Gịnị Ka Ị Ga-eji Ndụ Gị Mee?
1 Mgbe ụfọdụ, a na-ajụ ụmụntakịrị, sị, “Gịnị ka ị ga-achọ ịbụ ma i too?” A sị na a jụrụ gị ajụjụ a mgbe ị ka bụ nwatakịrị nwoke, ị̀ gaara ekwu na ị ga-achọ ịbụ onye na-agba bọl? Ka ọ̀ bụ dọkịta? Ka ọ̀ bụ onye nlekọta sekit? Ma ọ bụkwanụ, a sị na a jụrụ gị ajụjụ a mgbe ị ka bụ nwatakịrị nwanyị, ị̀ gaara ekwu na ị ga-achọ ịbụ onye nkụzi? Ka ọ̀ bụ nọọsụ? Ka ọ̀ bụ onye na-arụ ọrụ na Betel? Ugbu a ị na-abụkwaghị nwata, ị ghaghị ịjụ onwe gị ajụjụ ọzọ, ya bụ, ‘Gịnị ka m ga-eji ndụ m mee?’ Ị̀ dị njikere ikpebi ya ugbu a?
2 Iji nyere gị aka ime mkpebi kasị mma, nzukọ Jehova emepụtala vidio aha ya bụ Young People Ask—What Will I Do With My Life? n’ụdị DVD. Biko kirie ya, ma chebara ihe nile e gosiri na ya ezigbo echiche, gụnyere ihe nkiri, ajụjụ ọnụ, nakwa ihe ndị ọzọ e gosiri na ya. E depụtara ihe ndị dị n’ime ya n’igbe bụ́ “Main Menu” [Ihe Ndị Dị na Ya].
3 Ihe Nkiri: Ka ị na-ekiri akụkụ bụ́ ihe nkiri (Drama), chọta azịza nke ajụjụ ndị a: (1) Olee otú ọnọdụ Andre si yie nke Timoti, bụ́ onye e kwuru banyere ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst? (Ọrụ 16:1; 1 Tim. 4:8; 2 Tim. 1:5) (2) Olee otú e si rụgide Andre ịbụ ọkasị ibe n’ịgba ọsọ, ònye rụgidere ya? (3) Olee ndị nyeere Timoti aka ime nhọrọ dị mma, oleekwa otú ha si nyere ya aka? (2 Tim. 1:1-4; 3:14, 15) Olee ndị nyeere Andre aka ime nhọrọ dị mma, oleekwa otú ha si nyere ya aka? (4) Olee mmetụta ndụmọdụ dị na Matiu 6:24 na Ndị Filipaị 3:8 nwere n’ebe Andre nọ, oleekwa mmetụta ọ na-enwe n’ebe ị nọ?
4 Akụkụ Dị Iche Iche nke Ihe Nkiri Ahụ: I kirisịa vidio a, kirighachi akụkụ ya ndị na-esonụ, bụ́ ndị ị ga-ahụ n’ebe e dere Scenes, ma zaa ajụjụ ndị a. N’akụkụ bụ́ “Paul and Timothy”: Olee ndụmọdụ ikpeazụ Pọl nyere Timoti? (2 Tim. 4:5) N’akụkụ bụ́ “Giving Jehovah Your Best”: Olee ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị i setịpụụrụ onwe gị? N’akụkụ bụ́ “Taking a Stand for Jehovah”: Olee ihe na-enye ezi obi ụtọ? N’akụkụ bụ́ “Grandmother’s Advice”: Olee ihe dị njọ n’ịghọ onye a ma ama n’ụwa Setan? (Mat. 4:9) N’akụkụ bụ́ “No Regrets”: Olee ihe ị chọpụtara pụrụ inyere gị aka iji ndụ gị mee ihe bara uru?—Ilu 10:22.
5 Ajụjụ Ọnụ: Ka ị na-ekiri ajụjụ ọnụ nke ọ bụla, bụ́ nke ị ga-ahụ n’akụkụ bụ́ Interviews, olee ihe ị hụrụ bụ́ ihe ị pụrụ ime iji nye Jehova ihe kasị mma i nwere? (1) N’akụkụ bụ́ “Dedication to Vain Pursuits or to God?” (1 Jọn 2:17); (2) N’akụkụ bụ́ “Learning to Enjoy Your Ministry.” (Ọma 27:14); na (3) N’akụkụ bụ́ “An Open Door to Service.”—Mat. 6:33.
6 Ileghachi Anya Azụ: Ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị a mgbe i kirisịrị akụkụ bụ́ Looking Back? (1) Olee ihe nwanna nwoke na nwanna nwanyị ahụ na-achụso, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (2) Olee ókè ha nwerurula ihe ịga nke ọma na ya? (3) Olee mgbe onye nke ọ bụla n’ime ha ji mee mgbanwe n’ihe ndị ọ na-achụso? (2 Kọr. 5:15) (4) Olee ihe ndị metụtara ofufe Chineke bụ́ ndị ha ji dochie anya ihe ndị ha na-achụsobu, oleekwa ihe mere ha ji chee na ha apụghị ịchụso ha abụọ? (5) Hà kwara ụta na ha gbanwere ihe ndị ha na-achụso ná ndụ? (6) Olee ihe ndị ha kwuru bụ́ ndị kasị mee ka i chebara ihe i kwesịrị iji ndụ gị mee echiche?
7 Ajụjụ Ọnụ Ndị Ọzọ: N’ajụjụ ọnụ ndị a, bụ́ ndị ị ga-ahụ n’akụkụ bụ́ Supplementary Interviews, olee ihe ị mụtara bụ́ ihe ị pụrụ ime iji na-ejere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu? (1) N’akụkụ bụ́ “The Value of Personal Study,” (2) n’akụkụ bụ́ “Alternative Witnessing,” (3) n’akụkụ bụ́ “Bethel Service,” (4) n’akụkụ bụ́ “Ministerial Training School.”—Tụlee akụkụ bụ́ “Index to Published Information on Related Subjects” (Ndepụta nke Akwụkwọ Ndị Kwuru Banyere Ihe Ndị E Gosiri na Vidio A), ma gụkwuo banyere ihe ndị e gosiri na vidio a nke ị kasị nwee mmasị na ya.
8 Ugbu a, ì kpebiela ihe ị ga-eji ndụ gị mee? Pọl gbara Timoti ume, sị: “Na-echebara ihe ndị a echiche, na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè nye mmadụ nile.” (1 Tim. 4:15) Anyị na-agbakwa gị ume ka i chebara ihe ndị a i kiriri ma nụ na vidio a echiche. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ime nhọrọ amamihe dị na ya bụ́ nke ga-eme n’ezie ka i nwee ọṅụ, meekwa ka ị rụpụta ihe ndị bara uru ná ndụ, nakwa ka i nwee ọdịnihu na-enye obi ụtọ na nke uru dị na ya.
Igbe dị na peeji nke 6]
MAIN MENU [Ihe Ndị Dị na Ya]
Play Drama [Ebe a ka ị ga-ahụ ihe nkiri]
Scenes (E kebiri ya ụzọ 11)
Interviews
Play All
Sections (Ọ dị akụkụ 3)
Looking Back
Supplementary Material
Supplementary Interviews
Index to Published Information on Related Subjects
Subtitles
Hearing Impaired [Maka ndị ntị chiri]
None [Maka ndị na-anụ ihe]
Ị chọọ ịhụ akụkụ ndị nke na-apụtaghị n’ihu TV, pịa aka n’ebe e dere Next ▶, ◀ Back, na Main Menu