Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche May 1
“Otú ọdachi ndị na-emere onwe ha si emezi aghara aghara ugbu a e meela ka ndị mmadụ chewe ma Chineke ò ji ya ata anyị ahụhụ. Olee ihe i chere? [Chere ka ọ zaa. Gụzie 1 Jọn 4:8.] Isiokwu a na-akọwa ihe mere o ji bụrụ na ahụhụ ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha na-akpata esighị Chineke n’aka.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 30.
Ụlọ Nche June 1
“Otu n’ime akụkọ Baịbụl a kasị mara amara bụ akụkọ banyere Noa na Iju Mmiri. Ì chere na akụkọ banyere Iju Mmiri ahụ mere eme n’eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Ọ dị mma ịmara na ihe Jizọs kwuru banyere ya gosiri na o mere eme. [Gụọ Luk 17:26, 27.] Magazin a kwuru ihe mere anyị ga-eji kwere na akụkọ banyere Iju Mmiri ahụ mere eme, kwuokwa ihe ndị dị mkpa akụkọ ahụ na-akụziri anyị.”
Teta! Apr.–June
“Ị̀ na-ele nkwenkwe ụgha anya dị ka ihe na-enweghị ihe o mere, ka ì chere na o nwere ike ịkpatara mmadụ ọdachi? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl kwuru ebe a. [Gụọ Aịzaya 65:11.] Isiokwu a ga-akọwara gị ma nkwenkwe ụgha ò kwekọrọ n’ozizi Baịbụl.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 12.
“Ì chere na o nwere ike ịbụ na anyị bi n’oge a kọwara ebe a? [Gụọ 2 Timoti 3:1-4. Cherezie ka ọ zaa.] E nwere ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji nwee nnọọ mmasị n’oge ikpeazụ n’ihi na mgbe ọ bụla oge a malitere, ọ ga-egosi na oge ihe ọma ga-eme n’ụwa eruwela nso. Magazin a ga-akọwara gị ya.”