Ekpere na Ịtụgharị Uche—Ihe Ndị Dị Mkpa Ka Ndị Ozi Na-anụ Ọkụ n’Obi Na-eme
1. Gịnị nyeere Jizọs aka ilekwasị anya n’ọrụ kacha mkpa mere o ji bịa n’ụwa?
1 E nwere otu ụbọchị Jizọs ji mgbede niile gwọọ ndị ọrịa ma chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Mgbe chi bọrọ, ndị na-eso ụzọ ya chọwara ya ma chọta ya. Ebe ọ bụkwa na ha chọrọ ka ọ maliteghachi ịrụ ọrụ ebube, ha gwara ya, sị: “Mmadụ niile na-achọgharị gị.” Ma, Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka uche ya pụọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma, bụ́ ọrụ kacha mkpa ọ bịara ịrụ. Ọ gwara ha, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo nta ndị dị nso, ka m wee kwusaakwa ozi ọma n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.” Gịnị nyeere Jizọs aka ilekwasị anya n’ozi ya? Ihe nyeere ya aka bụ na o biliri n’isi ụtụtụ gaa kpee ekpere ma tụgharịa uche. (Mak 1:32-39) Olee otú ikpe ekpere na ịtụgharị uche ga-esi enyekwara anyị aka ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ọma?
2. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịtụgharị uche na ha bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịna-anụ ọkụ n’obi n’ozi anyị?
2 Gịnị Ka Anyị Ga-atụgharị Uche na Ya? Jizọs chọpụtara na ‘a gbara ndị mmadụ akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (Mat. 9:36) Anyịnwa kwesịkwara ichebara otú ozi ọma si dị ụmụ mmadụ mkpa ezigbo echiche. Anyị nwere ike ịtụgharị uche n’otú oge fọdụrụ si dị ntakịrị. (1 Kọr. 7:29) Ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ichebara echiche bụ ihe ndị Jehova kere eke, àgwà ọma ndị o nwere, ihe ùgwù anyị nwere na anyị bụ Ndịàmà Jehova, nakwa ihe ndị dị oké ọnụ ahịa anyị na-amụta n’Okwu Chineke, bụ́ nke ndị bi n’ókèala anyị na-amabeghị.—Ọma 77:11-13; Aịza. 43:10-12; Mat. 13:52.
3. Olee mgbe anyị nwere ike ịtụgharị uche?
3 Olee Mgbe Anyị Nwere Ike Ịtụgharị Uche? Ụfọdụ ndị na-eme ka Jizọs, ha na-ebili n’isi ụtụtụ mgbe ebe niile dị jụụ. Mgbe na-akara ndị ọzọ mma ịtụgharị uche bụ n’anyasị tupu ha alakwuo ụra. (Jen. 24:63) Ọ bụrụgodị na ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị karịrị akarị, anyị ka nwere ike iwepụta oge na-atụgharị uche. Ụfọdụ ndị na-eme ya mgbe ha nọ n’ụgbọ njem. Ndị ọzọ na-eji oge ha nwere ezumike ehihie atụgharị uche, n’ihi na o nweghị ihe ga-adọpụ ha uche n’oge ahụ. Ụfọdụ ndị achọpụtala na ọ bụrụgodị na ha ejiri nkeji ole na ole tụgharịa uche tupu ha agawa ozi ọma, na ọ na-enyere ha aka iji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’atụghị egwu.
4. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-atụgharị uche?
4 Ikpe ekpere na ịtụgharị uche ga-eme ka ọ na-agụkwu anyị agụụ ijere Jehova ozi, mee ka anyị were ijere Chineke ozi ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, meekwa ka anyị kpebisikwuo ike ịna-ekwusa ozi ọma. Ịtụgharị uche baara Onyeisi Ndị Ozi Chineke bụ́ Jizọs, uru. Anyị meekwa otú ahụ, ọ ga-abara anyị uru.