‘Na-agbasi Àmà Ike’—Site n’Ịgba Àmà ná Nnukwu Ụlọ Ebe Ọtụtụ Ndị Bi
1. Gịnị ka ịdị ‘na-agba àmà nke ọma’ gụnyere?
1 Dị ka Pọl onyeozi, anyị chọrọ ịdị ‘na-agbasi àmà ike banyere ozi ọma’ ahụ. (Ọrụ 20:24) N’ihi ya, anyị na-agbalị izi ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị ozi ọma Alaeze ruo n’ókè o kwere mee. Nke a gụnyere ọtụtụ ndị bi ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi (ndị dị ka esteet, nnukwu ụlọ elu, na ụlọ ndị a na-eche nche na ha). Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isi ike ịbanye n’ebe ndị dị otú ahụ iji zie ndị bi ebe ahụ ozi ọma. Ma, ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ bi n’ụlọ ndị dị otú a, ọ na-abụ ohere magburu onwe ya iji kwusaara ọtụtụ ndị ozi ọma.
2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri akọ na ezi uche na-ezi ozi ọma ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi?
2 N’ihi otú mpụ na ime ihe ike si jupụta ebe niile, a na-agbachizi ọtụtụ nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi agbachi, ha na-enwekwa ndị nche ma ọ bụ onyokomita. (2 Tim. 3:1, 2) Ndị nwe ebe ahụ nwere ike iti iwu na mmadụ enweghị ike ịbata ebe ndị ahụ, ọ gwụla ma ndị bi ebe ahụ hà gwara ya bịa. Onye na-elekọta ebe dị otú ahụ nwere ike ịsị anyị lawa, karịsịa ma ọ bụrụ na otu n’ime ndị bi ebe ahụ emeere ya mkpesa. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị jiri akọ na-ezi ozi ọma n’ebe ndị ahụ ma gosi na anyị nwere ezi uche.
3. Olee mgbe kasị mma ịga ozi ọma ná nnukwu ụlọ ọtụtụ mmadụ bi, n’ihi gịnịkwa?
3 Mgbe A Ga Na-arụ Ebe Ndị Ahụ: Dịkwa ka ọ na-adị n’ókèala ndị ọzọ, ọ kasị mma izi ozi ọma ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi mgbe a ga-enweta ndị mmadụ n’ụlọ. E nwere ike inyowe anyị enyowe ma anyị gaa mgbe ọtụtụ ndị bi ebe ahụ na-anọghị n’ụlọ. Ọtụtụ ndị nkwusa enwetala ndị mmadụ n’ụlọ n’oge mgbede nakwa n’ehihie Saturday na Sunday. Ịma ụzọ aga ozi ọma n’ụlọ ndị dị otú a, karịsịa ná ngwụsị izu, nwere ike ime ka ndị bi ebe ahụ mewere onye na-elekọta ụlọ ahụ mkpesa.
4, 5. Olee otú anyị nwere ike isi banye ná nnukwu ụlọ ndị a gbachiri ebe e si abanye ha agbachi?
4 Ịbanye Ebe Ndị Ahụ: Ndị nkwusa ekwesịghị ibu ụzọ gwa onye na-elekọta ụlọ ahụ ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ na-anọchite anya onye nwe ụlọ na ha chọrọ izi ozi ọma n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na a gbachiri ebe e si abanye n’ụlọ ahụ agbachi, ya enweekwa telefon a na-akwụnye n’ọnụ ụzọ, anyị nwere ike iji ya chọta onye ga-asị anyị bata bịa zie ya ozi ọma. Dabere n’otú e si rụọ ụlọ ndị ahụ, anyị nwere ike ịga zie ndị ọzọ bi ebe ahụ ozi ọma mgbe anyị zisịrị onye mbụ ahụ sị anyị bata. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ ga-akasị mma ịpụ n’ụlọ ahụ ma jirikwa fon a na-akwụnye n’ọnụ ụzọ chọta onye ọzọ bi ebe ahụ ga-achọ ka anyị zie ya ozi ọma. Anyị kwesịrị iji uche anyị kpebie mmadụ ole anyị nwere ike isi otú a kpọtụrụ n’otu oge.
