Mee Ka Ha Ghọta Ma Nwee Ekele Maka Àgwà Jehova Ndị Na-enweghị Atụ
1 Mgbe anyị na-ezi ozi ọma, ihe anyị na-eme abụghị nanị ịkụziri ndị mmadụ eziokwu Bible ndị bụ́ isi. Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmata ụdị onye Jehova bụ na ịghọta ma nwee ekele maka àgwà ya ndị na-enweghị atụ. Mgbe ndị nwere obi eziokwu mụtara ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke, ọ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ha, ọ na-akpalikwa ha ịgbanwe ndụ ha iji “na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.”—Kọl. 1:9, 10; 3:9, 10.
2 Akwụkwọ Ọhụrụ Anyị Ji Eduzi Ọmụmụ Bible: Malite n’isi mbido ya, akwụkwọ Bible Na-akụzi na-eme ka anyị mata àgwà Jehova. Isi nke mbụ zara ajụjụ ndị bụ́: Chineke ọ̀ na-eche banyere gị n’ezie?, Olee ụdị onye Chineke bụ? na À pụrụ ịbịaru Chineke nso? Isiakwụkwọ ahụ na-emekwa ka ịdị nsọ Jehova (para. 10), ikpe ziri ezi na ọmịiko ya (para. 11), ịhụnanya ya (para. 13), ike ya (para. 16), ebere ya, amara ya, njikere ọ dị ịgbaghara mmehie, ndidi ya, na iguzosi ike n’ihe ya (para. 19), pụta ìhè. Paragraf nke 20 si otú a chịkọta ya: “Ka ị na-amụkwu banyere Jehova, otú ahụ ka ọ ga-abụwanye onye dị adị nye gị, otú ahụkwa ka ị ga-enwekwu ihe mere ị ga-eji hụ ya n’anya ma bịaruo ya nso.”
3 Olee otú anyị pụrụ isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi nyere ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible aka ịbịaru Jehova nso? Mgbe anyị tụlesịrị paragraf mere ka otu n’ime àgwà Chineke pụta ìhè, anyị nwere ike ịjụ onye ahụ anyị na-amụrụ ihe, sị, “Gịnị ka nke a na-agwa gị banyere ụdị onye Jehova bụ?” ma ọ bụ “Olee otú nke a si egosi na Chineke nwere mmasị n’ebe gị onwe gị nọ?” Ọ bụrụ na anyị ana-ajụ ndị anyị na-amụrụ ihe ajụjụ ndị dị otú ahụ mgbe ụfọdụ, anyị na-akụziri ha ịdị na-echebara ihe ndị ha na-amụta echiche, anyị na-enyekwara ha aka ịghọtakwu na inwekwu ekele maka àgwà Jehova ndị na-enweghị atụ.
4 Jiri Igbe Ntụleghachi Na-eme Ihe: Mgbe unu mụsịrị isiakwụkwọ nke ọ bụla, gwa onye ị na-amụrụ ihe ka o jiri okwu nke aka ya kọwaa nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ dị n’igbe bụ́ “Ihe Ndị Bible Na-akụzi.” Dọrọ uche ya gaa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Iji mata ihe onye ahụ ị na-amụrụ ihe bu n’obi, i nwere ike ịjụ ya mgbe ụfọdụ, sị, “Olee ihe i chere banyere ihe Bible na-akụzi n’okwu a?” Site n’ime otú ahụ, ọ bụghị nanị na ị na-emesi isi ihe dị n’isiakwụkwọ ahụ ike, kamakwa ị na-aghọta ihe onye ahụ ị na-amụrụ ihe kweere n’ezie. Nke a ga-enyere ya aka ịmalite iso Jehova na-emekọrịta ihe.