Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche January 1
“Ì chere na otú ụmụ mmadụ si emebisị ụwa na-ewute Chineke? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Mkpughe 11:18.] Isiokwu a gosiri ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere anyị ga-eji nwee olileanya na ọnọdụ ụwa ga-aka mma n’ọdịnihu.” Gosi ya isiokwu nke malitere na peeji nke 18.
Teta! January–March
“Ọtụtụ ndị na-asọpụrụ Jizọs n’oge a n’afọ. Ka m gụọrọ gị amaokwu Baịbụl a, gị agwazie m otú i chere kasị mma isi sọpụrụ ya. [Gụọ Jọn 14:15. Chere ka ọ zaa.] Ọ dịghị onye maara kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jizọs, o nwekwara ike iju gị anya ma ị mata ihe mere e ji malite ịgba Krismas na December 25.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 12.
Ụlọ Nche February 1
“Ì chere na Chineke na-anabata okpukpe niile? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Jizọs kwuru ebe a. [Gụọ Matiu 15:8, 9.] Isiokwu a ga-agwa gị ma Chineke ọ̀ na-anabata ụdị ofufe niile.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 9.
Teta! January–March
“Ọ na-abụ ọtụtụ ndị nwewe nsogbu, ha echee na ọ bụ Chineke na-ata ha ahụhụ. Ì chetụla otú ahụ? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Jems 1:13.] Isiokwu a kọwara ebe nsogbu anyị niile si na ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ha ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 14.