“Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla”
1 Mgbe Jizọs malitere ọrụ nkwusa ya, o wepụtara oge iji kwadebe ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 10:5-14) Ọ bụ eziokwu na anyị niile na-eji ọrụ n’aka, anyị iwepụta nkeji ole na ole iji kwadebe tupu anyị agawa ozi ụlọ n’ụlọ ga-enyere anyị aka ịrụpụta ihe dị mma.—2 Kọr. 9:6.
2 Otú E Si Akwadebe: Ihe mbụ anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkwadebe nke ọma bụ ịmara ihe dị n’akwụkwọ anyị chọrọ inyefe. Anyị kwesịkwara ichebara ndị nọ n’ókèala anyị echiche. Olee ihe ndị na-echegbu ha? Olee ihe okpukpe ndị dị n’ókèala anyị na-akụzi? Iji mata ihe anyị ga-ekwu, anyị nwere ike ile aro ndị a tụrụ maka otú e nwere ike isi zie ozi ọma, bụ́ ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị na n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible.
3 Ige ntị nke ọma mgbe a na-eme ihe ngosi ná Nzukọ Ije Ozi ga-enyekwara anyị aka. Ka ụzọ ndị anyị si ezi ozi ọma na-amarakwu anyị ahụ́, oge anyị ga-eji na-akwadebe maka ozi ọma ga na-ebelata. Ma, ọ bụrụ na mgbe ọ bụla anyị chọrọ ịga ozi ọma, anyị eburu ụzọ chee echiche banyere ihe ndị anyị ga-ekwu ma nọgide na-eme ka otú anyị si ezi ozi ọma na-aka mma, anyị ga na-arụpụtakwu ihe n’ozi anyị. Anyị kwesịkwara iwepụta obere oge iji lee ma akwụkwọ ndị ga-adị anyị mkpa n’ozi ọma hà dịkwa n’akpa anyị.
4 Olee ihe ga-enyere anyị aka icheta otú anyị chọrọ isi ezi ozi ọma? Ikwupụta otú anyị chọrọ isi zie ozi ọma ekwupụta mgbe anyị na-amụgharị ya ga-enyere anyị aka icheta ya. Ụfọdụ ezinụlọ na-amụgharị otú ha ga-esi ezi ozi ọma n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. Ndị ọzọ na-edepụta ihe ndị bụ́ isi ha chọrọ ikwu ma ha ziwe ozi ọma ná mpempe akwụkwọ, ma na-enyonye anya na ya tupu ha ana-abanye n’ụlọ mmadụ.
5 Ihe Mere O Ji Aba Uru: Ịkwadebe nke ọma na-eme ka otú anyị si ezi ọma dịkwuo mma, ọ na-emekwa ka anyị nwekwuo ọṅụ n’ozi anyị. Ọ na-eme ka ahụ́ ruo anyị ala, na-emekwa ka anyị ghara ịtụcha ụjọ mgbe anyị rutere n’ụlọ mmadụ. Ọ na-eme ka anyị lekwasị anya n’inyere onye nwe ụlọ aka kama ịdị na-eche ihe anyị ga-ekwu. Ọzọkwa, anyị ịmara akwụkwọ anyị chọrọ inyefe nke ọma ga-enyere anyị aka ijikwu ịnụ ọkụ n’obi nyefee ya.
6 Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ka anyị “dị njikere ịrụ ezi ọrụ ọ bụla.” (Taị. 3:1) O nweghị ọrụ ka ikwusa ozi ọma mma. Ọ bụrụ na anyị akwadebe nke ọma, ọ na-egosi na anyị na-akwanyere onye nwe ụlọ kwere ige anyị ntị ùgwù, nakwa na anyị na-akwanyere Jehova, bụ́ Chineke anyị na-ejere ozi, ùgwù.—Aịza. 43:10.