Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/08 p. 6
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echefula Ndị Agadi Nọ n’Ebe A Na-elekọta Ha
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ha Nọ Naanị Ha ma E Chefughị Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ọrụ Dị Mkpa Ndị Nọọsụ Na-arụ
    Teta!—2000
  • “Ị Ga-anwụ!”
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 12/08 p. 6

Igbe Ajụjụ

◼ Ò kwesịrị ekwesị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova gaa ka a gwọọ ya ma ọ bụ ka e lekọta ya n’ụlọ ọgwụ ndị okpukpe?

Okpukpe dịgasị iche iche nwere ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ebe a na-elekọta ndị agadi ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala. Ihe a na-ebukarị n’obi arụ ebe ndị ahụ abụghị ịkwado Babịlọn Ukwu ahụ. (Mkpu. 18:2, 4) O nwere ike ịbụ na okpukpe meghere ya ka ha nwee ike isi na ya na-enweta ego. Taa, ụfọdụ ụlọ ọgwụ na-aza naanị aha okpukpe, ebe ndị ọzọ ka nwere ụfọdụ ndị ndú okpukpe na-arụ ọrụ na ha.

Ọ bụrụ na otu n’ime Ndịàmà Jehova achọọ ịga ụlọ ọgwụ, ọ bụ ya ga-ekpebiri onwe ya ma ọ̀ ga-aga n’ụlọ ọgwụ nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe ma ọ̀ bụ na ọ gaghị aga. Akọ na uche otu onye nwere ike ikwe ya gaa, ebe akọ na uche nke onye ọzọ nwere ike ghara ikwe ya. (1 Tim. 1:5) Ọ dị ihe ndị nwere ike ikpebi ụlọ ọgwụ nke mmadụ ga-aga, ọ dịkwa mma ka a tụlee ihe ndị ahụ.

Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ naanị ụlọ ọgwụ nwere aha okpukpe ka e nwere n’ógbè unu. Ma ọ bụkwanụ, o nwere ike ịbụ na e nwere ụlọ ọgwụ ọzọ dị nso, kama nke a maara dị ka nke na-elekọta mmadụ nke ọma abụrụ nke nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe. O nwere ike ịbụ na ụlọ ọgwụ ahụ nke nwere aha okpukpe bụ naanị ụlọ ọgwụ nwere ngwá ọrụ a ga-eji gwọọ ụdị ọrịa na-arịa gị, o nwekwara ike ịbụ naanị ụlọ ọgwụ nke dọkịta nọ na ya nwere ikike ịgwọ ọrịa ahụ na-arịa gị. Ọzọkwa, mgbe ụfọdụ, ụlọ ọgwụ nwere ihe jikọrọ ha na okpukpe nwere ike ikweta ịgwọ gị n’ejighị ọbara n’ihi na ị bụ Onye Kraịst, ebe ụlọ ọgwụ ndị ọzọ mmadụ nwe ma ọ bụ nke gọọmenti nwe na-agaghị ekwe. Ya mere, ihe ndị a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị i nwere ike ịtụle mgbe ị na-ekpebi ụlọ ọgwụ ị ga-aga.

Ọ bụrụ na i kpebie ịga ụlọ ọgwụ nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe, i nwere ike iwere ya na ụgwọ ị kwụrụ bụ ụgwọ ha ji lekọta gị. I nwere ike ile ya anya dị ka ebe okpukpe ahụ nwere ụlọ ahịa, ọ bụrụ na ị gaa zụrụ ihe n’ụlọ ahịa ahụ, ego ahụ ị kwụrụ abụghị iji kwado okpukpe ụgha ahụ. Naanị ihe i mere bụ ịkwụ ụgwọ ihe ị zụrụ ma ọ bụ ụgwọ ihe ha meere gị.

N’ihi Onye Kraịst ị bụ, mgbe ọ dị otú ahụ, ị ga-ahụrịrị na o nwetụghị otú i si tinye aka n’ụdị ofufe ụgha ọ bụla. Ọzọkwa, ị gaghị akpọ onye ọ bụla na-arụ ebe ahụ ma ọ bụ onye ọ bụla bịara ileta gị utu aha okpukpe ndị dị ka “Fada” ma ọ bụ “Sista.” (Mat. 23:9) I kwesịrị ịhụ na naanị ihe jikọrọ gị na ha bụ ọgwụgwọ ha na-agwọ gị, ọ dịghị ihe ọzọ.

Mgbe ị gara ụlọ ọgwụ, i nwere ike ịgwa ha na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa na ị ga-achọ ka ndị okenye ọgbakọ unu na-abịa eleta gị. Nke a ga-eme ka e nwee ike inyere gị aka n’ụzọ ime mmụọ n’oge ị nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ.—1 Tesa. 5:14.

Ndị ezinụlọ nọ n’ọgbakọ, ndị okenye, na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịhụ na ha na-egbo mkpa ime mmụọ nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị bụ́ ndị agadi a na-elekọta n’ụlọ ọgwụ, karịsịa n’ụlọ ọgwụ ndị okpukpe. Ọ bụrụ na e jiri ịdị uchu na-eme nke a, ọ ga-agba ndị agadi ahụ ume, meekwa ka ha ghara iso n’ofufe, n’ememme, ma ọ bụ n’ihe omume okpukpe ndị ọzọ n’amaghị ama, bụ́ ndị a na-eme n’ụlọ ọgwụ ndị dị otú ahụ.

Ọ bụrụ na anyị eburu ihe ndị a e kwuru n’obi, onye ọ bụla ga-atụle ihe niile metụtara ịga ụlọ ọgwụ ndị okpukpe, ma kpebizie n’onwe ya ụlọ ọgwụ nke ọ ga-aga.—Gal. 6:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya