Ịkwado Akwado Bụ Ihe Bụ́ Isi Na-eme Ka Nletaghachi Na-arụpụta Ihe
1. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ ga-esi gbasaa ozi ha?
1 Jizọs kwadebere ụmụazụ ya nke ọma ịbụ ndị na-ekwusa “ozi ọma alaeze ahụ” nke ọma. (Mat. 4:23; 9:35) Ebe Jizọs nọrọ zụọ ha bụ naanị na Palestaịn. Ma, tupu Jizọs arịgoo eluigwe, o mere ka o doo anya na a ga-ezisa ozi ọma Ndị Kraịst n’ọtụtụ ebe iji “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.”—Mat. 28:19, 20.
2. Olee ihe irube isi n’iwu Jizọs nke ‘ime ndị na-eso ụzọ’ ga-achọ anyị n’aka?
2 Ọrụ ahụ ga-agụnye ịgaghachi na nke ndị nwere mmasị n’ozi ọma Alaeze Chineke na ịkụziri ha idebe ihe niile Kraịst nyere n’iwu. Iji mee ụdị nletaghachi ahụ na-arụpụta ihe, ọ dị anyị mkpa ịkwado nke ọma.
3. Ọbụna n’oge mbụ ị gara na nke mmadụ, olee otú i nwere ike isi meghee ụzọ maka nletaghachi?
3 Buru Ụzọ Mee Atụmatụ: Ụfọdụ ndị nkwusa na-agbalị ịjụ otu ajụjụ ma ha gwachaa onye nwe ụlọ okwu n’oge mbụ ha gara na nke ya ma kwe nkwa na ha ga-alọghachi iji zaa ya. Ha achọpụtala na ikwu ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi mgbe ha gara nletaghachi enyerela ha aka ịmalite iduzi ọmụmụ Baịbụl ozugbo.
4. Olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji chere ruo mgbe anyị nwetara magazin ndị ọhụrụ tupu anyị eletaghachi ndị anyị ziri ozi ọma?
4 Na anyị ga na-enyefe naanị magazin abụọ kwa ọnwa apụtaghị na anyị ga-echere ruo mgbe magazin ọzọ lọtara tupu anyị agaa kpọtụghachiri ndị mmadụ. I nwere ike ime ka mmadụ nwekwuo mmasị n’eziokwu site n’ịgwa ya banyere ihe ndị dị na magazin o nwetarala.
5. Olee uru ọ bara iburu ihe ị chọrọ ịrụzu n’obi?
5 Nwee Ihe I Bu n’Obi Ịrụzu: Tupu ị gaghachiwe, jiri nkeji ole na ole tụleghachi ihe ndị i dekọrọ banyere onye ahụ ma kpebie ihe ị chọrọ ịrụzu. Dị ka ihe atụ, gị na ya kwurịta otu ihe dị n’akwụkwọ i nyere ya na mbụ. Ma ọ bụkwanụ gị enye ya akwụkwọ metụtara ihe gị na ya kwurịtaburu. Ọ bụrụ na ị jụrụ ajụjụ ị na-azaghị mgbe mbụ ị gara, o doro anya na ịza ajụjụ ahụ ga-eso n’ihe ndị ị ga-ebu n’obi ịrụzu. Mgbe i ji Akwụkwọ Nsọ na-akwado ihe ị na-ekwu, gbalịa nnọọ ịgụ ya agụ na Baịbụl.
6. Olee ebumnobi anyị ji aga nletaghachi?
6 Ebumnobi Anyị: O doro anya na ebumnobi anyị bụ ịmalite iduziri onye ahụ ọmụmụ Baịbụl. Otu nwanna nwoke gwara onye ọ gaara nletaghachi na ya ga-achọ ịmalite iduziri ya ọmụmụ Baịbụl, ma nwoke ahụ jụrụ ajụ. Nwanna ahụ mechara wetara ya magazin ndị ọhụrụ n’ụbọchị ọzọ ma gwa ya, sị, “Taa, anyị nọ na-aza ndị mmadụ otu ajụjụ dabeere na Baịbụl n’ógbè a.” Mgbe nwanna nwoke ahụ nụsịrị ihe nwoke ahụ kwuru, nwanna nwoke ahụ gụrụ otu amaokwu Baịbụl, gụọkwa ebe kọwara ya n’otu akwụkwọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ọ bụ otú ahụ ka nwoke ahụ si ghọọ onye ọ na-amụrụ Baịbụl.
7. Olee otú ịkwado akwado sirila nyere gị aka ịmalite ọmụmụ Baịbụl?
7 Ọ bara ezigbo uru iwepụta oge kwado akwado maka nletaghachi. Ọ ga-eme ka anyị nwekwuo ọṅụ, o nwekwara ike inye anyị ohere inyere “ndị nwere ezi obi” aka ịbanye n’ụzọ na-eduba ná ndụ.—Ọrụ 13:48.