Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche June 15
“Ì chere na ọ ga-ekwe anyị omume inwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-eme ka anyị mara otu ebe anyị ga-esi nweta nduzi ga-enyere anyị aka ịnagide nsogbu ndị anyị na-enwe ná ndụ. Ọ kọwakwara otú mmadụ inwe ezi olileanya si eme ka o nweta ike.” Gụọ Mkpughe 21:3, 4.
Ụlọ Nche July 1
“N’ụwa anyị a jupụtara ná nsogbu, ọtụtụ mmadụ na-ajụ, sị: ‘N’ihi gịnị ka ndụ ji jupụta nnọọ ná nsogbu? Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị ji ya ime ka nhụjuanya kwụsị kpamkpam?’ Ò nwetụla mgbe i chere otú ahụ? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a kọwara azịza doro anya Bible nyere banyere ajụjụ ndị a.” Gụọ 2 Timoti 3:16.
Teta! Apr.–June
“Ọtụtụ mmadụ na-agba mbọ inweta obi ụtọ, ma o yiri ka ọ̀ bụ mmadụ ole na ole na-achọta ya. Ì chere na ọ dị otu n’ime ihe ndị e depụtara ebe a nke ga-enyere mmadụ aka inwekwu obi ụtọ ná ndụ? [Gosi ya igbe dị na peeji nke 9. I gosichaa ya, gị agụọ otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e hotara na ya.] Teta! a tụlere ntụziaka ndị dabeere na Bible, bụ́ ndị na-eme ka e nwee ezi obi ụtọ.”