Anyị Nile Pụrụ Iso Mee Ka Mmadụ Ghọọ Onye Na-eso Ụzọ Kraịst
1 Ọ bụrụ na mmadụ aghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ bụghị nanị otu onye mere ka ọ ghọọ ya. Jehova nwere ike iji ndị nile ‘ya na ha na-arụkọ ọrụ’ nyere ndị a na-amụrụ Bible aka ito n’ụzọ ime mmụọ. (1 Kọr. 3:6-9) Ọ bụghị nanị azịza onye ọ bụla n’ime anyị na-eji obi ya aza ná nzukọ ọgbakọ ka anyị ji enyere ndị ọhụrụ aka, kama anyị na-ejikwa àgwà ọma anyị, bụ́ nke na-egosi n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè na mmụọ Chineke na-arụ ọrụ ná ndụ anyị, enyere ha aka. (Jọn 13:35; Gal. 5:22, 23; Efe. 4:22, 23) Olee ihe ndị anyị pụrụ imekwu iji nyere ndị ọhụrụ aka?
2 Otú Ọgbakọ Pụrụ Isi Nye Aka: Anyị nile pụrụ igosi na anyị nwere mmasị n’ebe ndị malitere ịbịa ọmụmụ ihe ọhụrụ nọ site n’ịga kelee ha ma soro ha kwurịta okwu tupu ọmụmụ ihe amalite, nakwa mgbe a gbasachara. Otu nwoke kọrọ ihe merenụ n’ụbọchị mbụ ọ gara ọmụmụ ihe, sị: “Ndị nwere ezi ịhụnanya m matara n’otu ụbọchị ahụ, bụ́kwanụ ndị m na-amabughị, karịrị ndị nke m matara na chọọchị m na-aga kemgbe a mụrụ m. Ọ bịara doo m anya na achọtala m eziokwu ahụ.” E mere ya baptizim ọnwa asaa ọ gasịrị ọmụmụ ihe nke mbụ ya.
3 Jiri obi gị nile jaa onye a na-amụrụ Bible mma ma o nwee ọganihu n’ọgbakọ. À na-emegide ya ma ya akwụsie ike? Ọ̀ na-abịachi ọmụmụ ihe anya? Ò ji obi ike zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe? Ò denyela aha ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Jaa ya mma maka ọganihu ọ na-enwe. Nke a ga-eme ka obi ruo ya ala, ọ ga-agbakwa ya ume.—Ilu 25:11.
4 Ihe Ị Ga-eme Dị Ka Onye Na-eduziri Mmadụ Ọmụmụ Bible: Ụfọdụ ndị nkwusa enyerela ndị ha na-amụrụ Bible aka ịmata ndị nọ n’ọgbakọ ha site n’ịkpọrọ ndị nkwusa ọzọ gaa duziere onye ahụ ọmụmụ ihe. Ngwa ngwa o kwere mee, gwa onye ahụ ị na-amụrụ ihe ka ọ malite ịbịa nzukọ anyị. Ọ bụrụ na ọ malite ịbịa nzukọ, gbalịa hụ na i mere ka ndị ọzọ mara ya. Ọ̀ na-agbalị ịhapụ otu àgwà ririla ya ahụ́, dị ka ise siga? Ọ̀ dị onye si n’ezinụlọ ya nke na-achọghị ka ọ na-amụ ihe ahụ ọ na-amụ? Ọ pụrụ irite uru ma ọ bụrụ na ya na onye nkwusa nwerela otu nsogbu ahụ ma mesịa merie ya ekwurịta okwu.—1 Pita 5:9.
5 Ihe onye ọhụrụ chọrọ bụ nkwado nke ndị nọ n’ọgbakọ. Anyị nile nwere ike inyere ha aka inwe ọganihu site n’igosi ha na anyị nwere ezigbo mmasị n’ebe ha nọ.