Mee Ya Ihe Mgbaru Ọsọ Gị Iduziri Mmadụ Ọmụmụ Bible
1 “Welienụ anya unu lee ubi, na ha achawo maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35) Okwu ndị ahụ Jizọs Kraịst kwuru kwekọrọ nnọọ n’ọnọdụ Ndị Kraịst nọ na ya taa.
2 A ka na-achọta ndị nwere obi eziokwu na-achọ ka a kụziere ha ụzọ Jehova. Ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ ọhụrụ a na-eme baptizim kwa afọ na-egosi nke a. Ọ bụrụ na ọ dị gị ezigbo mkpa iduziri mmadụ ọmụmụ Bible, olee ihe i nwere ike ime?
3 Nwee Ihe Mgbaru Ọsọ: Nke mbụ, nwee ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite iduziri mmadụ ọmụmụ Bible na iduzichi ya anya. Buru ihe mgbaru ọsọ ahụ n’uche mgbe ị nọ n’ozi. Ebe ọ bụ na ọrụ e nyere anyị dị ka Ndị Kraịst gụnyere izi ihe, ọ bụghị nanị ikwusa ozi ọma, anyị nile kwesịrị ịgba mbọ ịrụsikwu ọrụ iduzi ọmụmụ Bible ike.—Mat. 24:14; 28:19, 20.
4 Ihe Ndị Ọzọ Ị Ga-eburu n’Uche: Ọ dị ndị nkwusa Alaeze mkpa iji obi ha nile na-ekpe ekpere. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ahụ ndị kpegaarala Chineke ekpere ka o zitere ha ndị ga-enyere ha aka ịmata Ya. Ọ bụ nnukwu ihe ùgwù na Jehova ji anyị na-achọta ndị dị otú ahụ ma na-akụziri ha ihe!—Hag. 2:7; Ọrụ 10:1, 2.
5 Otu nwanna nwanyị kpere ekpere ka Chineke nyere ya aka ịmalitere mmadụ ọmụmụ Bible, o dowechakwara traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? n’ebe ọrụ ya. Mgbe otu nwanyị weere otu n’ime traktị ndị ahụ, gụọ ya, ma malite idejupụta akụkụ a na-adọkapụta adọkapụta na traktị ahụ, nwanna nwanyị ahụ malitere ịgwa ya okwu, mesịakwa duziwere ya ọmụmụ Bible.
6 Ndị nkwusa ibe gị ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible nwere ike inyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ gị nke bụ́ ịmalite iduziri mmadụ ọmụmụ Bible. Kpee ekpere gwa Chineke banyere mgbalị ị na-eme ịmalitere mmadụ ọmụmụ Bible, nabatakwa enyemaka nile a na-enye gị iji ruo ihe mgbaru ọsọ gị. Ikekwe, n’oge na-adịghị anya, ị ga-enweta ọṅụ nke na-abịa site n’iduziri mmadụ ọmụmụ Bible.