5 Ụfọdụ ndị bi ebe ahụ nwere ike ịchọ ka i si na fon ahụ gwa ha ihe mere i ji bịa. Ya bụrụ otú ahụ, jiri olu ọma kọwaa onwe gị. Kpọọ onye nwe ụlọ ahụ aha ya ma ọ bụrụ na e dere ya n’akwụkwọ e depụtara aha ndị bi ebe ahụ. Kwuo ihe mere i ji bịa ná nkenke. Ụfọdụ amalitela nkwurịta okwu site n’isi n’akwụkwọ bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible gụpụta okwu mmalite ha.
6. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’ụlọ nwere onye nche?
6 Ọ bụrụ na e nwere onye nche n’ebe ahụ nke na-anaghị ekwe ka anyị banye gaa zie ozi ọma, anyị nwere ike ịgbalị izi ya ozi ọma. Ọ na-atọ ọtụtụ ndị nche ụtọ ịgụ akwụkwọ anyị. Anyị nwedịrị ike ịmalite duziwere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na veranda. Ọ bụrụ na onye nche ekwe ka anyị banye gaa hụ otu onye nwere mmasị, ọ na-akasị mma ma anyị ghara isi na ya kụwara ndị ọzọ bi ebe ahụ aka n’ụzọ.
7. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi banyere akpa anyị ji aga ozi ọma?
7 Ọdịdị Anyị na Àgwà Anyị: Ibu nnukwu akpa nwere ike ime ka ndị mmadụ nyowe anyị enyowe. N’ihi ya, anyị nwere ike ibu obere akpa, ma ọ bụkwanụ ghara ibu akpa ọ bụla. Ụfọdụ ndị nkwusa na-etinye akwụkwọ ndị a na-enyefe n’oge ahụ n’obere akpa ma jide Baịbụl ha n’aka ma ọ bụ tinye ya n’akpa uwe ha.
8. Olee otú e kwesịrị isi hazie ndị ga-ezi ozi ọma ná nnukwu ụlọ ọtụtụ ndị bi?
8 Ọ kacha mma ịghara ịdị na-ezukọta n’ìgwè, karịsịa na paseeji ma ọ bụ n’ebe a na-adọba ụgbọala n’ihi na nke a ga-eme ka anya ndị mmadụ dị n’ebe anyị nọ. Anyị kwesịrị ịkpachara anya mgbe anyị na-ezi ozi ọma ná nnukwu ụlọ ọtụtụ mmadụ bi nke dị n’ógbè a na-emekarị mpụ na ya. (Ilu 22:3) Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa anọ ma ọ bụ isii nwere ike ịrụ otu ebe otú ha ga na-anụ olu ibe ha, ikekwe na-eme mmadụ abụọ na-ezi ozi ọma ndị nke ọzọ echere ha.
9. Olee otú anyị nwere ike isi na-akpa ezi àgwà mgbe anyị gara ná nnukwu ụlọ ọtụtụ ndị bi, gịnịkwa mere o ji dị mkpa?
9 Mgbe ị na-aba ná nnukwu ụlọ ndị a, hichaa akpụkpọ ụkwụ gị, mechiekwa ụzọ nke ọma mgbe ị batachara. Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ọma ndị a, anyị ga-ebelata ihe ndị nwere ike ime ka ndị bi ebe ahụ mewe mkpesa. Ozugbo ị banyere n’ụlọ ahụ, gawa ebe unu ga-ezi ozi ọma ozugbo kama ịnọ na-akwụgharị n’ọnụ ụzọ. Nke a ga-eme ka a ghara inyowe unu enyowe.
10. Olee otú anyị nwere ike isi ghara ịdị na-eme mkpọtụ na paseeji?
10 N’ọtụtụ ụlọ ọtụtụ mmadụ bi, okwu e kwuru na paseeji na-adasi ụda ike. N’ihi ya, ekwusila okwu ike karịa otú naanị onye nwe ụlọ ga-anụ olu gị. Mgbe ị na-agwa ndị nkwusa ndị ọzọ okwu, wetuo olu gị ala, ma ekwula okwu otú ga-eme ka e nyowe unu enyowe. Iji zere inye ndị bi ebe ahụ nsogbu, ihe ụfọdụ ndị nkwusa na-eme bụ ha si n’isi paseeji nke a zitụ, ha agaa bido n’isi ya nke ọzọ kama ịkụwa aka n’ọnụ ụzọ nke ọ bụla site n’isi ruo ná ngwụsị. Ọzọkwa, isu aka n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ nwere ike imenye ndị nọ n’ime ụlọ ndị ahụ ụjọ.
11. Olee aro a tụrụ nke nwere ike inyere gị aka mgbe ị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ nwere ebe e si enyopụta anya?
11 Ọ bụrụ na ọnụ ụzọ mmadụ nwere ebe e si enyopụta anya iji hụ onye kwụ n’ọnụ ụzọ, gị na onye gị na ya so kwesịrị iguzo n’ebe onye nọ n’ime ụlọ ga-ahụ unu abụọ. Nọrọ ebe onye ahụ ga-ahụ ihu gị, mgbe ị chọpụtakwara na mmadụ na-ele unu, jiri ihu ọchị kelee onye ahụ ma malite okwu gị. Ọ bụrụ na onye ahụ ajụọ, sị, ‘Ọ̀ bụ onye?’ ọ ga-akasị mma ka ị kpọọ aha gị na aha onye gị na ya so. Nke ahụ nweziri ike ime ka obi ruo onye nwe ụlọ ala imeghe ụzọ. Ọ bụrụ na o megheghị ụzọ, i nwekwara ike ịnọ n’ọnụ ụzọ zie ya ozi ọma.
12. Olee otú anyị nwere ike isi zere ịkpata nsogbu mgbe anyị chọrọ idebere ndị na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ?
12 Ndị Na-anọghị n’Ụlọ: Mkpesa ndị na-elekọta ụdị ụlọ ndị ahụ na-emekarị bụ na ha na-ahụ akwụkwọ ndị tọgbọ na paseeji ma ọ bụ n’ihu ụlọ. Akwụkwọ a fanyere n’ọnụ ụzọ nwere ike ịda n’ala ma mee ka ebe ahụ ghara ịdị mma ile anya. N’ihi ya, e kwesịrị idebe akwụkwọ ọ bụla a chọrọ idebere ndị na-anọghị n’ụlọ otú anya onye na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya.
13. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị gaa na nke onye nwe ụlọ iwe ji?
13 Ndị Nwe Ụlọ Iwe Ji: Ọ bụrụ na anyị agaa na nke onye nwe ụlọ iwe ji, bụ́ onye nwere ike ịkpọ onye na-elekọta ụlọ ka ọ bịa chụpụ anyị, ọ ga-akasị mma ka anyị si n’akụkụ ebe ahụ pụọ ma lọghachi n’oge ọzọ. N’oge ndị ọzọ, ihe ga-aka mma ime bụ isi n’ụlọ ahụ pụọ kpamkpam ka onye na-elekọta ụlọ ghara ịbawara anyị mba. Ọ bụrụgodị na onye nwe ụlọ ekwughị hoo haa ka anyị kwụsị ịbịa na nke ya, ọ ga-aka mma idetu nọmba ụlọ ahụ na kaadị ókèala dị ka otu n’ime ụlọ ndị a na-anaghị ezi ozi ọma na ha. Site n’oge ruo n’oge, e kwesịrị ịdị na-akpọtụrụ ndị bi n’ụlọ ndị a iji mara ma ndị nwe ha hà agbanweela obi ha, dị ka a na-eme banyere ụlọ ndị ọzọ a na-anaghị ezi ozi ọma na ha.
14, 15. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye na-elekọta ụlọ asị anyị lawa?
14 A Sị Gị Lawa: Ọ bụrụ na mgbe ị na-arụ ebe dị otú ahụ na onye na-elekọta ya, onye nche, onye na-edozi ihe ndị mebiri na ya, ma ọ bụ onye ọzọ na-anọchite anya onye nwe ụlọ ahụ agwa gị ka ị lawa, ọ ka mma ịlawa ozugbo. Mgbe ọ bụla o kwere mee, anyị kwesịrị izere ime ihe ọ bụla ga-ese okwu nke ga-eme ka e kwuwe okwu ịkpọpụ anyị n’ụlọikpe, ma ọ bụ ịkpọrọ anyị ndị uwe ojii. Ọtụtụ mgbe, ọ bụghị na ndị na-elekọta nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi kpọrọ Ndịàmà Jehova asị, kama ọ bụ ọrụ ha ka ha na-arụ.
15 Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na onye na-elekọta ụlọ asị gị lawa, i nwere ike iji obiọma na akọ kọwaara ya ihe mere i ji bịa. (1 Pita 3:15) Anyị ghọtara na ọrụ ya bụ ime ndị bi n’ụlọ ahụ obi ụtọ na ịhụ na obi ruru ha ala. O nwere ike ikwe gị ka ị nọgide na-ezi ozi ọma ebe ahụ. Ma, ọ bụrụ na ọ jụ, jiri nwayọọ si ebe ahụ pụọ. Ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ ga-emebi, i nwere ike ịjụ ma ì nwere ike ịdị na-abịa edebe akwụkwọ n’ebe ndị bi n’ụlọ ahụ ga na-ahụ ya, dị ka n’ebe a na-edebere ha akwụkwọ ozi. (Kọl. 4:6) E kwesịrị ịgwa onye nlekọta ije ozi ma ihe dị otú ahụ mee.
16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị agbalịa ije ozi ọma ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi ma nsogbu anọgide na-apụta?
16 Ikekwe, mgbe oge ụfọdụ gafesịrị, ndị nkwusa nwere ike iji akọ nwaa ịgaghachi n’ụlọ ahụ. Ma, ọ bụrụ na nsogbu ahụ adịgide, ndị okenye kwesịrị ịgwa alaka ụlọ ọrụ ka ha nyere ha aka kama ịhapụ ndị nkwusa ka ha nwawa igbo mkpa ahụ n’onwe ha. Ọ bụrụ na ndị nkwusa enweghị ike ije ozi ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi, e nwere ike ịgbalị isi n’ụzọ ọzọ kpọtụrụ ndị bi na ya, dị ka site n’iji telefon ma ọ bụ akwụkwọ ozi agbara ha àmà. Ụfọdụ ndị nkwusa na-agba àmà okporo ámá n’ihu ụlọ ahụ ma ọ bụ na gburugburu ebe ụlọ ahụ dị n’ụtụtụ ma ọ bụ ná mgbede, bụ́ mgbe ndị mmadụ na-ejikarị aga ọrụ ma ọ bụ mgbe ha ji alọta.
17. Gịnị mere o ji dị mkpa izi ozi ọma ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi?
17 Ọgwụgwụ nke ụwa ọjọọ a na-eru nso. Ọ bụ naanị ndị na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta. “Otú ọ dị, olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ? Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’ebe onye ha na-anụbeghị banyere ya nọ?” (Rom 10:13, 14) Ọtụtụ ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” bi ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi. (Ọrụ 13:48) Ọ bụrụ na anyị adị akọ ma nwee ezi uche, anyị nwere ike izi ha ozi ọma.