Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/09 p. 1
  • Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Dịghị Ahapụ Izisa Ozi Ọma Ahapụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ihe Mere Anyị Ji Agaghachi Ugboro Ugboro
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Na-ekwusa Ozi Ọma n’Akwụsịghị Akwụsị
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • “Na-eche Ozi ahụ Ị Nabatara n’Ime Onyenwe Anyị Nche”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 1/09 p. 1

Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?

1. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ikwusa ozi ọma na-esi ike, oleekwa ihe mere anyị ji anọgide na-arụ ya?

1 Ka ụbọchị Jehova na-eru nso n’ike n’ike, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị nyere ọtụtụ mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya maka ụmụ mmadụ. (Jọn 17:3; 2 Pita 3:9, 10) Nke a nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị anaghị enwe mmasị n’ozi anyị, e nwekwara ndị na-akwa anyị emo n’ihi ọrụ nkwusa anyị na-arụ. (2 Pita 3:3, 4) N’agbanyeghị ihe ndị a, anyị nwere ihe ndị mere anyị ji kwere na a ka nwere ndị nọ n’ókèala anyị ga-anabata ozi ọma ahụ ozugbo ha nụrụ ya. Olee otú ndị dị otú ahụ ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-ekwusara ha?—Rom 10:14, 15.

2. Olee otú ihe nlereanya Pọl si agba anyị ume?

2 Idi Mmegide: Ebe ọ bụ na e nwere ndị chọrọ ịnụ ozi Alaeze ahụ, anyị ekwesịghị ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Filipaị bụ obodo mbụ Pọl onyeozi kwusara ozi ọma na ya na Yurop. Mgbe e boro ya na Saịlas ebubo ụgha, a pịara ha abụọ ụtarị ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 16:16-24) Ma, ihe ahụ e mere Pọl emeghị ka egwu jide ya, ya akwụsị ikwusa ozi ọma. Mgbe ọ gara Tesalonaịka, bụ́ obodo ọzọ o kwusara ozi na ya mgbe ọ hapụrụ Filipaị, o ‘nwere nkwuwa okwu site n’enyemaka Chineke.’ (1 Tesa. 2:2) Ihe nlereanya Pọl ọ́ naghị egosi anyị ihe mere anyị na-agaghị eji ‘daa mbà’?—Gal. 6:9.

3. Olee ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị malite ige anyị ntị n’agbanyeghị na ha enwebughị mmasị?

3 Ọtụtụ ndị na-anabughị ege anyị ntị amalitela ige anyị ntị. O nwere ike ịbụ ihe isi ike ndị bịaara ha, ọrịa, ọnwụ nke onye ezinụlọ ha, ma ọ bụ akụkọ banyere ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa mere ha ji malite ige anyị ntị. (1 Kọr. 7:31) Ụfọdụ ụmụaka ndị nne na nna ha na-anaghị anabata ozi ọma etoola ugbu a ma chọọ ige anyị ntị. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, ọ ga-enye ndị dị otú ahụ ohere ‘ịkpọku aha Jehova’ tupu oge agafee.—Rom 10:13.

4. Olee ihe na-eme ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma “n’akwụsịghị akwụsị”?

4 “N’akwụsịghị Akwụsị”: Ịhụnanya anyị nwere maka Chineke na ndị agbata obi anyị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma “n’akwụsịghị akwụsị,” na-enyekwara ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, dị nnọọ ka ndịozi mere na narị afọ mbụ. (Ọrụ 5:42) Ọtụtụ ndị taa “na-eze ume ma na-asụ ude n’ihi ihe arụ niile” na-eme ugbu a. (Ezik. 9:4) Ndị dị otú ahụ na-enwe nnọọ olileanya na ahụ́ iru ala mgbe ha nụrụ ozi ọma ahụ! Ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị ekweghị ege anyị ntị, Akwụkwọ Nsọ na-eme ka obi sie anyị ike na mbọ anyị na-agba dị nnọọ Jehova mma n’obi.—Hib. 13:15, 16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya