Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 2 p. 11-13
  • Olee Ihe Ndị Alaeze Chineke Ga-eme?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ihe Ndị Alaeze Chineke Ga-eme?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE ALAEZE CHINEKE MERELA
  • OLEE IHE ALAEZE CHINEKE GA-EME?
  • IHE ALAEZE CHINEKE GA-EMERE ỤMỤ MMADỤ
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Alaeze “nke A Gaghị Emebi Emebi”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 2 p. 11-13
Ebe mmiri na-asọda. Ugwu ndị snoo kpuchiri elu ha na oké ọhịa gbara mmiri a gburugburu.

Olee Ihe Ndị Alaeze Chineke Ga-eme?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Ọ ma na ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme n’ụwa taa abụghị uche Chineke, nakwa na ọ bụ naanị Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-ewepụli ihe ọjọọ ndị ahụ. Olee ihe ndị Alaeze Chineke ga-eme?

IHE ALAEZE CHINEKE MERELA

N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru banyere ihe ndị Jizọs kwuru a ga-eji amata na Alaeze Chineke adịla nso. Ha bụ ihe ndị a na-ahụ anya na-egosi na Alaeze Chineke, nke Jizọs Kraịst bụ Eze ya, amalitela ịchị n’eluigwe.

Baịbụl kwuru na Jizọs malite ịchị n’eluigwe, ọ ga-achụpụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. Ugbu a, ọ bụzi n’ụwa ka ha nọ, o sokwa n’ihe mere nsogbu ji jupụta n’ụwa kemgbe afọ 1914.​—Mkpughe 12:7, 9.

N’agbanyeghị na ihe na-aka njọ n’ụwa kwa ụbọchị, Jizọs, bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, na-eme ọtụtụ ihe iji nyere ndị mmadụ aka n’ụwa niile. Ọrụ ịkụzi Baịbụl a na-arụ n’ụwa niile, nke Jizọs kwuru na a ga-arụ, emeela ka ọtụtụ ndị mụta ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya. (Aịzaya 2:2-4) Ọtụtụ nde mmadụ anaghịzi ekwe ka akụnụba, ego na ọrụ ha ji akpa afọ ha bụrụ ihe kacha ha mkpa ná ndụ. Ha amụtala ihe ga-enyere ha aka ịna-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha, mụtakwa otú ha ga-esi baara onwe ha uru. Ha aghọọla ụdị ndị Chineke chọrọ ka ha biri n’Alaeze ya.

OLEE IHE ALAEZE CHINEKE GA-EME?

N’agbanyeghị na Jizọs amalitela ịchị n’eluigwe, ọ ka bụ ụmụ mmadụ na-achị ụwa. Ma, Chineke agwala Jizọs, sị: “Gaa meriwe n’etiti ndị iro gị.” (Abụ Ọma 110:2) N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-ebibi ndị iro ya niile ma mee ka ndị na-efe Chineke kuru ume ndụ.

N’oge ahụ, Alaeze Chineke

  • Ga-ebibi okpukpe ụgha. A ga-ebibi okpukpe niile na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Chineke ma na-eme ka ihe na-esiri ndị mmadụ ike. Baịbụl kpọrọ okpukpe ụgha ndị a nwaanyị akwụna. Mbibi ya ga-atụ ọtụtụ ndị n’anya.​—Mkpughe 17:15, 16.

  • Ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ. Alaeze Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ.​—Mkpughe 19:15, 17, 18.

  • Ga-ebibi ndị ọjọọ. Olee maka ndị kpọrọ ekwe nkụ na-eme ihe ọjọọ ma jụ irubere Chineke isi? “A ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa.”​—Ilu 2:22.

  • Ga-ebibi Setan na ndị mmụọ ọjọọ. Alaeze Chineke ga-eme ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ “ghara iduhie mba niile ọzọ.”​—Mkpughe 20:3, 10.

Olee uru ihe a niile ga-abara ndị nabatara Alaeze Chineke?

IHE ALAEZE CHINEKE GA-EMERE ỤMỤ MMADỤ

Ihe Jizọs ga-emere ụmụ mmadụ ga-akarị ihe ọ bụla onye ọchịchị bụ́ mmadụ nwere ike ime. Otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na puku anọ (144,000) ndị si n’ụwa gaa eluigwe ga-eso ya chịa. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3) Jizọs ga-eme ka uche Chineke mezuo n’ụwa. Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ndị bi n’ụwa?

  • Ọ ga-ewepụ ọnwụ na ọrịa. “O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ‘Ahụ́ adịghị m.’” “Ọnwụ agaghịzi adị.”​—Aịzaya 33:24; Mkpughe 21:4.

  • Ọ ga-eme ka e nwee ezigbo udo na obi iru ala. “Ụmụ gị ga-anọkwa nnọọ n’udo.” “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.”​—Aịzaya 54:13; Maịka 4:4.

  • Ọ ga-eme ka e nwee ezigbo ọrụ. “Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju. Ha agaghị arụsi ọrụ ike na nkịtị.”​—Aịzaya 65:22, 23.

  • Ọ ga-eme ka ụwa maa mma. “Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”​—Aịzaya 35:1.

  • Ọ ga-akụziri ndị mmadụ ihe ha ga na-eme iji dịrị ndụ ebighị ebi. “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ha ga-amata gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”​—Jọn 17:3.

Chineke chọrọ ka ngọzi ndị a niile bụrụ nke anyị. (Aịzaya 48:18) Isiokwu na-eso nke a ga-agwa gị ihe ị ga-eme ugbu a ka i nwee ike iketa Alaeze Chineke.

Alaeze Chineke ga-edozi nsogbu niile ọchịchị ụmụ mmadụ kpatarala kemgbe ọtụtụ puku afọ. Ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ nwee

  • Ebe di na nwunye na-agba ọsọ n’ebe osisi juru.

    EZIGBO AHỤ́ IKE

  • Ebe otu ezinụlọ na-atụrụ ndụ n’ogige ebe a na-atụrụ ndụ, papa ha ana-akpọ ụbọ.

    UDO NA OBI IRU ALA

  • Ebe di na nwunye na-arụ ọrụ n’ugbo ha.

    EZIGBO ỌRỤ

  • Ebe mmiri na-asọda. Ugwu ndị snoo kpuchiri elu ha na oké ọhịa gbara mmiri a gburugburu.

    EBE OBIBI DỊ ỌCHA

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya