Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/06 p. 1
  • Akwụkwọ Ozi Sitere n’Alaka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Ozi Sitere n’Alaka
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Iji Obi Ekele Na-elekwasị “Ụlọ Chineke” Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 9/06 p. 1

Akwụkwọ Ozi Sitere n’Alaka

Ezi Ndị Nkwusa Alaeze:

N’afọ ije ozi 2006, e guzobere ọgbakọ mbụ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na Nigeria, ọgbakọ ahụ nwekwara ndị okenye 2, ndị ohu na-eje ozi 2, ndị nkwusa 15, na ndị ọsụ oge nile 12. Obi dị anyị ụtọ ikele ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị ji ịhụnanya kwadoo ndokwa a site n’ịmụ asụsụ ndị ogbi iji nyere ndị ntị chiri aka.

Ebe ọzọ anyị nwere nnọọ ọganihu n’afọ ije ozi gara aga bụ n’akwụkwọ ndị anyị na-ebipụta. Tụkwasị na magazin Ụlọ Nche na Teta! ndị e ji eje ozi ná mba a, bụ́ ndị anyị na-ebipụta, anyị na-ebipụtazi broshuọ na traktị. N’oge gara aga, a na-esi ná mba ofesi atụbata akwụkwọ ndị a, mgbe ụfọdụkwa, ha na-akọ ụkọ ruo ogologo oge n’ihi ogologo oge ọ na-ewe iji tụbata ha. Ma, n’ihi ndokwa ọhụrụ a, anyị nwere olileanya na ọgbakọ ga na-enweta akwụkwọ ndị a ngwa ngwa ha tụrụ ọda ya.

Owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze anọgidela nnọọ na-ewetara aha Jehova otuto. N’afọ ije ozi gara aga, ná nkezi, e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze isii n’ime izu ọ bụla. A rụchakwara Ụlọ Mgbakọ anọ.

Otu nwanyị na-adịghị achọbu iji anya ahụ Ndịàmà Jehova n’Ebonyi Steeti, gbanwere otú o si ele Ndịàmà anya mgbe ọ hụrụ ịdị n’otu na ịhụnanya dị n’etiti ha mgbe ha na-arụ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. Ugbu a, ọ na-abịa nzukọ nile.

Anyị na-arịọ ka unu nọgide na-arịọ maka ngọzi Jehova n’ọrụ anyị, ka anyị na-atụ anya oge ‘onye ahụ na-anọkwasị n’ịnyịnya ọcha,’ bụ́ Jizọs Kraịst, ga-etipịasị ọrụ ọjọọ nile nke Setan n’oge na-adịghị anya.—1 Jọn 3:8; Mkpu. 6:2.

Ụmụnna unu,

Alaka Ụlọ Ọrụ Nigeria

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya