I Nwere Ike Ịbụ Onye Nkụzi
1. Olee ihe ùgwù onye nkwusa Alaeze nke ọ bụla nwere ike inwe?
1 Otu n’ime ihe ndị kasị enye ọṅụ n’ozi anyị bụ ịkụziri mmadụ eziokwu Baịbụl. Ịhụ ka onye ahụ nabatara ozi Alaeze ahụ na inyere ya aka ịbịaru Eze eluigwe na ala nso na-eme nnọọ obi ụtọ. (Jems 4:8) Onye nkwusa Alaeze nke ọ bụla kwesịrị inwe ihe mgbaru ọsọ nke ịkụziri onye agụụ eziokwu na-agụ ihe ma hụ ka onye ahụ malitere na-eme mgbanwe ná ndụ ya na n’akparamàgwà ya, olileanya ya agbanweekwa.—Mat. 28:19, 20.
2. Olee ihe nwere ike ime ka obi ghara isi ụfọdụ ndị ike iduzi ọmụmụ Baịbụl, oleekwa ihe ga-enyere ha aka imeri nsogbu a?
2 Tụkwasị Jehova Obi: N’oge gara aga, ụfọdụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi chere na ha erughị eru ịrụ ọrụ e nyere ha. N’ihi na Mozis, Jeremaya, Emọs, na ndị ọzọ si n’ezinụlọ a na-amaghị ama tụkwasịrị Jehova Chineke obi, nke ahụ nyeere ha aka ịkwụsị inwe obi abụọ na ịtụ ụjọ ma rụọ ọrụ ndị gbara ọkpụrụkpụ. (Ọpụ. 4:10-12; Jer. 1:6, 7; Emọs 7:14, 15) Pọl onyeozi ‘nwekwara nkwuwa okwu.’ Olee otú o si mee ya? Ọ kọwara na ọ bụ “site n’enyemaka Chineke.” (1 Tesa. 2:2) Ee, anyị niile nwere ike inwe obi ike na Jehova ga-enyere anyị aka, nye anyị amamihe na ume dị anyị mkpa iji duzie ọmụmụ Baịbụl ndị na-arụpụta ihe.—Aịza. 41:10; 1 Kọr. 1:26, 27; 1 Pita 4:11.
3, 4. Olee ọzụzụ ndị a na-enye anyị iji nyere anyị aka ịkụzi Okwu Chineke?
3 Kwe Ka A Zụọ Gị: Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-enye anyị ọzụzụ site n’ime ndokwa ka anyị na-erichi nri ime mmụọ anya ka anyị wee ghọọ ndị nkụzi ma nke a na-akọ. (Aịza. 54:13; 2 Tim. 3:16, 17) Kwe ka a zụọ gị site n’iji ndokwa niile e mere iji nyere anyị aka ịghọtakwu Akwụkwọ Nsọ na ịmụtakwu otú e si akụzi eziokwu Baịbụl na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ ezie na ọ bụ nke a bụ nzube bụ́ isi e ji hiwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi, ọmụmụ ihe niile anyị na-enwe n’ọgbakọ na-azụ anyị iji Okwu Chineke na-akụzi ihe.
4 Gbaa mbọ ịmụta ụzọ ndị dị mfe e si akụzi eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl. Akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 227, kọwara, sị: “Gị onwe gị aghaghị ịghọta isiokwu gị nke ọma ma ọ bụrụ na ị ga-eme ka ndị ọzọ ghọta ya.” Ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe na-enyere anyị aka iburu isi ihe ndị dị mkpa n’obi iji nwee ike iji ha mee ihe n’ọdịnihu. N’ihi ya, na-akwado nke ọma, nke ahụ ga-emekwa ka i nwekwuo obi ike na ị ga-akụzili ihe.
5. Olee ọzụzụ ọzọ anyị nwere ike inweta n’ọgbakọ bụ́ nke ga-enyere anyị aka inwe ọganihu dị ka ndị nkụzi?
5 Site ná mmalite, o doro anya na Ndị Kraịst na-amụta ihe n’aka ibe ha ka ha na-arụkọ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ọnụ. (Luk 10:1) Ya bụrụ na o kwe mee, sonyere ndị nkwusa nwerela ahụmahụ, bụ́ nke gụnyere ndị ọsụ ụzọ, ndị okenye, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ka ha na-aga iduzi ọmụmụ Baịbụl. Chọpụta otú ha na-esi eji ihe atụ ndị dị mfe nghọta na ihe ndị ọzọ na-enye aka ịkụzi ihe bụ́ ndị dị n’akwụkwọ anyị akọwa eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. Sị ha tụọrọ gị aro otú ị ga-esi mụtakwuo ịkụzi ihe. (Ilu 1:5; 27:17) Ghọta na ọzụzụ niile ahụ bụ ọzụzụ sitere n’aka Chineke ma nabata ya.—2 Kọr. 3:5.
6. Olee isi ihe dị mmadụ mkpa ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịghọ onye na-akụzi Okwu Chineke?
6 Tụkwasị Jehova obi ma rite uru n’ọzụzụ ọ na-enye. Kpegara Chineke ekpere ma gwa ya na ị chọrọ inwe ọganihu. (Ọma 25:4, 5) Gị onwe gị kwa nwere ike inwe ọṅụ nke inyere onye ọzọ aka ịghọ ihe ị bụ, ya bụ, onye na-akụzi Okwu Chineke!