Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/10 p. 1
  • Èruru M Eru Ikwusa Ozi Ọma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Èruru M Eru Ikwusa Ozi Ọma?
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Ruru Eru Ime Nkwusa?
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ndị A Kwadebere n’Ụzọ Zuru Ezu Dị Ka Ndị Na-ezi Okwu Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ị̀ Ghọtara Ihe Mere I Ji Kwesị Ịna-azụ Ndị Ọzọ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 1/10 p. 1

Èruru M Eru Ikwusa Ozi Ọma?

1. Gịnị mere anyị ekwesịghị iche na anyị erughị eru ikwusa ozi ọma?

1 Ọ bụrụ na e nweela mgbe ị jụrụ onwe gị ụdị ajụjụ a, ụjọ atụla gị! Ihe mere anyị ji ruo eru ịbụ ndị na-ekwusa ozi ọma abụghị n’ihi na anyị gụrụ oké akwụkwọ ma ọ bụ n’ihi na ụbụrụ anyị na-aghọ nkọ. A kpọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na narị afọ mbụ ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” N’agbanyeghị nke ahụ, ha maara otú e si ekwusa ozi ọma nke ọma n’ihi na ha gbalịsiri ike iso ihe nlereanya Jizọs.—Ọrụ 4:13; 1 Pita 2:21.

2. Olee otú Jizọs si kụzie ihe?

2 Otú Jizọs Si Kụzie Ihe: Jizọs kụziri ihe otú doro anya ma dị mfe nghọta, ihe ndị ọ kụziri agbagwojughịkwa ndị mmadụ anya. Otú o si ajụ ajụjụ, ihe atụ ndị ọ na-enye, na otú o si amalite okwu ya na-eme ka ndị na-ege ya ntị nwee mmasị n’ihe ọ na-akụziri ha. (Mat. 6:26) O nwere ezigbo mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. (Mat. 14:14) Ihe ọzọkwa bụ na Jizọs ji obi ike kwuo okwu, o kwukwara ya ka onye nwere ikike n’ihi na ọ maara na ọ bụ Jehova zitere ya ma nye ya ike ịrụ ọrụ.—Luk 4:18.

3. Olee otú Jehova si enyere anyị aka n’ozi anyị?

3 Jehova Na-enyere Anyị Aka: Onye Nkụzi Ukwu anyị na-esi n’Okwu ya na nzukọ ya na-azụ anyị, ka anyị nwee ike ikwusa ozi ọma nke ọma. (Aịza. 54:13) Ebe ọ bụ na Jehova mere ka e detuo otú Jizọs si kụzie ihe, anyị na-agụ ya ma na-eṅomi ya. Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ ya, ọ na-esikwa n’ọmụmụ ihe ọgbakọ ndị anyị na-enwe na-azụ anyị. (Jọn 14:26) Ọ na-ejikwa ndị nkwusa maara nke a na-akọ enyere anyị aka izi ihe nke ọma.

4. Gịnị mere na o nweghị ihe kwesịrị ime ka anyị chewe na anyị erughị eru izi ndị ọzọ ozi ọma?

4 Ebe ọ bụ “Chineke na-eme ka anyị ruo eru nke ọma,” o nweghị ihe ọ bụla kwesịrị ime ka anyị chewe na anyị erughị eru ikwusa ozi ọma. (2 Kọr. 3:5) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ma na-eji ihe ndị o ji ịhụnanya na-enye anyị kpọrọ ihe, anyị ‘ga-eru eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.’—2 Tim. 3:17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya