Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
October 1
“Ọtụtụ ndị taa enwekwaghị okwukwe n’Onye Okike. Gịnị ka i chere kpatara ya? [Chere ka ọ zaa.] Ebe a m chọrọ ịgụrụ gị na Baịbụl kwuru otu ihe nwere ike ịkpata ya. [Gụọ Habakọk 1:2, 3.] Isiokwu a zara ụfọdụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị banyere Chineke bụ́ nke mere ha ji kwụsị inwe okwukwe na Chineke.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 11.
October–December
“Ọnwụ nne ma ọ bụ nna so n’ihe ndị na-akacha ewute mmadụ ná ndụ. Í cheghị otú ahụ? [Chere ka ọ zaa.] Amaokwu Baịbụl ndị dị ka nke a akasiela ọtụtụ ndị obi. [Gụọ Mkpughe 21:4.] Isiokwu a kọwara otú mmadụ, karịchaa onye na-eto eto, ga-esi die ọnwụ nne ya ma ọ bụ nna ya.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
November 1
“Ì chere na ihe niile a na-akụzi na chọọchị si na Baịbụl? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl gwara anyị ka anyị kpachara anya ka a ghara iji ozizi ụgha duhie anyị. [Gụọ Ndị Kọlọsi 2:8.] Magazin a kọwara ozizi isii a na-akụzi kemgbe ụwa, bụ́ ndị na-esighị n’Okwu Chineke.”
October–December
“Ì chere na nsogbu ndị na-eto eto na-enwe taa karịrị nke ndị oge mbụ? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ ndị kwetara na amaokwu Baịbụl a kọwara oge anyị a nke ọma. [Gụọ 2 Timoti 3:1.] Magazin a kọwara ụfọdụ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ndị nne na nna na ndị na-eto eto aka idi nsogbu ndị ha na-enwe n’oge a.”