Igbe Ajụjụ
◼ Ọ bụrụ na mmadụ abụọ chọrọ ịlụ onwe ha achọọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ, olee ihe ndị ha na ndị okenye kwesịrị ikwurịta?
Agbamakwụkwọ ndị a haziri n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Baịbụl na-ewetara Jehova nsọpụrụ. Ọ na-adị otú ahụ karịsịa n’agbamakwụkwọ ndị e mere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-ele ihe ọ bụla a na-eme ebe ahụ anya dị ka ihe na-egosi otú nzukọ anyị si eme ihe. Iji hụ na ‘e mere ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro,’ ọ dị mma ka ndị okenye ọgbakọ tinye ọnụ ma mmadụ abụọ chọrọ ịlụ onwe ha rịọ ka ha nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ.—1 Kọr. 14:40.
Mmadụ abụọ na-achọ ịlụ onwe ha, bụ́ ndị chọrọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ, kwesịrị ide akwụkwọ ozi iji rịọ kọmitii ije ozi nke ọgbakọ na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ka ha kwe ha mee otú ahụ. Ha kwesịrị inye akwụkwọ ozi ahụ n’ezi oge ma kwuo ụbọchị na oge ha chọrọ ịnọ n’ụlọ nzukọ ahụ gbaa akwụkwọ. Ha kwesịrị iburu n’obi na ndị okenye agaghị akagbu nzukọ ọ bụla n’ihi agbamakwụkwọ. Ọzọkwa, mmadụ abụọ ahụ na-achọ ịlụ onwe ha ga-abụrịrị ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ, na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Baịbụl na ụkpụrụ ezi omume Jehova.
Iji hụ na agbamakwụkwọ ahụ emebighị aha Chineke ukwu anyị, mmadụ abụọ ahụ na-achọ ịlụ kwesịrị ịkọwara kọmitii ije ozi ihe ndị ha mere atụmatụ ime tupu ha ekpebichaa ha. Ọ bụ ezie na ndị okenye agaghị anwa ịmanye mmadụ abụọ ahụ ime ihe ndị okenye chọrọ, ọ bụrụ na ọ dị ihe ndị na-adịchaghị mma ha na-eme atụmatụ ime, ha kwesịrị ịgbanwe ha. Ọ bụ naanị abụ ndị a họtara na Kingdom Melodies ma ọ bụ n’akwụkwọ abụ anyị ka e kwesịrị iji mee ihe n’ebe ahụ. Ha ga-anatarịrị ikike tupu ha ana-edogharị oche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ chọọ ya mma n’ụdị ọ bụla. Ọ bụrụ na a ga-ese foto ma ọ bụ tinye ihe ndị a na-eme na vidio, ihe ndị a ekwesịghị ịdọpụ uche ndị mmadụ n’okwu ahụ dị mkpa a na-ekwu. Ọ bụrụ na onye foto a ga-akpọ bụ onye ụwa, ọ bụ ọrụ dịịrị nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ịhụ na a gwara ya ka o jie ejiji dị mma n’anya, ma si otú ahụ kwanyere ihe omume ahụ ùgwù. Ndị okenye nwere ike ikwe ka a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mụgharịa ihe ndị a ga-eme n’agbamakwụkwọ ahụ ma ọ bụrụhaala na ọ gaghị emetụta ndokwa ndị ọzọ ọgbakọ mere. E kwesịghị ịmapawa akwụkwọ ịkpọ òkù ọ bụla na bọọdụ ịma ọkwa. Ma, ndị okenye nwere ike ikwe ka a maa ọkwa dị mkpirikpi ná Nzukọ Ije Ozi banyere agbamakwụkwọ ahụ a ga-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Ọ bụ ezie na ọ bụghị iwu na ndị niile na-edubata ndị ahụ na-alụ di na nwunye ọhụrụ ga-abụ ndị e mere baptizim, ọ gaghị adị mma itinye ndị ndụ ha megidere nnọọ ụkpụrụ Baịbụl ma ọ bụ ndị àgwà ha ga-enye ndị bịara ememme ahụ nsogbu n’obi ná ndị ga-edubata ndị ahụ na-alụ di na nwunye ọhụrụ. O kwesịrị ịbụ okenye ọgbakọ ga-eduzi agbamakwụkwọ ahụ, ma ọ bụrụ na e nwere onye okenye n’ebe ahụ. Ndị okenye ruru eru ịkụzi Okwu Chineke, n’ihi ya, ọ bụ ha kasị ruo eruo ikwu okwu ga-eme ka ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara ememme a dị mkpa doo anya.—1 Tim. 3:2.
Ebe ọ bụ na agbamakwụkwọ na-emetụtakwa aha okenye ga-eduzi ya, e kwesịkwara ịgwa ya ihe ndị e mere atụmatụ ime n’agbamakwụkwọ ahụ. Ya na ndị ahụ na-achọ ịlụ onwe ha ga-anọkọ ka ọ jụọ ha banyere àgwà ha n’oge ha na-akpa; ndị ahụ na-achọ ịlụ onwe ha kwesịrị ịgwa ya eziokwu. Ya bụrụ na nke nwoke ma ọ bụ nke nwaanyị alụọla nwunye ma ọ bụ di na mbụ, onye nke ahụ aghaghị igosi na ya enwerela onwe ya ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye, dị ka Akwụkwọ Nsọ na iwu obodo si kwuo. (Mat. 19:9) Nke a ga-agụnye igosi okenye ahụ ihe gbara ọkpụrụkpụ na-egosi na ọ gbaala alụkwaghịm.
Mgbe ndị na-achọ ịlụ onwe ha gwara ndị okenye ihe ndị ha kwesịrị ịgwa ha ma gbasoo ntụziaka ha, agbamakwụkwọ ahụ ga-abụrụ mmadụ niile ememme na-enye ọṅụ.—Ilu 15:22; Hib. 13:17.