa mkpa a ka nwere?
1 N’ime afọ ise gara aga, a rụọla Ụlọ Nzukọ Alaeze dị otu puku, narị abụọ na ise, n’ókèala alaka ụlọ ọrụ Nigeria na-elekọta. Anyị ji obi anyị nile na-ekele Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ndị nile nyeere ha aka, maka nnukwu ọrụ a ha rụrụ. Ọ bụ ezie na a rụpụtala ihe dị ukwuu, a ka nwekwara ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a ka ga-ewu. Olee otú anyị nile pụrụ isi kwadoo akụkụ a dị mkpa nke ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova?—Mkpu. 7:15.
2. Olee otú anyị pụrụ isi kwadoo ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze?
2 Dị Njikere Inye Aka: Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa rurula afọ 17 ma ọ bụ karịa nke na-enweghị nsogbu n’ọgbakọ, anyị na-agba gị ume iwepụta onwe gị iji soro Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze rụọ ọrụ mgbe ha na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ma ọ bụ mgbe ha na-ewu nke ọgbakọ ndị dị unu nso. N’agbanyeghị na ọ dịghị mkpa itinye akwụkwọ maka ya, ọ bụ nanị ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro ka e nwere ike ịkpọ ka ha soro rụọ ọrụ mgbe a na-ewuru ọgbakọ ndị dị unu nso Ụlọ Nzukọ Alaeze. (Ọma 110:3) Ndị nile wepụtara onwe ha ga-adịrịrị njikere ịrụ ọrụ ma nwee mmụọ nke imekọ ihe ọnụ. (Ọma 133:1) A sịgodị na i nweghị nkà n’iwu ihe owuwu, ị ka nwere ike inye aka iji hụ na ihe owuwu ahụ gara nke ọma. I nwekwara ike ịmụta ihe ga-eme ka e jiri gị rụkwuo ọrụ n’ọdịnihu.
3. Olee ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwado ndokwa a?
3 Ọ bụrụ na i nweghị ike iwepụta onwe gị iso rụọ ọrụ, i nwere ike igosi na ị na-akwado ọrụ ahụ site n’ịgba ndị wepụtaliri onwe ha iso rụọ ya ume. I nwere ike ịrụchitere ndị wepụtara onwe ha iso wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ọrụ e kenyere ha ịrụ n’ọgbakọ. Site n’ime nhazi tupu oge eruo, ndị okenye pụrụ ịhụ na ihe nọgidere na-aga nke ọma n’ọgbakọ mgbe ụfọdụ ndị gara sonye n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Obi abụọ adịghị ya na obi na-adị Jehova ụtọ mgbe anyị rụkọrọ ọrụ ọnụ iji hụ na ihe ndị metụtara Alaeze na-aga n’ihu.—Hib. 13:16.
4. Olee ụzọ anyị pụrụ isi na-agba ndị so ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ume?
4 Na-agba Ha Ume: Ka e wee nwee ike ịrụ ebe a na-anọ efe ofufe, ọ chọrọ oge dị ukwuu na ịrụsị ọrụ ike. Ebe ọ dị otú ahụ, o doro nnọọ anya na ndị wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo ogologo oge agaghị na-anọ n’ọgbakọ ha mgbe ụfọdụ. Ka anyị na-adị ngwa n’ịja ndị wepụtara onwe ha iso wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze mma nakwa n’ịgba ha ume n’ihi àjà ndị ha chụrụ iji na-arụ “ọrụ a dị mkpa.”—Ọrụ 6:3; Rom 14:19.
5. Olee otú ndị so ewu ihe owuwu pụrụ isi gosi na ha na-edebe ihe n’ọnọdụ kwesịrị ya?
5 Na-edebe Ihe n’Ọnọdụ Kwesịrị Ya: Ọrụ bụ́ isi Chineke nyere anyị bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mak 13:10) N’ihi nke a, Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-agbalị ịhazi ọrụ nke ọma ka ha wee nwee ike ịdị na-eso ọgbakọ ha eje ozi ruo ókè o kwere mee. N’otu aka ahụ, ndị wepụtara onwe ha iso wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze na-agbalịsikwa ike ịhụ na ha na-edebe nke ọ bụla n’ime ọtụtụ ibu ọrụ ha nwere n’ọnọdụ kwesịrị ya. Dị ka ihe atụ, ha adịghị ekwe ka ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze gbochie ha ịga mgbakọ ukwu na nke nta. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ n’oge a na-ewuru ha Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị nkwusa ga-agba mbọ ịhụ na ha so jee ozi ọma, sorokwa n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ.
6. Gịnị ka a na-arụzu mgbe onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ jikọrọ aka ọnụ iji mee ka ezi ofufe na-aga n’ihu?
6 Pọl onyeozi kọwara ndị nọ n’ọgbakọ dị ka ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ “ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.” (Efe. 4:16) Ịhụnanya anyị nwere maka Jehova na ezi ofufe na-akpali anyị ịrụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na e kwusara ozi ọma ahụ na iji kwado ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.