Na-enye Ya Ndị Mmadụ Mgbe Ọ Bụla Ọ Dabara
1. Olee ihe e nwere ike iji traktị bụ́ Ịma nke Bụ́ Eziokwu mee?
1 E biri traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? otú ọ ga-adịrị anyị mfe iji ya malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ma, anyị nwekwara ike iji ya ghaa mkpụrụ nke eziokwu Baịbụl. (Ekli. 11:6) Legodị otú i nwere ike isi jiri ya kụziere ndị mmadụ Baịbụl.
2. Olee otú anyị nwere ike isi jiri traktị ahụ malite mkparịta ụka?
2 Ịmalite Mkparịta Ụka: I nwere ike nye ya mmadụ, gosi ya ajụjụ isii e dere n’ihu ya ma jụọ onye ahụ, sị: “N’ime ajụjụ ndị a, olee nke i chebatụụrụla echiche?” Ya kwuchaa ihe o nwere ikwu, gị na ya jiri traktị ahụ leba anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara otu n’ime ajụjụ ndị o kwuru na ya echebatụrụla echiche. Gụọkwanụ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ. Gwa ya ihe e dere n’azụ traktị ahụ ma ọ bụkwanụ gị agụpụta ya. Nyezie ya akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ọ bụrụgodị na o kweghị anara ya, ọ narala traktị ahụ. Nke ahụ nwekwara ike ime ka eziokwu dị na Baịbụl gbanye mgbọrọgwụ n’obi ya.—Mat. 13:23.
3. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ji ọrụ n’aka, gịnị ka anyị nwere ike ime?
3 Mgbe Onye Nwe Ụlọ Ji Ọrụ n’Aka: I nwere ike kwuo, sị: “Ebe ọ bụ na i ji ọrụ n’aka, ka m nye gị traktị a. E nwere ajụjụ isii dị mkpa e dere na ya, ọtụtụ n’ime anyị ajụọkwala ajụjụ ndị ahụ. Traktị a kwukwara ihe Baịbụl zara n’ajụjụ nke ọ bụla. Ụbọchị ọzọ mụ na gị ga-ahụ, m ga-achọ ịma ma è nwere ihe gbagwojuru gị anya n’ihe e kwuru na ya.”
4. Olee otú anyị nwere ike isi nye mmadụ traktị a mgbe anyị na-agba àmà n’okporo ámá?
4 Mgbe Ị Na-agba Àmà n’Okporo Ámá: I nwere ike ịsị: “Ndeewo. Ò nwetụla mgbe ị jụrụ otu n’ime ajụjụ ndị a? [Gosi ya traktị ahụ ma chere ka ọ zaa.] Traktị a kwuru ihe Baịbụl zara n’ajụjụ nke ọ bụla. Ihe o kwuru doro anya, ọ ga-amasịkwa gị.” Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ahụ ngwa ngwa, gị na ya nwere ike tụlee ebe a zara otu n’ime ajụjụ ahụ. I nwekwara ike nye ya akwụkwọ Bible Na-akụzi.
5. Olee ihe anyị nwere ike ime mgbe ụfọdụ ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ anọghị ya?
5 Ndị Na-anọghị n’Ụlọ: N’ókèala ụfọdụ, ndị nkwusa na-edewere onye na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ anyị ebe ndị na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya. Ọ bụrụ otú unu na-eme n’ọgbakọ unu, í cheghị na ọ ga-adị mma mgbe ụfọdụ ma i dewere mmadụ traktị Ịma nke Bụ́ Eziokwu? I mechaa gaghachi n’ụlọ ahụ, i nwere ike gwa onye nwe ụlọ, sị: “Anyị abịabuola n’ụlọ gị ma ị nọghị ya. Ọ bụ ya mere anyị ji fanyere gị traktị a n’ọnụ ụzọ gị. N’ajụjụ ndị a niile dị ebe a, olee nke ị ga-achọ ka anyị leba anya na ya?”
6. Olee ihe mere o ji dị mma iji Ịma nke Bụ́ Eziokwu ezi ozi ọma?
6 Traktị Ịma nke Bụ́ Eziokwu kọwara eziokwu ndị dị na Baịbụl otú ọ ga-adị mfe nghọta. O nweghị onye na-anaghị enwe mmasị na traktị a, n’agbanyeghị okpukpe onye ahụ na-ekpe ma ọ bụ omenala obodo ha. Ọ bụghị ihe mmadụ ga-akụwasịwara isi tupu ọ mara otú ọ ga-esi nye ya mmadụ. Ma nwata ma onye ka malitere ikwusa ozi ọma ọhụrụ ga-enyeli ya mmadụ. Ị̀ na-agbalị inye ya ndị mmadụ mgbe ọ bụla ọ dabara?