Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/10 p. 1
  • ‘Atụla Ụjọ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Atụla Ụjọ’
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Otú Ịhụ Chineke n’Anya Si Eme Ka Anyị Kwụsị Ịtụ Ụjọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Jehova Ga-enye Gị Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 10/10 p. 1

‘Atụla Ụjọ’

1. Olee ụjọ ụfọdụ n’ime anyị na-atụ taa nke yiri nke Jeremaya?

1 Mgbe a gwara Jeremaya na ọ ga-abụ onye amụma, ọ dị ya ka ya erughị eru ịrụ ọrụ ahụ. Ma Jehova mere ka obi sie ya ike. Ọ gwara ya, sị: ‘Atụla ụjọ.’ O jikwa obiọma gbaa ya ume ịrụ ọrụ ahụ. (Jere. 1:6-10) N’oge anyị a, ihere ma ọ bụ ụjọ nwere ike ime ka anyị ghara ịgachi ozi ọma anya. Ụjọ na ndị mmadụ agaghị ege anyị ntị ma ọ bụ maka otú ha ga-esi ele anyị anya nwere ike ime ka anyị ghara izi ha ozi ọma mgbe ụfọdụ. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụdị ụjọ a, oleekwa ngọzi ndị anyị ga-enweta ma anyị kwụsị ịtụ ụjọ?

2. Olee otú ịkwadebe nke ọma ga-esi nyere anyị aka ịkwụsịlata ụjọ izi ozi ọma?

2 Kwadebe Akwadebe: Ịkwadebe nke ọma ga-enyere anyị aka ịkwụsịlata ụjọ na-atụ anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chọpụta ihe ndị na-achọghị ige anyị ntị nwere ike ikwu, ọ ga-adịrị anyị mfe ịma ihe anyị ga-aza ha. (Ilu 15:28) Ọ́ gaghị adị mma ma unu jiri oge unu ji enwe Ofufe Ezinụlọ kwadebe otú e nwere ike isi merie nsogbu ndị a na-enwe n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ozi ọma?—1 Pita 3:15.

3. Olee otú ịtụkwasị Jehova obi ga-esi enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?

3 Tụkwasị Jehova Obi: Ihe na-ewepụ mmadụ ụjọ n’ahụ́ bụ ịtụkwasị Chineke anyị obi. Jehova kwere nkwa na ya ga-enyere anyị aka. (Aịza. 41:10-13) Ò nwere ihe ga-eme ka obi sie mmadụ ike karịa nke a? Ihe ọzọ bụ na Jizọs mere ka obi sie anyị ike na e nwegodị ihe anyị na-atụghị anya ya merenụ, mmụọ nsọ Chineke ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-ekwu. (Mak 13:11) N’ihi ya, na-arịọ Jehova mgbe niile ka o nye gị mmụọ nsọ ya.—Luk 11:13.

4. Olee ngọzi ndị anyị ga-enwe ma anyị nọgidesie ike n’ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe?

4 Ngọzi Ndị Ị Ga-enweta: Ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike n’ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe, obi na-akakwu anyị idi ọnwụnwa ndị ọzọ ga-abịara anyị. Anyị na-amụta inwe obi ike na ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu, nke bụ́ àgwà ndị na-egosi na anyị jupụtara na mmụọ nsọ. (Ọrụ 4:31) Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na Jehova enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ, okwukwe anyị ga-esikwu ike, obi ga-esikwukwa anyị ike na Jehova ga-eji ogwe aka ya zọpụta anyị. (Aịza. 33:2) Anyị ga-enwekwa obi ụtọ na obi iru ala n’ihi na anyị maara na anyị na-eme ihe na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. (1 Pita 4:13, 14) N’ihi ya, ka anyị kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’atụghị ụjọ, ka obi siekwa anyị ike mgbe niile na Jehova ga-enyere anyị aka!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya