Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/06 p. 1
  • Olee Ihe Ị Na-ebute Ụzọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ihe Ị Na-ebute Ụzọ?
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ị̀ Hụrụ M n’Anya Karịa Ihe Ndị A?”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ekwela Ka Ihe Ọ bụla Mee Ka Ị ghara Ịnọ Jehova Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Jiri Oge Gị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya
    Ozi Alaeze Anyi—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 10/06 p. 1

Olee Ihe Ị Na-ebute Ụzọ?

1 Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ahụ? N’ezie, ọ na-agụ anyị nile agụụ ibute ihe ndị metụtara Alaeze Chineke ụzọ. (Mat. 6:33) Ma, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Mkpebi ndị m na-eme hà na-egosi na ọ bụ ya ka m na-ebute ụzọ?’ Bible na-agba anyị ume, sị: “Nọgidenụ na-anwapụta ihe unu onwe unu bụ.” (2 Kọr. 13:5) Olee otú anyị pụrụ isi gosi onwe anyị na anyị na-ebute Alaeze ahụ ụzọ?

2 Oge Anyị: Anyị nwere ike ịmalite site n’inyocha otú anyị si eji oge anyị eme ihe. (Efe. 5:15, 16) Oge há aṅaa ka anyị na ndị enyi anyị ji anọkọ, oge há aṅaa ka anyị ji ekiri televishọn, achọ ihe n’Intanet, ma ọ bụ atụrụ ndụ? Ọ bụrụ na anyị edetuo awa ole anyị ji eme ihe ndị ahụ n’akwụkwọ ma jiri ha tụlee awa ole anyị ji eme ihe ndị metụtara ofufe Chineke, ihe anyị ga-achọpụta nwere ike ịtụ anyị n’anya. Ànyị na-eji oge anyị kwesịrị iji mee ihe ndị metụtara ofufe Chineke arụ ọrụ ruo ogologo oge nanị ka anyị wee nwee ike inweta ego anyị ga-eji zụọ ihe ndị dị oké ọnụ? Ugboro ole ka anyị na-agha ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma iji nwee ike ime njem ntụrụndụ ná ngwụsị izu?

3 Na-ebute Ihe Ndị Ka Mkpa Ụzọ: Ọtụtụ n’ime anyị enweghị oge ga-ezuru ha iji mee ihe nile ha gaara achọ ime. Ya mere, iji bute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ, ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ ma wepụta oge iji mee “ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10) Ihe ndị a na-agụnye ịmụ Okwu Chineke, ịga ozi ọma, ilekọta ezinụlọ anyị, na ịga ọmụmụ ihe. (Ọma 1:1, 2; Rom 10:13, 14; 1 Tim. 5:8; Hib. 10:24, 25) Ihe ndị ọzọ, dị ka imega ahụ́ ruo ókè kwesịrị ekwesị na ụdị ntụrụndụ dị mma, bakwara uru. (Mak 6:31; 1 Tim. 4:8) Ma e kwesịrị idebe ihe ndị a na-adịghị oké mkpa n’ọnọdụ kwesịịrị ha.

4 Otu nwanna nwoke ka na-eto eto kpebiri ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ site n’ịmalite ozi oge nile kama ịga gụkwuo akwụkwọ iji nwee ike inweta ezigbo ọrụ. Ọ mụtara asụsụ ọzọ ma kwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu. O kwuru, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ ebe a. Ozi ọma na-enye m nnọọ ume ọhụrụ! Ọ dị m nnọọ ka onye ọ bụla na-eto eto jee ozi yiri nke a ma nwee ụdị afọ ojuju m na-enwe. O nweghị ihe dị mma karịa iji ihe nile anyị nwere jeere Jehova ozi.” N’eziokwu, ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ na-ewetara anyị ngọzi, ma nke ka mkpa bụ na ọ na-enye Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, obi ụtọ.—Hib. 6:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya